Okwu ịkwado Peter Obi ka ọ bụ Tinubu etinyela ọgbaghara n'otu Afenifere

Pa Reuben Fasoranti, Peter Obi, na Pa Ayo Adebanjo

Okwu ma a ga-akwado onye na-efe ọkọlọtọ otu Labour Party na ntuliaka onyeisiala n'afọ 2023 bụ Peter Obi, ka ọ bụ nke otu APC bụ Bola Ahmed Tinubu, etinyela ọgbaghara n'otu jikọrọ ndị Yoroba a kpọrọ, Afenifere.

Nke a bụ dịka onye bụbu onyeisi otu ahụ bụ Pa reuben Fasoronti, mara ọkwa na ọgbakọ otu ahụ nke a na-emebu n'ụlọ Pa Ayo Adebanjo bụ onye nọ dịka onyeisi otu ahụ ugbua agaghị adịkwa etu ahụ.

Akwụkwọ 'Nation' kwuru na Fasoranti gbara ama na nsonso a na nzụkọ ahụ ga na-adịzị n'Akure, isi obodo Ondo steeti, bụ ebe o bi.

Cheta na Fasoranti rituburu n'ọkwa dịka onyeisi Afenifere n'ihi nka, ma hafee ọchịchị n'aka Adebanjo.

Nkwupụta a na-eso njem nleta nke Tinubu gara n'ụlọ Fasoranti, ebe okenye Yoroba ahụ nọ kpeere ya ekpere banyere ọkwa onyeisiala Naịjirịa ọ na-azọ.

Kemgbe Tinubu gara njem nleta ahụ, nke ọtụtụ ndị welitere isi n' Ọdịda Anyanwụ gụnyere ndị ndu si Oyo, Ogun, Ondo, Osun, Legos, Kogi, Ekiti, na Kwara, otu Afenifere na-akpọ gharaghara; onye kwuo nke a, ibe ya ekwuo ọzọ.

Peter Obi na Tinubu

Ebe foto si, Facebook

Odeakwụkwọ nchịkọta otu Afenifere bụ Abagun Kole Omololu, kwuru n'ozi o wepụtara na "ọchịchị Tinubu ga-eweta olileanya, udo, nchekwa, ịdịnotu nakwa ọrụ nye ọtụtụ ndị mmadụ."

Cheta na Adebanjo nọrọ n'ọnwa Septemba afọ 2022 kwụpụta hohaa na otu ha na-akwado Peter Obi nke Labour Party n'ihi na o si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ ebe o kwuru na ọ bụ ha kwesịrị iwepụta onyeisiala Naijiria na 2023.

Ihe Fasonranti kwuru

Pa Reuben Fasoranti

Ebe foto si, Others

Pa Fasoranti gwara ụlọntaakụkọ Impact TV na "Abụ m onye ndu otu Afenifere, enwere m ikike ikwado Tinubu."

Ọ gọkwara agụgọ na ya gbara arụkwaghị dịka onyeisi otu ahụ, ma kwukwaa na "etu e siri nabata Tinubu n'Akure gosiri na ndị mmadụ hụrụ ya n'anya."

Ihe Adebanjo gwara BBC Igbo

AYO ADEBANJO

Na mkparịtaụka Adebanjo na BBC Igbo nweburu, o kwuru na ebe ya kwụ n'okwu 2023 bụ na ndị oke ahụ ruru bụ ndị Ọwụwa Anyanwụ.

O kwuru na ya gbadoro ụkwụ na ikpenkwụmọtọ nakwa e mee nwata ka e mere ibe ya.

Pa Ayo Adebanjo kwuru sị, "A gaghị enwelata udo rue oge rue oge oke ndị Ọwụwa Anyanwu ga-eru ha."

Adebanjo kwupụtara nkwado ya na otu Afenifere nye Obi na-agbanyeghị na Tinubu bụ ọnye na-azọ ọkwa onyeisiala na n'otu ntuliaka ahụ n'aha APC bụ onye mpaghara nke ya.

Na nkata ọzọ ya na BBC Igbo nwere, Adebanjo kwuru na, "O nweghi esemokwu ọbụla mụ na Tinubu nwere, onye m mere Gọvanọ Legọs Steeti".