In pictures: Egwuregwu ndị a ga-eji echeta Ezenwaanyị Elizabeth II

BBC Sport lebara anya na ndụ Ezenwaanyị biri n'ihe gbasara egwuregwu.

Mgbe Ezenwaanyị nọ n'elu ịnyịnya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, E nyere Ezenwaanyị ịnyịnya mbụ ya a kpọrọ Peggy, mgbe ọ dị afọ anọ mana ọ malite ịnya ya mgbe ọ dị afọ isii. Mgbe ọ na-etolite ọ dịla mbụ bụrụ nwaanyị na-akwọ ịnyịnya nke ọma, nke foto a na-egosi mgbe mbụ ọkwọrọ ịnyịnya dịka onyeze n'afọ 1952.
Ezenwaanyị na Adaeze Margaret

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ịhụnanya Ezenwaanyị nwere n'ebe ịnyịnya na dị ukwu nke mere o ji na-aga nzukọ banyere asọmpị ịgba ọsọ nke ịnyịnya. Lee mgbe ya na nwaanye nwaanyị nke obere bụ Adaeze Margaret so gaa nzukọ asọmpi 1950 n'Epson
Ezenwaanyị na Althea Gibson

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, N'afọ1957, Ezenwaanyị bunyere Althea Gibson iko Wimbledon maka ịbụ nwafọ Amerịka isiojii ga-amabute asọmpi SW19
Ezenwaanyị bunyere Jack Burkit nke Nottingham Forest Iko FA Cup n'afọ 1959

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, N'afọ abụọ na-esote ya, Ezenwaanyị gara kirie asọmpi bọọlụ ikpeazụ nke Iko FA n'ọgbọegwuregwu Wembley dịka Nottingham Forest ji ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie Luton (2-1). O bunyere onye ndu ha bụ Jack Burkit iko ahụ
Ezenwaanyị bunyere Bobby Moore Iko Mbaụwa nke afọ 1966
Nkọwa foto, Oge kachasị mma nye Ezenwaanyị bụ n'afọ 1966 n'ọgbọegwuregwu Wembley mgbe o bunyere Bobby Moore Iko Jules Rimet dịka Ịngland ji ọkpụ goolu anọ asatara abụọ merie West Germany n'asọmpi Iko Mbaụwa.
Ezennwaanyị na Virginia Wade

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Afọ 1977 pụrụiche nye Ezeznwaanyị dịka o mere emume afọ iri abụọ na ise o were ọchịchị ma gaa kirie asọmpi ikpeazụ Wembledon nke ụmụnwaanyị a kụrụ dịka Virginia Wade mabuuru ike ahụ.
Ezenwaanyị na Jurgen Klinsmann

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ezenwaanyị gara kirie asọmpi ikpeazụ nke Euro 96 nke Germany na Czech Republic gbara nke onye ndu Germany bụ Jurgen Klinsmann nwetere mmeri
Ezenwaanyị na David Beckham nakwa Kirsty Howard

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, David Beckham na Kirsty Howard nyere Ezenwaanyị Jubilee Baton na mgbape asọmpi Commonwealth nke afọ 2002 na Manchester
Ezenwaanyị na Martin Johnson na Clive Woodward

Ebe foto si, AFP/Getty Images

Nkọwa foto, Mba Ịgland mere ọfụma n'asọmpi Rugby Iko Mbaụwa n'afọ 2003, ndị otu nke onye ndu ga bụ Martin Johnson na onye nchịkọta ha bụ Clive Woodward, nke a nabatara ha n'Obieze n'ụzọ pụrụiche.
Ezenwaanyị dosara hockey puck tupu asọmpi dị n'etiti Guildford Flames na Aquacity Poprad amalite na Slovakia

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Na njem nleta na Slovenia n'afọ 2008, a kpọrọ Ezenwaanyị oku n'emume puck drop n'asọmpi hockey dị n'etiti Guildford Flames na Aquacity Poprad
Ezenwaanyị n'asọmpi 2012 Olympics

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ezenwaanyị gbara mbọ na mmepe asọmpi 2012 Olympic, mgbe o gosiri ihe onyonyo ya na James Bond (Daniel Craig) tupu o si n'elu ụgbọelu wụtuo n'ime ọgbọegwuregwu> O mechara gbape ya bụ egwuregwu
Ezenwaanyị na Tanni Grey-Thompson

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ezenwaanyị gbapere asọmpi Olympics nke dị nwere nkwarụ (Paralympics) nke afọ 2012 ma zute onye tụụrụla ugbo ugboro iri na otu bụ Baroness Tanni Grey-Thompson
Ezenwaanyị na jockey Ryan Moore

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mgbe ịnyịnya ya bụ Estimate na jockey Ryan Moore, tuuru ugo Iko Ọlaedo n'asọmpi Royal Ascot n'afọ 2013, nke mbụ onyeze nọ n'ọchịchị ga-enweta ịnyịnya nwere mmeri n'afọ 207.
Ezenwaanyị hịọrọ ịnyịnya ya bụ Estimate mabutere Iko Ọlaedo n'afọ 2013 aka na azụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Estimate bụ otu n'ime ịnyịnya Ezenwaanyị kachasị eme ọfụma n'oge ọ malitere ịka nka na ndụ
Ezenwaanyị na Bryan Habana nakwa Henry Speight tupu a malite asọmpi Iko Mbaụwa Rugby n'afọ 2015

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ezenwaanyị zutere nwafọ Saụt Afrịka bụ Bryan Habana na nwafọ Australia bụ Henry Speight n'emume asọmpi Iko Mbaụwa nke Rugby n'afọ 2015
Ezenwaanyị na Ryan Moore

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọkaibe n'asọmpi jockey bụ Ryan Moore na Ezenwaanyị nwere mkparịtaụka mgbe nwa ya nwoke bụ tuuru ugo Diamond Jubilee n'asọmpi Royal Ascot n'afọ 2016
Ezenwaanyị na onye tuuru ugbo ugboro abụọ n'asọmpic Olympic bụ Nicola Adams

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ezenwaanyị nọọrọ na'Obieze Buckingham nabata ndị tuuru ugo n'asọmpi Olympics na Paralympics gụnyere Nicole Adams nke e mere n'afọ 2016
Ezenwaanyị na 2017 Royal Ascot

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, N'afọ 2017, Ezenwaanyị ga-akwara asọmpi Royal Ascot ma sonye kwa na njem ngagharị ngosi
Ezenwaanyị gara n'ihu n'isonye na Royal Ascot ma na-enwetekwa obi aṅụrị n'emume ndị a na Berkshire n'ọnwa Juun afọ 2021

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ezenwaanyị gara n'ihu n'isonye na Royal Ascot ma na-enwetekwa obi aṅụrị n'emume ndị a na Berkshire n'ọnwa Juun afọ 2021
N'ọnwa Ọktoba afọ, Ezenwaanyị malitere asọmpi mbaụwa nke ọsọ relay n'asọmpi Commonwealth tupu asọmpi ndị a amalite na Birmingham. O nyefere osisi baton n'aka onye nwe nkwarụ tụụrụ ugo ọlaedo bụ Kadeena Cox bụ onye ji otu ụkwụ gbaruo ọsọ n'isi.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, N'ọnwa Ọktoba afọ, Ezenwaanyị malitere asọmpi mbaụwa nke ọsọ relay n'asọmpi Commonwealth tupu asọmpi ndị a amalite na Birmingham. O nyefere osisi baton n'aka onye nwe nkwarụ tụụrụ ugo ọlaedo bụ Kadeena Cox bụ onye ji otu ụkwụ gbaruo ọsọ n'isi.