Shireen Abu Aqla Burial: Etu ọgbaghara si dapụta n'akwamozu onye ntakụkọ a

Ndị akwa gbara akpati ozu Shireen okirikiri

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị akwa gbara akpati ozu Shireen okirikiri

Ndị uweojii akụọla ndị na-akwa arịrị ihe n'akwamozu Shireen Abu Aqla, onye agbagburu na mpaghara West Bank nke butere oke iwe.

Akpati ozu ya adapụchala dịka ndị uweojii, ji okpiri, bakwute ọha ebe ndị Palestine juru biara isonye n'akwamozu ahụ.

Ndị uweojii kwuru na ha wakporo ndị biara akwa dịka ndị ahụ were okwute na-atụ ha.

A gbara Abu Aqla egbe n'ụbọchị Wenezde gara aga mana mba Israel na Palestine na-ebo onwe ha ebubo maka onye gbagburu nwaanyị ahụ.

Ọtụtụ mmadụ nọ na mba dị iche iche katọrọ ogbugbu Abu Aqla.

Onyonyo gosiri ebe ndị uweojii na ndị Palestine gbara akpati ozu gburugburu n'ime ogige ụlọọgwụ, tupu ndị ụweojii ndị pụta kwawa ha aka , n'eti ụfọdụ ihe,

Ndị uweojii si na etu ọgbakọ ahụ si eme aghara aghara mere ha ji wepụta atụmaatụ ịgbasasi ha n'ike.

Ndị Palestinian ji foto Shireen eme ngaghariwe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị Palestinian ji foto Shireen eme ngaghariwe

Onye bụ Shireen Abu Aqla?

Shireen Abu Aqla (Al Jazeera handout)

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Shireen Abu Aqla bụ onye ntakụkọ ama maka eto o si setee ọgbaghara dị n'etiti Israel nakwa Palestinian

A mụrụ Shireen Abu Aqla n'ọnwa Jenụwarị 1971 na mba Jerusalem.

O gụrụ akwụkwọ n'ụlọ akwụkwọ Rosary Sisters Sekọndiri dị na Jerusalem.

Ọ gụbụrụ akwụkwọ gbasara Sayensi na Teknụzụ na Jordan University of Science and Technology. O mechara nweta asambodo n'agụmakwụkwọ mgbasaozi na mahadum Yarmouk dị na Jordan.

Mgbe Sireen gụchara akwụkwọ, ọ rụrụ n'ọtụtụ ụlọọrụ mgbasaozi n'ime Palestine. O bidoro rụwa ọrụ n'Aljazeera n'afọ 1997 dịka o mechara otu afọ e ji mepee ya bụ ụlọrụ nke mere ya onye ntakụkọ ezi mbụ Aljazeera.

O ruola afọ iri abụ na ise Abu Aqla bụrụla onye ntaakụko ama ama ma na-esetee akụkọ ụfọdụ gụnyere ọgbaghara Palestinian Intifada mere n'afọ 2000, mgbe Israeli ji ike banye "Jenin Refugee Camp" nakwa obodo Tol Karam n'afó 2002.

Shireen kwuru na njem nleta ya n'ụlọ mkpọrọ dị na Ashkelon, n'akụkụ Gaza n'afọ 2005 mepere anya ya ka ọ hụ ihe ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ na-agabiga.

"Ihe mere m ji ghọrọ ịbụ onye ntaakụkọ bụ "ka ya na ndị mmadụ dị na mma." " E nwere ike agaghị agbanweli ihe ndị mmadụ na-eme mana obi bụ m sọ ụtọ na m na-eweta olu ndị mmadụ ka ụwa nụrụ ya." bụ ihe Shireen Abu Aqla kwuru mgbe a jụrụ ya ajụjụ n'emume ncheta afọ iri abụọ na ise Aljazeera malitere mgbasaozi.