Aviation workers strike: Abụbụọrụ unu na-agba abaghị uru ugbua - Gọọmentị

Ndị ọrụ njem ụgbọelu na-agba abụbọ ọrụ

Ministri njem ụgbọelu akpọkuola ndị ọrụ njem ụgbọelu na-agba abụbụọrụ kamgbe ụbọchị abụọ ka ha kwụsị abụbụọrụ ahụ ma sị na “ọ baghị uru”. Ha kwuru na ha ga-eleba anya n’ihe ha chọrọ.

Odeakwụkwọ otu jikọtara ndị ọrụ njem ụgbọelu ‘Association of Nigeria Aviation Professional’ bụ Abdulrazak Saidu gwara BBC na ha na gọọmentị agaghị akpa nkata ọzọ.

“Ọ bụrụ na e meghi ihe anyị chọrọ tupu e mechie ọrụ taa, anyị ga-agbakọtama malite abụbụọrụ a maghị mgbe ọ ga-ebi”

Ndị so n’abụbụọrụ a bụ ndị si n’otu ndị ọrụ ụgbọelu ise, ha chọrọ ka e bulie ụgwọ ọnwa ha nakwa ụgwọ opekatampe ha. Ha katọkwara atụmatụ gọomentị nke chọrọ ikutu ụfọdụ ụlọọrụ ha dị na Legọs.

Otu onye maara anya ọrụ njem ụgbọelu bụ Chidozie Uzoezie kwuru na abụbụọrụ a na-emetụta njem ndị mmadụ nakwa azụmaahịa n’ebe ọ dị ukwuu.

Kamgbe ụbọchị Mọnde 17 Eprel ka ndị ọrụ njem ụgbọelu malitere ime ngagharịiwe banyere nke a n’ọdọụgbọelu dị na Legọs.

Ndị ọrụ njem ụgbọelu ebidola abụbụọrụ ịdọ aka na ntị

Ndị ọrụ njem ụgbọelu na-agba abụbọ ọrụ

Otu jịkọrọ ndị ọrụ njem ụgbọleu ebidola abụbọ ọrụ ha ga-agba ụbọchị abụọ iji dọọ gọọmentị aka na ntị maka ihe ha chọrọ maka ụgwọ ọnwa opekete mpe na ọnọdụ ọrụ ha.

Iwe ha bụ na gọọmentị Naịjirịa ekweghị ịwepụta nkwekọrịta ha nwere kamgbe afọ asaa nke gụnyere ịkwụ ndị ọrụ ngalaba Nigeria Meteorological Agency kamgbe afọ 2019.

Ndị ọrụ njem ụgbọelu

Otu ndị njem ụgbọleu a gụnyere otu Air Transport Services Senior Staff Association of Nigeria, National Association of Aircraft Pilots and Engineers, Association of Nigeria Aviation Professionals, Amalgamated Union of Public Corporations, Civil Service Technical and Recreational Services Employees.

Ọ bụ n'izuụka gara aga ka ndị isi otu ise jịkọrọ ndị ọrụ njem ụụ̀bọleu binyere aka n'akwụkwọ ma sị na ha ga-agba abụbọ ọrụ n'ụbọchị 17 nke ọnwa Aprel iji dọọ goọmentị aka na ntị maka ihe ha chọrọ.

Ndị ọrụ njem ụgbọelu na-agba abụbọ ọrụ
Ndị ọrụ njem ụgbọelu na-agba abụbọ ọrụ
Ndị ọrụ njem ụgbọelu na-agba abụbọ ọrụ