Spacex moon mission: Nwaafọ Naijiria esonyela na mmadụ asatọ mbụ n'ụwa ga-aga n'ọnwa

Ebe foto si, Dear Moon
Nwa afọ Naijiria esonyela na ndị nkịtị asatọ mbụ ga-eme njem n'ọnwa a kpọrọ, "SpaceX moon flight", n'afọ 2023.
Yemi Akinyemi Dele, a ma dịka Yemi A. D, onye gbara afọ 41, nke nna ya bụ onye Naijiria, nne ya onye Czechoslovakia bụ bụ onye nwe ụlọọrụ "JAD Productions" nke bụ ụlọọrụ na-ahazi egwu nakwa ihe nka ndị ọzọ.
Yemi gbagbara ama n' akara ọbaozi ya 'Linkedin' ya n'ụtụtụ Fraide kwuru na "o nweghị akụkọ ọma merela na ndụ ya karịrị nke a".

Ebe foto si, YYemi AD/Linkedin

Ebe foto si, SpaceX
N'ụtụtụ taa ọgaranya na onye ojiegoachụego mba Japan bụ Yusaku Maezawa bụ onye hiwere njem SpaceX kpọpụtara mmadụ asatọ ga-eso ya mee njem abalị asatọ n'ọnwa n'ọnwa Maachị afọ na-abịa.
Ndị ọzọ ga-eso mee njem ahụ gụnyere Steve Aoki bụ ọgwakọ egwu, onye na-egosi ihe onyonyo njem na Youtube a kpọrọ 'Everyday Astronaut" na
Rhiannon Adam bu osee foto.
Ndị ọzọ bụ Karim Illiya, osee foto mabụrụkwa onye na-eme ihe onyonyo; Brendan Hall ,omee ihe onyonyo na Dev Joshi bụ onye ihe ejije.
Ọ bụrụ na njem ahụ nwe isii, ọ ga-abụ mbụ mmadụ na-aga n'ọnwa kemgbe afọ 1972.
Ngalaba na-ahazi njem nke mba Amerịka enyebeghị ụlọọrụ Elon Musk nwe SpaceX ikike ife, gaa ya bụ njem.
Ụgbọaha ga-eji mee njem ahụ ka kwụ na Texas dị na Amerịka kemgbe ọnwa 18 dịka o nwetabeghị ikike ife gharịa okiriki ụwa ka o mechara njem nwalee n'ọnwa Mee afọ 2022.
Mana Maezawa ekwteghị maka ogbochi ahụ oge ọ mara ọkwa ndị ya na ya ga-eso gaa njem ahụ ọ kpọrọ "DearMoon" n'ihe onyonyo o wepụtara taa bụ abalị itoolu nke ọnwa Disemba afọ 2022.
Etu e siri họta ndị ga-eme njem ahụ
N'afọ 2018, Maezawa mara ọkwa na ya ga-akpọ ndị na-eme ihe nta gaa njem n'ọnwa.
N'afọ 2021, ọ gbanwere "ndị ihe nka" ma kwuo na ha gụnyere ndị mmadụ nile n'ọ na mpaghara ụwa dị iche na-eme ihe pụrụ iche.
Dịka websait atụmatụ 'Dear Moon siri kwuo, ndị ọ ga-akpọ gaa njem a n'efu gụnyere , ndị tinyere akwụkwọ maka ya bụ ndị na-atụ anya "eme ihe pụrụ iche n'ọrụ ha , inyere ndị ọzọ aka nakwa nd ị dị njikere inyere ndị ha na ha ga-eso aga ya bụ njem aka.
Maezawa ekwughị ego ole njem a ga-eri ya.
Ihe i kwesịrị ịma maka ndị na-eme njem a
Kemgbe a kpọpụtara aha ndị ga-eso Maezawa gaa n'ọnwa n'efu, obi na-atọ ha nile ka nnu.
Lee ihe ụfọdụ ha na-eme ntupu nke a eme e.
Yemi A. D

Ebe foto si, Dear Moon
A mụrụ Akinyemi Dele na Liberec dị na mba Czechoslovakia(Czcheh).
Nna ya bụ ... gara ịgụ akwụkwọ na mahadum "University of Economics" dị na Prague, isiobodo Czechoslovakia bụ ebe o zutere nne Yemi.
Yemi na-ahazi ịgba egwu nke Bekee kpọrọ 'choreography.'
Choi Seung

Ebe foto si, Dear Moon
Choi Seung gbara afọ 35 bụ onye ihe ejije mba South Korea. a ma ama dịka "TOP".
Ọ na-eti egwu ma na-edekwa ede.
Ọ bụ ya bụ ọgụ ngwangwa(rapper) n'egwu otu egwu ụmụnwoke a kpọrọ 'Big Bang' tipụtara n'afọ 2006
Ọ pụtara na ihe ejije TV mbụ ya nke a kpọrọ "I am Sam" n'afọ 2007.
O ritela nturuugo dị iche iche n'Asia gụnyere nke ọkaibe n'ime ejije nke Blue Dragon Film Awards n' afọ 2010.
Steve Aoki

Ebe foto si, Dear Moon
Steve Aoki bụ onye na-agwọkọ egwu nke Bekee kpọrọ "disk jockey" a ma ama na mba Amerika nakwa onye ọrụ ebere.
A ma ya dịka onye egwu ya so na ndị a kachasị akpọ na mba ahụ.
O so na ndị a kpọnyeburu na ndị ga-erite nturuugo Grammy ugboro abụọ.











