Lee ihe gbanwere n'otu afọ kemgbe Taliban weghara ọchịchị n'Afghanistan

Ebe foto si, Jack Garland
O ruola otu afọ kemgbe otu Taliban weghara ọchịchị na mba Afghanistan dịka onyeisiala mba ahụ bụ Ashraf Ghani gbapụrụ n'obodo ahụ.
Ghani na ezinaụlọ ya gbagara mba Abu Dhabi dịka o kwuru na 'Taliban emeriela".
Nke a bụ mbido mgbanwe dị icheiche site na ndị mbịarambịara nakwa ndị mba ahụ malitere ịgbaga ọdọ ụgbọelu dị na mba ahụ ma na agbapụ.
Mba dị icheiche gụnyere Briten, Amerịka nakwa Fransị malitekwara ịbupu ndị be ha nọ ebe ahụ.
Dịka taa mere ya otu afọ kpọm kwem, anyị na-eleghachi anya n'etu ihe si kwụrụ n'obodo ahụ nakwa mgbanwe dị ya.
Etu ihe si kwụrụ ugbua

Ebe foto si, Jack Garland
Nchọpụta BBC mere site n'ịgba ụmụnwaanyị bi ebe ahụ ajụjụ ọnụ gosiri na ọ b ụ ha ka ọchịchị ahụ kachasị metụta.
Otu onye achọghị ka akpọọ aha ya kọwara na achụrụ ya n'ọrụ ma sị ya gwa ndị nwoke ọ ma dịka nwanne ya nwoke maọbụ di ya bịa tinye akwụkwọ ọrụ ahụ.
"A gbara m mbọ ịnweta ọrụ m site n'agụmakwụkwọ...anyị nabata nke a, ọ pụtara na anyị arapụtala onwe anyị".
O so na ọtụtụ ụmụnwaanyị achụrụ n'ọrụ na ngwụcha ọnwa Ọgọst afọ 2021 mgbe Taliban banyechara n'ọchịchị.
N'aka nke ha, otu Taliban na-ekwu na ụmụ nwaanyị ka na-arụ ọrụ na mba ahụ mana ọ bụ karị ọrụ ahụike, ọrụ nkuzi nakwa ọrụ nchekwa ebe ụmụ nwaanyị na-anọklarị ka ha na-arụ.
Ha kwukwara na aka na-akwụ ụmụ nwaanyị ahụ ụgwọ ọrụ mana o zughizi ezu dịka ha na-erite bu mbụ.
Ihe ndị ọzọ ọchịchị ha metụtara
Agụmakwụkwọ: Akwụsịrị ụmụ nwaanyị ịgụ akwụkwọ n'ebe ahụ
Mmnwereonwe: Ha kpachịrị ikike mnwereonwe ndị mmadụ ọ kachasị ụmụnwaanyị ndị ha kwụsịrị ịme ngagharịiwe nsonso a
Okpukperechi: Ha hibere otu ọ bụ ọrụ ha ịhazi ejiji ụmụnwaanyị ma mee ka ha kpuchie ihu na isi ha.
Ọrụ: Nnyocha otu akpọrọ International Labor Organization mere gosiri na ọnụọgụgụ ụmụ nwaanyị nwere ọrụ ejirila pasentị iri na isii datuo na mba ahụ.









