E bubala akpati ozu Ezenwaanyị Elizabeth II n'ime Westminster Hall ka ọha malite ile ya

Mgbe e bubatara akpatị ozu Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ n'ime Westminster Hall.

Ebe foto si, Shutterstock

Nkọwa foto, Mgbe e bubatara akpatị ozu Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ n'ime Westminster Hall.
Ọha ndị na-eche ịhụ akpatị ozu Ezenwaanyị nke abụọ na Westminster Hall

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ọha ndị na-eche ịhụ akpatị ozu Ezenwaanyị nke abụọ na Westminster Hall

Ọha ndị mmadụ amalite kemgbe elekere ise nke taa bụ Wenezde aga nwayọ nwayọ dịka ogologo ahịrị na-ebuba ha n'ime Westminster Hall bụ ebe e dobere akpatị ozu Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ taa.

Cheta na e si n’obi Eze nke Buckingham bupụ akpatị ozu Ezenwaanyị taa bụ Wenezde.

E ji inyinya buru akpatị a dịka Eze Charles nke atọ na ndị ezinaụlọ Eze nakwa ndị ọrụ nchekwa pụrụiche sonyere n’ahịrị n’azụ ndị bu akpatị a.

Puku kwuru puru ndị mmadụ bụ ụfọdụ ndị malitere ịche ịhụ akpatị a kemgbe abalị gara aga gbakọtara na-elele ka e bu akpatị na-agafee.

Dịka e bu akpatị a, gbaliri egbe elu ugboro ugboro n’akụkụ Hyde Park nakwa n’ebe ama Big Ben, nke a bụ iji kwanyere ya ugwu.

E bugara akpatị ozu Ezenwaanyị gaa Westminster Hall nke bụ ebe ọ ga-anọ ruo abalị anọ tupu e lie ya n’ụbọchị Mọnde.

Eze Charles nke atọ dịka ọ na-eso ndị bu akpatị ozu Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ aga Westminster Hall.

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Eze Charles nke atọ dịka ọ na-eso ndị bu akpatị ozu Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ aga Westminster Hall.
Ụmụ Eze William na Harry mgbe ha sonyere Eze Charles n'azụ, oge o sonyere ndị bu akpatị ozu Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ aga Westminster Hall.

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Ụmụ Eze William na Harry mgbe ha sonyere Eze Charles n'azụ, oge o sonyere ndị bu akpatị ozu Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ aga Westminster Hall.

A ga-amalite ịnabata ọha ndị mmadụ n’ebe elekere anọ nke ụbọchị Wenezde ka ha nweeike kwụrụ n’ahịa ma gafee kwanyere Ezenwaanyị ugwu nke ikpeazụ.

Dịka e bubatara akpatị ozu ya na Westminster Hall, Achịbishọpụ nke Canterbury bụ Justin Welby kaara ụka ma kpee ekpere n’isi ya ma gụọ akwụkwọ nsọ. Ndị otu egwu ụka nke ụka Angịlịkan bụkwara abụ ọma dị iche iche n’emume ụka ahụ.

Ndị sonyere n’emume ụka a bụ ezinụlọ Eze nakwa ndị ụlọomeiwu mba Briten nakwa ndọrọndọrọ ọchịchị mba ahụ nwere agba.

A ga-agbapee Westminster Hall kwa ụbọchị malite n’ụtụtụ ruo abalị kwa ụbọchị ruo ụbọchị Mọnde.

Foto na-egosi etu ahịrị ndị mmadụ na-eche ịhụ akpatị ozu Ezenwaanyị nke abụọ na Westminster Hall siri dị
Nkọwa foto, Foto na-egosi etu ahịrị ndị mmadụ na-eche ịhụ akpatị ozu Ezenwaanyị nke abụọ na Westminster Hall siri dị
Ọha ndị mmadụ kwụ n'ahịrị na-eche ka ha hụ akpatị ozu Ezenwaanyị ma kwanyere ugwu nke ikpeazụ.
Nkọwa foto, Ọha ndị mmadụ kwụ n'ahịrị na-eche ka ha hụ akpatị ozu Ezenwaanyị ma kwanyere ugwu nke ikpeazụ.
Ndị mmadụ agbakọọla na-eche akpati ozu Ezenwaanyị Elizabeth II

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Ndị mmadụ agbakọọla nso Obieze na-eche akpati ozu Ezenwaanyị Elizabeth II

Ọtụtụ ndị mmadụ agbakọọla n'ụzọ ebe akpati ozu nke Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ ga-esi agafe na Central London taa.

