Anambra State Insecurity: "Ụjọ anaghị ekwezi anyị nọrọ n'ezi gafee elekere asaa nke mgbede" - Ndị bi n'Anambra

Aha onyonyo, Ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ

Ndị uweojii ekwela nkwa na ha ga-amịpụtara ndị ekperima anya n'Anambra Steeti.

Nke a na-abịa dịka akụkọ pụtara nke kwuru na ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ kwuru na ha ga-awakpo okpuru ọchịchị dị icheiche na steeti ahụ.

Okpuruọchịchị ebe ndị ekperima a kwuru na ha ga-awakpo gụnyere: Ihiala, Aguata, Awka North, Nnewi South, Awka South, Idemili North, Idemili South, Orumba North, Orumba South na Anambra East.

Ụfọdị ndị bi na mpaghara ndị a gwara BBC Igbo na ọnọdụ enweghị nchekwa etinyela ha n'ụjọ nakwa ịchịrị obi n'aka.

"Ụjọ erikazi," otu nwaagbọghọ achọghị ka a kpọọ aha ya gwara anyị.

"Onweghịzị onye na-anọ n'ezi karịa elekere asaa nke mgbede."

"Ụbọchị ọbụla e kwuru na ọ bụ 'sit-at-home', onweghị onye ụjọ na-ekwe ka ọ pụta ezi."

"Onweghị onye na-ekwe abịa mmemme agbamakwụkwọ maọbụ akwamozu ọbụla n'Anambra Steeti."

Nwa ada a kọrọ akụkọ etu e si wakpoo ndị bịara mmemme agbamakwụkwọ e mere n'oge 'Easter' afọ a.

Ụfọdụ n'ime ndị ya bụ ihe metụtara, a hụbeghị ha anya ọzọ ruo taa.

Nwaokorobịa ọzọkwa gwara anyị okwu gbasara ihe a na-emenụ kwuru na "o nweghịzi ihe anyị na-azụ n'ahịa n'ihi enweghị nchekwa".

"Onweghịzị ndị na-esi ebe tere aka abịa azụ ahịa n'Ọnịcha, maka na onye ọbụla na-ezezi ndụ."

"Chetakwa na otu ụbọchị apụọla n'izuụka n'ihi sit-at-home', ọ bụ etu a ka ihe ga-adịgidezi?"

Ihe ndị uweojii kwuru gbasara ọnọdụ a

Usman Alkali Baba

Ebe foto si, Nigeria Police Force

Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Usman Alkali Baba ekwuola na ndị uweojii ga-ewepụta usoro nchekwa ọhụrụ iji buso ndị ekperima agha n'Anambra Steeti.

Baba kwuru nke a site n'ọnụ John Amadi, bụ osote onyeisi ndị uweojii, onye bịara Anambra n'ụbọchị Tọzde ịkwanyere onye nke ha lara mmụọ bụ Joseph Egbunike ugwu.

Amadi kwere nkwa na "ugbua bụ oge ndị uweojii ga-eburu agha buso ndị ekperima ebe ọbụla ha zoro."

Ọ gwakwara ndị mmadụ ka ha na-agara mkpa ha maka na ọ baghị uru ịnị n'ụjọ.

Ihe gọọmentị Anambra na-eme maka nke a

Gọvanọ Chukwuma Soludo ekwuola na ihe na-eche ya ugbua n'ọrụ ọchịchị ya bụ ihibe usoro ncheka n'Anambra steeti

Ebe foto si, Soludo TV/Facebook

Nkọwa foto, Gọvanọ Chukwuma Soludo ekwuola na ihe na-eche ya ugbua n'ọrụ ọchịchị ya bụ ihibe usoro ncheka n'Anambra steeti

Onyeisi ọrụ mgbasaozi nke Gọvanọ Anambra Steeti, bụ Christian Aburime, kwuru na ọ bụ ụjọ ka ndị ekperima ahụ na-achọ itinye n'ahụ ndị mmadụ.

Aburime kwuru na Anambra steeti bụ obodo e ji udo na ọganihu mara.

"Gọọmentị agaghị agbachi nkịtị ka ndị ekperima na-eyija ndị mmadụ ụjọ," Aburime kwuru.

Gọvanọ Anambra bụ Chukwuma Soludo ekwukwaala ugboro ugboro na ọchịchị ya agaghị anabata ndị ekperima na ndị na-eyi ndụ egwu.

O kwela nkwa ka ndị iwe na-ewe dosa ngwaọgụ ha, na gọọmentị ga-enye ha mgbaghara pụrụ iche a kpọrọ 'amnesty' na bekee, ma nyekwa ha ọzụzụ ha ga-eji bụrụ mmadụ.

Mana ka ọ dị ugbua, ọ dịghị ka nkwa niile a amịtala mkpụrụ, maka na ọnọdụ enweghị nchekwa ka na-agbalị elu n'Anambra Steetị.

Gịnị na-ebute enweghị nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Nigeria Presidency-Facebook

Nkọwa foto, Ọnọdụ nchekwa kawanyere njọ n'Ọwụwa Anyanwụ oge gọọmentị Naịjirịa nwụchiri Nnamdi Kanu onyeisi ndị IPOB

Enweghị nchekwa bụ nsogbu cheere mpaghara Naịjirịa niile aka mgba.

Mana nke mpaghara Ọwụwa Anyanwụ malitere ịrị elu dịka a nwụchiri Nnamdi Kanu, onyeisi ndị otu Indigenous People of Biafra, IPOB.

Ndị Ipob bụ otu chọrọ ka mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa bụrụ mba nọọrọ onwe ya a kpọrọ Biafra.

Ọ bụ kamgbe gọọmentị Naịjirịa nwụchiri Kanu n'ọnwa June afọ 2021 ka ọgbaaghara rịrị elu nke ukwuu n'Ọwụwa Anyanwụ.

Mana ndị otu IPOB ekwuola na aka ha adịghị n'ihe a na-emenụ, maka na otu ha bụ otu udo, ọ bụghị otu ọgbaaghara.