Queen Elizabeth II: Ntuziaka site n'ụbọchị ruo n'ụbọchị maka olili ya

Taa bụ ụbọchị nke anọ nakwa nke ikpeazụ akpati ozu Ezenwaanyị ga-edina na 'Westminster Hall bụ ebe ndị mmadụ na-abịa ikiri ya ma kwanyere ya ugwu ikpeazụ.
Akpati ozu Ezenwaanyị a nọ n'elu ebe a kpọrọ 'catafalque'.
Ọtụtụ narị puku mmadụ akwanyerela Ezenwaanyị ugwu ikpeazụ kamgbe abalị anọ akpati ozu ya dị n'ụlọ a nke a rụrụ kamgbe 11th Century.
Mana ọtụtụ ndị ọzọ ka kwụkwa n'ogologo ahịrị nke toruru na South Bank, gafee 'National Theatre', gafee 'Tate Modern' na HMS Belfast wee pụta na 'Southwark Park'.

Ọ kụọ elekere asatọ nke abalị taa, a ga-enwe otu nkeji ịnọ jụụ na UK niile.
A na-echetara ndị mmadụ ka ha gbaa mbọ hụ na ha mere nke a, ya bụ ịnọ nwayọọ na-ekwughị owku ọbụla ruo otu nkeji, n'ime ụlọ ha, n'ogbe ha nakwa okirikiri ha.
Tupu e mee otu nkeji ịgbachi nkịtị a, a ga-enwe emume ikpe ekpere n'ogige 'Kelpies', akpụrakpụ isi ịnyịnya nke ogologo ya ruru 98 ft, n'akụkụ Falkirk.
A ga-amụnye ọkụ na mpanaka 96, iji gosi afọ ole Ezenwaanyị biri ndụ n'ụwa, ma mee ka mpanaka ndị a sere n'elu mmiri nke e ji gbaa akpụrakpụ ahụ okirikiri.
A na-atụ anya na ndị isi ala mba dị icheiche ga-amalite ịbata na London taa maka olili Ezenwaanyị. Ụfọdụ n'ime ha ga-ebinye aka n'akwụkwọ ngụgụ obi nke e mepere n'obi Lancaster House.
Eze Charles II na Praịm Mịnịsta Liz Truss ga-enwe ọgbakọ n'obieze Buckingham. Eze na Camila bụ nwunye ya ga-enwekwa ọgbakọ ebe ha ga-anọ nabata ndị isi ala na ndị ọzọ welitere isi n'ọchịchị bụ ndị bịara maka olili a.
N'ehihie taa, Praịm Mịnịsta ga-ezute ụfọdụ ndị isi ala mba ọzọ nke gụnyere, Taoiseach Micheal Martin, Praịm Mịnịsta mba Kanadia bụ Justin Trudeau; Onyeisiala mba Poland bụ Andrzej Duda; na Onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden.

Ebe foto si, BBC News
Akpatiozu ozu Ezenwaanyị ka dị na Westminster Hall maka ụbọchị nke atọ, dịka a na-eche ụbọchị olili ya n'ụbọchị Mọnde, abalị iri na itoolu nke ọnwa Sepụtemba.
Ogige ebe a ahụ Ezenwaanyị dị ghe oghe ogologo ụbọchị niile maka ndị mmadụ na-abata ịkwanyere ya ugwu ikpeazụ.]
Ndị mmadụ kwụrụ n'ogologo ahịrị ruo na mpaghara 'Central London'.
Maka ndị chọrọ ikiri nkwanye ugwu ikpeazụ a, lee ya ebe a.
Lee etu emume olili Ezenwaanyị si aga, ụbọchị ruo ụbọchị.

Taa bụ ụbọchị nke atọ akpati ozu Ezenwaanyị ga-edina na Westminster Hall, bụ ebeọ ga-anọ ruo ụtụtụ ụbọchị olili ya.
Puku kwuru puku ndị mmadụ bịara iru uju ọnwụ ya ga-akwụ na-ahịrị iji kwanyere ya ugwu ikpeazụ n'ụlọ a nke a rụrụ kamgbe '11th Century'.
Ahịrị a toro ogologo gafee South Bank, gafee National Theatre, gafee Tate Modern na HMS Belfast, wee ruo mpaghara Southwark Park.

