Ike Ekweremadu news today: A kpụpụla otu nwoke ụlọikpe gbasara ikpe Ike Ekweremadu

Ebe foto si, Ike Ekweremadu/Obeta
Ụlọikpe dị na mba Briten akpụpụla Obinna Obeta ụlọikpe, na-ebo ya ebubo iso Sinetọ Ike Ekweremadu na nwunye ya kpaa nkata maka ịnapụ mmadụ akịrị ya.
A na-ekwu na Obeta dị afọ iri ise bi na mpaghara Southwark, Saụt Lọndọn nke mba Briten, haziri ka a kpọta mmadụ, ghọgbuo ma napụ ya akịrị ya n’ụzọ dara iwu ịgba ohu ọgbara ọhụrụ (Modern Slavery Act) nke mba ahụ.
A na-enyocha Obeta maka iso Ekweremadu na Beatrice nwunye ya kpaa nkata isi Naịjiria kpọfete nwaokorobia dị afọ 21, na mba Briten.

Ebe foto si, Obeta
Ha kwuru na ha nọ na-ahazi ka e nye nwa Ekweremadu ya bụ akịrị a ga-anapụta nwamadi ahụ.
A na-ebo ya ebubo ime nwamadi ahụ ka ohu tupu ọ gbafuo ma gaa mee mkpesa n'aka ndị uweojii nke Staines dị na Surrey.
Cheta na a nwụchiri Ekweremadu na nwunye ya n'ọdọụgbọelu Heathrow n'ụbọchị 21 nke ọnwa Juun afọ 2022, dịka ha si mba Turkey febata.
Ekweremadu na nwunye ya ekwuola na e nweghi nkata ọjọọ ha kpara, ma kwuo na enweghi onye ha ghọgburu.
Mmadụ atọ a ga-apụta zara ọnụ ha n'ụlọikpe Old Bailey, n'ụbọchị anọ nke ọnwa Ọgọst a.









