E boola onye nwe ụlọakwụkwọ ebubo idina nwataakwụkwọ dị afọ 14 n’ike

Foto na-egosi ụmụakwụkwọ nwaanyị
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Obere nwata nwaanyị dị afọ iri na anọ (14) eboola Ebere Francis nwe ụlọakwụkwọ Royal Experience School ebubo idina ya n’ike.

Nwatakịrị ahụ kwuru na Ebere Francis wakporo ya n’ụlọakwụkwọ ahụ dị n’Ohuru, Okpuruochichi Obingwa dị n’Abia steeti.

Mgbe nwatakịrị ahụ e zoro aha ya ugbua na-akọwa ka ihe ahụ niile siri bido, ka o kwuru na “oge anyị kpechara ekpere ụtụtụ, anọ m na klaasị na-agụ akwụkwọ tupu onye nwe ụlọakwụkwọ anyị bụ Ebere Francis abata”.

“Oge ọ bachaara ndị klaasị anyị mba maka mkpọtụ ha na-eme, ọ gwara m soro ya banye n’ime ụlọọrụ ya”.

Ọ sịrị na oge ha banyere n’ime ụlọọrụ Ebere Francis, ọ kpọchiri ụzọ ya, dọrọ ya n’ike ma malite ichikọrịta ya ahụ.

“Agbara m mbọ ka m gbapụ n’ụlọorụ ya mana ọ kpọchiela ụzọ. O jiiri ohere ahụ yituo uwe ‘knicker’ m. Nke ahụ agwụla ihe m nwereike icheta”.

“Oge ọzọ m matara ihe na-eme bụ mgbe m hụrụ ya ka o ji akwụkwọ ehicha m ahụ”.

“Anapụrụ m ya akwụkwọ ahụ n’ike, gbapụ n’ezi ma gakwuru otu onye nkụzi m ma gosi ya akwụkwọ ahụ”.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ajụrụ m ya gbasara ọbara dị n’akwụkwọ ahụ, ọ sị na nke ahụ nwereike ị bụ nsọ m mana agwara m ya na ọ bụghị,” ka nwataakwụkwọ ahụ kwuru.

Ọ sị na ya kọọrọ onyenkụzi ahụ ihe mere ya dịka o nyere ya ego ka ọ gaa kọsara nwunye onyeisi ụlọakwụkwọ ha ihe di ya mere ya.

O kwuru na dịka ọ na-aga, ọ chọpụtara na Ebere Francis ji igwe na-achụ ya, bụ nke mere o ji gbaba n’otu mbaraezi nọ nso ma kọsaara ndị bi ebe ahụ.

Nna nwataakwụkwọ ahụ kwuru na ya agaala nye mkpesa n’ụlọọrụ ndị uweojii Eastern Ngwa Police Divisional Headquarters kemgbe njinji ahụ jichara n’ụbọchị Wenezde 6 Nọvemba 2024.

Oge onye ntaakụkọ anyị mere nyocha, ọ chọpụtara na e nyefeela okwu ahụ n’ụlọọrụ ndị uweojii Aba Area Command.

Oge a kpọrọ ya n’ekwentị, Ebere Francis gọrọ aka na ụkwụ ya na enweghị oge ọbụla o dinara nwata ahụ n’ike.

Mana ka osinadị, ndị ntorobịa Ohuru ewerela ọmụ nkwụ machie ihu ụlọakwụkwọ ahụ kemgbe ya bụ njinji jichara.

Otu onye ọrụ ndị uweojii gwara BBC na okwu ahụ dị n'ụlọorụ ha nakwa nwoke e boro ebubo nakwa ezinaụlọ nwata ahụ ga-abịa ịza ajụjụ ọnụ n'ụbọchị Tọzde.