Doyin Okupe, onyeisi achụmnta vootu Peter Obi agbaala arụkwaghịm

Doyin Okupe bụ onye nọ n’isi oche ọrụ achụmnta voootu Peter Obi na-azọrọ Labour pati ọkwa onyeisiala Naịjirịa 2023 agbaala arụkwaghịm n’ọrụ ya.

Nke a na-abịa dịka a mara ya ikpe n’ụbọchị Mọnde n’okwu metụtara nzufu ego.

Okupe zipụtara ozi ma kesaa akwụkwọ arụkwaghịm nke o binyere aka n’akara Twitter ya taa bụ Tuzde ma dee:

“Ihe a bụ oge ikwụpụ n’akụkụ mana a kam na-akwado Peter Obi, ndị Obidents nakwa ndị ọrụ achụmnta vootu ya ruo mgbe anyị nwetere mmeri.”

Etu okwu nrụrụaka si dasa Okupe n'isi

N'ụbọchị Monde abalị 19 nke ọnwa Disemba, ụlọikpe ukwu nke Abuja mara Okupe ikpe nke okwu ya metụtara nrụrụaka ma nye iwu ka a tụọ ya nga afọ abụọ.

Mana Okupe kwụrụ ego ịda nha si n'ikpe ahụ nke mere ọ ga-aga mkpọrọ dịka ikpe ya si kwuo.

Cheta na otu Labour Party kwuru n'ụtụtụ Tuzde a na o nwebeghi ihe ha nwere ikwu gbasara ikpe mara Doyin Okupe bụ onyeisi achụmnta vootu Peter Obi.

Ndị Kato bụ onye na-ekwuchitere otu Labour Party kwuru nke a mgbe ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka n'ekwentị.

Okwu ya na-abịa dịka kepu kepu na-efegharị ebe niile na Labour Party na-akwado ịchụtu Okupe n'ọkwa ahụ ọ nọ na ya.

O kwuru: "Onye anyị na-anọchite (bụ Okupe) họọrọ ịkwụ nha kama ịga mkpọrọ. Ka ọ dị ugbua, ọ bụ onye nweere onwe ya ma nwee ohere ịga ebe ọbụla dị ya mma maọbụ isonye n'ihe ọbụla otu ndọrọndọrọ ya na-eme," ka ọkaiwu na-anọchi anya Okupe kọwara.

Doyin Okupe agaghị mkpọrọ - Ọkaiwu ya

Doyin Okupe, onyeisi otu achụmnta vootu otu Labour Patry agaghị ụlọ mkpọrọ, ọ gaghị agakwanụ mkpọrọ, nke a bụ dịka otu n'ime ndị ọkaiwu Okupe, bụ Agụba Ndịeze si kwuo.

Agụbandịeze kwuru nke a dịka akụkọ pụtara n'ụbọchị Mọnde na ụlọikpe atụọla Doyin Okupe mkpọrọ afọ abụọ maka ịda iwu 'Money Laundering Act'.

Ọkaiwu a kọwara na Ọkaikpe Ijeoma Ojukwu onye kpebiri ikpe ahụ kwuru na Okupe nwere ohere ịkwụ nha N500,000 maka iwu nke ọbụla ọ dara.

"Onye anyị na-anọchite (bụ Okupe) họọrọ ịkwụ nha kama ịga mkpọrọ. Ka ọ dị ugbua, ọ bụ onye nweere onwe ya ma nwee ohere ịga ebe ọbụla dị ya mma maọbụ isonye n'ihe ọbụla otu ndọrọndọrọ ya na-eme," Agụbandịeze kọwara.

N'ime ebubo 59 nke EFCC boro Doyin Okupe, ụloikpe kwuru na aka ya dị ọcha malite n'ebubo nke mbụ ruo na nke 33.

Mana malite n'ebubo nke 34 ruo nke 59, ụlọikpe kwuru na Okupe dara iwu, ma tụọ ya mkpọrọ afọ abụọ maọbụ ka ọ kwụọ N500,000.

Nke a pụtara na Okupe ga-akwụ nde naịra iri na atọ maka iwu ndị ọ dara iji zeere ịga mkpọrọ.

Ihe Doyin Okupe kwuru

Dịka akụkọ a pụtara, Okupe depụtara n'akara Twitter ya sị: "Chineke abụghị mmadụ. Ndị iro gbara mbọ n'ụzọ dị icheiche mana ha dara. Mmeri bụ nke Chineke."

Etu ụlọikpe si tụọ Doyin Okupe nga afọ abụọ maka nrụrụaka

Ụlọikpe ukwu nke dị n'Abuja atụọla Doyin Okupe nga afọ abụọ dịka ikpe mara ya maka ebubo gbasara ịnata ihe ruru nde naịra narị abụọ n'aka Sambo Dasuki bụ onye ndụmọdụ obodo maka nchekwa nke bụ National Security Adviser (NSA) n'okwu bekee.

Ọkaịkpe bụ Ijeoma Ojukwu kpere ya bụ ikpe nke hiwere isi n'ikpe ngalaba na-ahụ maka nrụrụaka na Naijirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission bụ EFCC gbara n'ịsị Okupe maka ebubo ruru 59 gbasara izupụ ego ruru nde naịra narị asaa na abụọ.

Ikpe a hiwere isi n'iwu Naịjirịa nke na-ekwu na mmadụ agaghị anara ego ruru nde naịra ise maọbụ nde naịra iri ma ọ bụrụ na o sighị n'aka ụlọakụ banye onye ahụ n'aka.

Ojukwu kwuru sị, " enweghị ihe na-egosi na ego si n'ụlọakụ were fee ya n'aka".

Ọ gara n'ihu kwuo na NSA abụghị ụlọakụ, ma sịkwa na ọ bụrụ na ọ bụ onyeisiala nyere iwu ka enye ya bụ ego, na nke a apụtaghị na ọgaghị esi n'ụlọakụ fee ya n'aka.

O kwuru na nke a mere ka Okupe daa ebubo nke 34,35,36 na 59 eboro ya.

Kama Okupe kwuru na o ji ya bụ ego rụo ọrụ nke gụnyere ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ na ịhazị etu ndị mmadụ si ahụta onyeisiala Naijirịa na ọchịchị ya.

Onye bụ Doyin Okupe?

Doyin Okupe bụ dọkịnta ma bụrụkwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ọ bụ onye Ogun Steeti ma rụọkwa ọrụ dịka onye ndụmọdụ pụrụiche maka mgbasaozi oge Olusegun Obasanjo bụ onyeisiala Naijirịa.

Okupe rụkwara ọrụ dịka onye enyemaka pụriche maka mmekọ gọọmentị na ndị ọha oge Goodluck Jonathan nọ n'ọchịchị.

Ngalaba EFCC nyochara Okupe na ụlọọrụ ya maka ebubo na ọrụghị ụzọ Gọọmentị Benue Steeti nyere ya ikeke ịrụ n'afọ 2004 na nke Imo Steeti n'afọ 2005.