Akpati ozu Ezenwaanyị nọ na Westminster Hall ebe ndị mmadụ na-abịa ịhụ ya anya ikpeazụ, tupu e lie ya n'ụbọchị Mọnde 19 nke Septemba.
Ụlọ ebe ọ nọ ga-eghere oghe kwa ụbọchị ruo n'ụtụ Mọnde ka igwe mmadụ chọrọ ịhụ ya anya nwee ohere ikwanyere ya ugwu ka ha na-agafe akpati ya.
Ọtụtụ mmadụ akwụrụla n'ahịrị na-eche n'ebe Sentralụ London. Ndị chọrọ ịnọ n'ịntanetị akwanye ugwu nwere ike isi n'ebe a BBC wepụtara lelee ya.
Nke a bụ ntuziaka ihe ga-eme, kwa ụbọchị.

Taa bụ ụbọchị nke abụọ ahapụrụla akpati ozu Ezenwaanyị ebe ọha ga-abịa kwanyere ya ugwu na Westminster Hall, bụ ebe ọ ga-anọ ruo ụtụtụ ụbọchị akwamozu ya.
A na-atụ anya na puku kwuru puku ndị na-eru uju ga-agbakọ ịkwanyere ya ugwu ikpeazụ n'ime ụlọ ahụ a rụrụ kemgbe senchuri 11, nke kacha kaa nka n'Obieze nke Westminster.
Ndị mmadụ akwụrụla n'ogologo ahịrị nwere ike iru South Bank, National Theatre, Tate Modern na HMS Belfast ma ruo Southwark Park.

A ga-edowe igbe ozu ya, na-ebe dị elu nke a na-akpọ Catafalque, n'okpuru Imperial State Crown, orb na sceptre, na Westminster.
Eze Charles nke atọ na Camilla ga-eme njem gaa Wales, nke bụ ebe ikpeazụ ọ ga-aga dịka Eze, n'ime mba anọ nọ n'okpuru UK.
Ha ga-ebu ụzọ kwụsị na Llandaff Cathedral ebe a ga-anọ kaa ụka, nke Dean ga-edu. A kachaa ụka, Charles na Camilla ga-ekele ụmụakwụkwọ na igwemmadụ.
A ga-enyezi Eze na nwunye ya ihe a kpọrọ 'Motion of Condolence' n'ime ụlọomeiwu Senedd Siambr, dị na Cardiff Bay. Ha ga-enwe ohere ịgụ ozi itiaka n'obi ndị mmadụ zitere.
A na-atụ anya na Eze na Mark Drakeford bụ First Minister mba ahụ nakwa Elin Jones bụ onyeisi ụlọomeiwu Senedd, ga-enwe nzukọ imeụlọ na Cardiff Castle.
Ya na Camilla ga-ezute ndị ọbịa si n'ụfọdụ ụlọọrụ, ụlọ ndị enyemaka n'efu na ụfọdụ ndị okwukwe nke ofufe.

Igbe ozu Ezenwaanyị ga-anọ abalị atọ ya na Westminster Hall.

Igbe ozu Ezenwaanyị ga-anọ abalị anọ zuruoke na Westminster Hall.
UK niile ga-ada nkịtị ebe elekere asatọ nke abalị.
Ndị mmadụ ga-adali nkịtị a n'ụlọ ha, n'ezi ebe ha na ndị agbataobi ha nọ maọbụ n'ọgbakọ dị iche iche na ịmụ anya abalị ha haziri.

N'ụtụtụ ka ngosipụta igbe ozu Ezenwaanyị ga-akwụsị, a ga-ebu ozu ya gaa Westminster Abbey maka olili mba ya, ụbọchị a bụ ụbọchị ezumike nke ụlọakụ agaghị emepe na mba UK.
Ndị ọbịa a na-atụ anya ga-eso ezinụlọ Eze bụ ndị isi ndọrọndọrọ ọchịchị UK na ndị isi ala mba ụwa bịaranụ.
A ga-akwụsị nkwanye ugwu ikpeazụ ebe a dọwara ozu dịka o ji nkeji 30 gafee elekere isii. Mgbe o ji nkeji 44 gafee elekere 10 nke ụtụtụ, a ga-eburu akpati ozu ahụ si n'Obieze Westminster ruo Westminster Abbey.
A ga-amalite akwamozu n'elekere 11 nke ụtụtụ.
A ka ga-ewepụta ozi gbasara akwamozu a.

Mgbe emechara emume a, a ga-eso igbe ozu ya site Westminster Abbey gaa Wellington Arch, ma site ebe a gawa Windsor.
Ụgbọala ga-ebu igbe ozu ya site Long Walk gawa ụlọụka St George dị na Windsor, ebe a ga-aka ụka pụrụiche maka olili ya.













