Queen Elizabeth II and Africa: Oge ndị gbapụtara ihe n'ọchịchị ya

Ebe foto si, Getty Images
Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ agaala njem n'ihe karịrị mba Afrịka iri abụọ n'ọchịchị ya dịka ọchịchị mba Briten bịara na njedebere ma mwereonwe na-efe ebe niile.
Ihe njikọ pụrụiche dịrị n'etiti Britain nakwa ọgbakọ Commonwealth nke Ezenwaanyị bụ onyeisi ya.
Ọ bụ ezigbo mmekọrịta nwekwara ụfọdụ nsogbu ka mmekọrịta ahụ bụ nke dị n'etiti mba Briten nakwa mba ndị ha chịburu na mba Afrịka.

Ebe foto si, Getty Images
Adaeze Elizabeth gbasara ozi site n'obi Gọọmentị dị na Cape Town mba Saut Afrịka dịka ọ na-eme mmemme ịgba afọ 21 ebe ọ na-enyefe ndụ ya irụrụ Commonwealth ọrụ.
"Ebe niile m gara n'ala mara mma a bụ Saụt Afrịka... nne m na nna m, nwanne m nwaanyị na mụ abanyela n'ime obi ndị ebe ahụ metere anyị mma ka anyị ebiela ndụ anyị niile n'etiti ha."

Ebe foto si, Getty Images
Adaeze Elizabeth nọ ebe a n'ụlọoriri Treetops na mba Kenya ebe ya na di ya bụ Duke Edinburgh nọ.
Ọ bụ na njem a ka ọ mechara nụ na nna ya Eze George nke ise anwụọla nakwa na ọ ga-abụru Ezenwaanyị.

Ebe foto si, Getty Images
Nke a bụ mbụ n'ime njem abụọ Ezenwaanyị Elizabeth mere gaa Naịjirịa. Ya na Igwe Oba Adeniji-Adele nke abụọ nọ na foto a na Legọs. Ọ gakwara Calabar, Enugu, Jos, Kaduna, Kano na Port Hacourt.

Ebe foto si, Getty Images
Ezenwaanyị Elizabeth na Kwame Nkrumah bụ onyeisiala mbụ mba Gana nakwa onye bụ mmmereonwe n'isi na-agba egwu. Egwu ha na-egere agba bụ nke pụrụiche edere maka mmemme ahụ akpọrọ 'Welcome Your Majesty'.

Ebe foto si, Getty Images
Ezenwaanyị Elizabeth na Ọkparaeze Phillip nọ na foto a ebe Emperor Haile Selassie I nke Itiopia sọ ha kwụrụ na Addis Ababa, mgbe ha gara nleta. Emperor gbara ọsọ ndụ gaa na mba Briten site na 1936 rue 1941 dịka ndị mba Itali nọchiri n'obodo ya ma laghachikwa n'ọchịchị mgbe ndị agha Briten nakwa Commonwealth chụpụrụ ndị Italy.

Ebe foto si, Getty Images
Ezenwaanyị Elizabeth na Onyeisiala El Tigani El-Mahi mgbe ha sị ọdọụgbọelu Khartoum bata. Njem ya na mba Sudan gụnyere ọsọ anụmanụ ịnyịnya Kamel nakwa njem n'ebe a na-arụpụta Roseires Dam na Blue Nile nke arụchapụrụ n'afọ so ya.

Ebe foto si, Getty Images
Ezenwaanyị na Onyeisiala Julius Nyerere na mbido njem abalị atọ. Afọ iri na asatọ tupu nke a mee, Nyerere duru mba Tanganyika gaa njem mwereonwe ha ebe ọ bụrụ Praịm Minista mbụ ha nakwa onyeisiala mbụ ha. Dịka oge na-aga, ọ mechara jụpụ ihe niile bụ mba Briten nakwa Yurop. N'agbanyeghị nke a, gọọmentị mba Briten hụrụ ya dịka onye enwereike ịtụkwasị obi n'oge ọgbaghara.

Ebe foto si, Getty Images
E chriri onyeisiala Zimbabwe echichi nkwanyeugwu Knight n'aka Ezenwaanyị n'afọ 1994.
Mana dịka omume na-akawanye njọ n'etiti Zimbabwe na mba Briten dịka ọ na-agbanwe iwu ala ha, Zimbabwe pụọ na Commonwealth n'afọ 2003 - e were napụ Mugabe ọkwa Knight ya n'afọ 2008.

Ebe foto si, Getty Images
Ezenwaanyị Elizabeth nọ na foto a ebe ọ na-abata ọdọụgbọelu Durban. Ọ nọ na njem abalị isii na mba Saụt Afrịka ebe ọ hụrụ udu mmiri kachasi mma n'ime afọ iri n'ọnụno ya mere eji kpọo ya Motlalepula maọbụ "Ezenwaanyị udu mmiri".

Ebe foto si, Getty Images
Ezenwaanyị na Onyeisiala ojii mbụ nke mba Saụt Afrịka bụ Nelson Mandela bụ ndị enyi dị nso.
Edemede niile o deere Mandela, o biri aha ya dịka "enyi gị ọma Elizabeth R" ma na-akpọ ya Nelson, ebe a na-ekwu na ọ kpọrọ ya "Elizabeth".

Ebe foto si, Getty Images
Ezenwaanyị gara Naịjirịa nke ugboro abụọ n'afọ 2003.
A chụpụburu mba ahụ n'otu Commonwealth maka imebi ikike ruru mmadụ n'ọchịchị Sani Abacha n'afọ 1995 ma kpọbatakwa ha n'afọ 1999 mgbe ha laghachiri n'ọchịchị onyekwuouche ya.
Ezenwaanyị na Onyeisiala Olusegun Obasanjo nọ na foto a na mgbape nzụkọ ndị isi otu Commonwealth n'Abuja.

Ebe foto si, Getty Images
Na njem ikpeazụ ya n'ala Afrịka, onye kachasị nọ n'ọkwa ọchịchị mba Briten zutere otu onye kachasị nọrọ n'ọchịchị n'Afrịka bụ Yoweri Museveni bụ onye nọ n'ọkwa kemgbe 1986. Ọ gabuola njem na mba Yuganda mgbe ọ gara nke mbụ ya dịka Ezenwaanyị n'afọ 1954.









