Ihe i kwesiri ịma maka Ayo Adebanjo okeosisi dara oge ọ gbara afọ 96

Ayo Adebanjo
Nkọwa foto, Ayo Adebanjo
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Otu nwoke bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị a maama na Naịjirịa bụ Ayo Adebanjo nwụrụ n'abali iri na anọ nke ọnwa Febụwarị n'afọ 2025. Ayo Adebanjo nwụrụ mgbe ọ gbara afọ 96.

N'akwụkwọ ozi ezinaụlọ Ayo Adebanjo zipụtara ka ha kọwara ya dịka onye ndu n'otu jịkọrọ ndị Yoruba a na-akpọ Afenifere.

Tupuu ọnwụọ, Adebanjo so na ndị a na-anụ onu ha na Naịjirịa na-akwado ọchịchị onye kwuo uche ya.

Ndekọ maka Ayo Adebanjo

  • A mụrụ Ayo Adebanjo n'obodo a na-akpọ Isanya Ogbo dị n'ime obodo Ijebu Ode, n'Ogun Steeti, Naịjirịa
  • A mụrụ ya n'ọnwa Epril, abalị ire n'afọ 1928
  • Adebanjo bidoro ịzọ ọkwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'afọ 1943 dịka onye na-eso Dọkịnta Nnamdi Azikiwe.
  • O sonyere otu ndọrọndọrọ ọchọchị Action Group n'afọ 1951.
  • Dịka onyeisi n'otu Afenifere, o mechere bụrụkwa onye Obafemi Awolowo zụrụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
  • Adebanjo bụ onye ntaakụkọ tupuu ọ gaa gụọ akwụkwọ dịka ọkaiwu n'United Kingdom nwere bụrụ ọkaiwu n'afọ 1961.

Nkwado Ayo Adebanjo nyere Peter Obi na 2023

Ayo Adebanjo so na ndị kwadoro onye ji ọkọrọtọ Labour Party (LP) bụ Peter Obi nwere zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023.

Ọ ji aha ndị Afenifere ma duru ndị otu ahụ nwere dọnyere Peter Obi ukwu ịbụ onyeisiala Naịjirịa.

Ayo Adebanjo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ayo Adebanjo

Ihe e ji echeta Ayo Adebanjo

N'afọ 1962 ka Ayo Adebanjo gbagara mba Ghana mgbe gọọmentị jidere Obafemi Awolowo na mmadụ iri atọ ndị ọzọ ma kpee ha ikpe maka ebubo ịme ihe megidere iwu gọọmentị Naịjirịa.

E jidere Adebanjo ọtụtụ mgbe maka ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa ikike dịrị mmadụ.

O so na ndị na-ekwu okwu ka gọọmenti Naịjirịa hazịgharịa usoro ọchịchị ma mee ka ike gọọmentị etiti hara ịka nke gọọmentị steeti.

Ọ so na ndị na-akwado mpaghara ọchịchị nwere onwe ha ma na-ahazị akụnụba ha karịa ịnọ n'okpuru gọọmenti etiti.

Ndị ọ hapụrụ laa mmụọ gunyere nwunye ya dị afọ 94 bụ Christy Ayo-Adebanjo, ụmụaka ya, ụmụ ụmụ ya, na ụmụ ụmụ ụmụ ya.