Etu ndịagha si nweta ozu mmadụ ọhụrụ, nke ochie dịka ha wakporo akwụ anọ ha sị bụ nke ndị Ipob/ESN n'Okigwe

Ọhịa ebe ndịagha Naijiria wakporo n'Okigwe

Ebe foto si, Nigeria Army/Twitter

Mmadụ abụọ anwụọla, ebe a nwụchiri ndị omekome anọ na-enyo na ha bụ ndị otu nwereonwe Biafra a kpọrọ 'Indigenous People of Biafra'(Ipob) na alaka ọgụ ha bụ Eastern Security Network'(ESN)dịka ndị agha Naijiria wakporo akwụ ha n'Imo steeti mee mkpocha na nzacha.

Ozi si n'isiụlọọrụ otu ndịagha e hiwere iche maka nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ a kpọrọ 'Joint Task Force South East Operation Udoka' nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Jonah Unuakhalu binyere aka ma wepụta ụbọchị Monde kwuru na ndị otu ha wakporo akwụ ndị Ipob na ESN anọ n' Ihube, Aku nakwa Umulolo dị n'Okpuru Ọchịchị Okigwe, n'Imo steeti Ụbọchịụka.

Okwu Arụsị a sị ndị Ipob nwere n'Okigwe

Ebe foto si, Nigeria Defence

Ozi ahụ gbara ama na ha nwetara ozu ọhụrụ na nke ochie ndị mmadụ nakwa ihe akaebe ndị ọzọ na-arụtụ aka na mpụ iri mmadụ, ịgwọ ọgwụ na ntọrị ụmụamala aka ha dị ọcha na-eme n'ime ọhịa ndị ahụ.

Ihe ndị a hụrụ n'akwụ ndị omekome

Ebe foto si, Nigerian Army

"E nwere ihe akaebe gosiri nke a site na ozu ọhụrụ na nke ochie a chọpụtara ka a na-ekpochasị ọhịa ndị ahụ.

" E mebikwara ụlọ dịbịa abụọ bụ ndị riri mbọmbọ ọsọ ka anyị rutere."

"Anyị memilarị ọbụladị okwu arụsị Amobi Chinoso Okafor bụ ebe o ji mmadụ achụ aja."

Ọgbatumtum ike

Ebe foto si, Nigeria Army

Ihe ndị ọzọ e nwetara n'ebe ndị ahụ gụnyere paụnds Biafra, ọgbatumtum ndịike(powerbike) ọgbatumtum nkịtị anọ, igwe ji anyanwụ enye ọkụ(solar panel), simenti e ji ama POP bụ nke e chertere ha napụrụ ndị mmadụ.

Biafra Pounds

Ebe foto si, Nigeria Army