Onyeisiala Emmanuel Macron ahọpụtala François Bayrou dịka Praịm Minista France

François Bayrou dịka Praịm Minista

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Nke a bụ iji kwụsị ọgbaaghara ndọrọndọro malitere kemgbe ọtụtụ ọnwa na mba ahụ.

Bayrou bụ ezigbo enyi Macron bụ mayor na mpaghara southwest bụ ebe ọ nọ n'isi otu MoDem party.

Tupu o kwuputa nke a, Macron na Bayrou nwere mkparịtaụka ruru elekere abụọ.

Ọ dịziiri Macron ịgba mbọ iji hụ na Bayrou nọtere aka n'ọkwa karịa onye nyefere ya ọchịchị.

Bayrou bụ Praịm Minista nke anọ na mba Fransị n'afọ 2024.

Macron mere nkwuputa a dịka Gọọmenti mba Fransị chụpụrụ Michel Barnier dịka Praịm Minista n'ihi vootu enweghị ntụkwasịobi a tụrụ megide ya.

Naanị n'ime ọnwa atọ Onyeisiala Macron họpụtara Barnier, ndị omeiwu kwadoro atụmatụokwu megide ya.

Pati ndị na-agba gọọmenti ụkwụ wepụtara atụmatụ ahụ oge Praịm Minista ahụ bụbu onye mkparịtaụka Brexit jiiri ikikere ya pụrụ iche chọọ ịmanye ha ka anabata atụmatụ mkpata na mmefu ego ya na-enweghị ntuliaka.

Ihe a bụ nke mbụ mba ahụ na-anabata vootu enweghị ntụkwasịobi kemgbe afọ 1962.

Ihe a chọrọ bụ ka ndị omeiwu tulie aka ma ha kwere maọbụ ha ekweghị dịka ọ bụ naanị vootu narị abụọ na iri asatọ na asatọ (288) ka ha chọrọ iji nabata atụmatụ ahụ. Mana ọ bụ ndị omeiwu narị atọ na iri atọ na otu (331) nabatara atụmatụ ahụ n'ozuzuoke.

Macron agaala ọkara na njem ya dịka onyeisiala nke ugboro abụọ mana Bayrou ga-abụ Praịm Minista ya nke anọ n'afọ a.

Ndọrọndọrọ ọchịchị Fransị danyere na nsogbu kemgbe Macron kụrụ afọ n'ala n'oge ntuliaka ndị omeiwu n'oge ọkọchị.

Onye bụ François Bayrou?

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Bayrou bụbu ezigbo enyi Onyeisiala Macron tupu a họpụta Macron n'oge mbụ na ntuliaka 2017.

N'eziokwu, mkpebi Bayrou bụ ịhapụ ọnọdụ ya dịka onye na-azọ ọkwa n'afọ ahụ ma soro chụọrọ Macron nta vootu.

Onye ndọrọndọrọ ọchịchị a maara nke ọma kemgbe ihe karịrị afọ iri anọ (40), Bayrou gbara afọ iri asaa na atọ (73) sitere n'otu Modern Party nke nweterela ndị osote onyeisiala iri atọ na isii (36) kemgbe ehibere ya na 2007.

Bayrou bụ onye nkuzi asụsụ oge ọ gbara afọ iri abụọ gaburu ozi dịka minista malite n'afọ 1993 ruo 1997. Mana nke ahụ bụ ohere bara uru ikpeazụ o nwetere na gọọmenti.

N'obere oge n'afọ 2017, ọ bụụrụ ministaikpe ziri ezi Macron mana o mechara gbatuo n'ọkwa oge e bochara ya ebubo gbasara ịkwado pati ya n'ụzọ ego. Mana e mechara chọpụta na aka ya dị ọcha.

Bayrou bụ onye ụka Katolik mụrụ ụmụ isii dịka ebe a ma ya ama na ndọrọndọrọ ọchịchị bụ n'obodo Pau dị na Pyrenean ebe ọ bụurụ mayor kemgbe 2014.

Ọ na-asụ asụsụ Bearnese ma bụrụkwa onye kwenyere na nkesa ọchịchị.

Bayrou azọọla ọkwa onyeisiala ugboro atọ dịka ọ fọdụrụ obere ihe ka o nweta mmeri n'afọ 2007 oge ọ gbara onye nke atọ site n'inweta pasenti vootu iri na isii (16%).

A tụrụ anya na Bayrou ga-eweta udo n'ọnọdụ ndọrọndọrọ ọchịchị Fransị nakwa n'ụlọ omeiwu.