Ndị mmadụ na-eche inweta ohere ha ga-eji akwanyere ya ugwu ikpeazụ mgbe akpati ozu ya ga-erute na Westminster Hall.

Njem ngagharị ga-ebido na Buckingham Palace ruo Westminster Hall

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Njem ngagharị ga-ebido na Buckingham Palace ruo Westminster Hall ga-amalite mgbe o ji nkeji 22 gafee elekere abụọ nke oge Briten
Ndị gbakọrọ na-eche akpati ozu Ezenwaanyị Elizabeth

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-agbakọ na Westminster Hall iche mgbe akpati ozu ga-eru n'Ụlọomeiwu
Ndị gbakọrọ na-eche ka akpati ozu Ezenwaanyị gafee

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Ụfọdụ na-achọ ebe dị ezigbo mma n'ụzọ ahụ ebe ha ga-anọ hụ mgbe a ga-eburu akpati ozu Ezenwaanyị gafee
Igbe Ezenwaanyị Elizabeth II alaruola n'Obieze Buckingham
Ihe ga-eme n'ụbọchị Wenzde n'usoro akwamozu Ezenwaanyị
Nkọwa foto, Ihe ga-eme n'ụbọchị Wenezde n'usoro akwamozu Ezenwaanyị

Ndị mmadụ kwụ n'ahịrị na mpụta Obieze Buckingham tipuru mkpu dịka ụgbọala bụ ahụ Ezenwaanyị Elizabeth II nwụrụ banyere n'Obieze ahụ.

Eze Charles III, ụmụ ya abụọ bụ Ọkparaeze William na Ọkparaeze Harry nakwa ndị ezinaụlọ ya niile so na ndị nabatara ahụ ya.

Ndị mmadụ tiri sị 'zuo ike n'udo!' dịka ụgbọala ahụ gbafere ha.

Dịka ọ dị ugbua, Eze Charles na nwunye ya bụ Ezenwaanyị (Consort) ahapụla obieze Buckingham ahụ.

Cheta na njem a maliter kemgbe elekere iri n'ụtụtụ ụbọchị ụka mgbe ha hapụrụ Balmoral ebe Ezenwaanyị nwụrụ.

Puku kwuru puku mmadụ pụtara kwụrụ n'ahịrị site na mpụta London banye n'ime ya iji nweike hụ Ezenwaanyị ha na njem ikpeazụ ya.

Ahu Ezenwaanyị ga-anọ n'Obieze a otu abali tupu e bupu ya na Hallụ Westminster ebe ndị mmadụ ga-enweike ịbịa kwanyere ya ugwu ikpeazụ.

Ihe ga-eme n'ụbọchị Wenzde n'usoro akwamozu Ezenwaanyị

Ụgbọala bu ahụ Ezenwaanyị Elizabeth II

Ebe foto si, Reuters

Ndị obodo ga-edu ahụ Ezenwaanyị site Buckingham Palace gawa Westminster dịka okụchara 14:00.

A ga-eji ụgbọ eji ebu nnukwu egbe nke ndị agha Eze nke Royal Horse Artillery, ndị agha na ndị ezinụlọ Eze ga-eso kwa ya.

Eze Charles ga-edu ndị a dịka ọ ga-eso igbe ozu a n'azụ, nke a ga-eji okọlọtọ Royal Standard kpuchie.

Igwe mmadụ nwereike ilele njem a dịka ha si Queen's Garden, The Mall, Horse Guards, Horse Guards Arch, Whitehall, Parliament Street, Parliament Square na New Palace Yard. A na-eche na njem a ga-ewe nkeji 40.

A ga-enwe nnukwu ihe onyonyo maka emume a na capital's Royal Parks.

A ga-edowe igbe ozu ya, na-ebe dị elu nke a na-akpọ Catafalque, n'okpuru Imperial State Crown, orb na sceptre, na Westminster.

Ndị agha nke Roral Household ga-echekwa akụkụ ebe a niile oge niile n'ụbọchị.

Archbishop nke Canterbury bụ Justin Welby ga-aka ụka obere oge nke Eze Charles na ndị ezinụlọ eze ọzọ tupu enye ndị ọha ohere ịbata.

Eserese ihe ga-eme n'akwamozu Ezenwaanyị