Sir Louis Mbanefo: Ị ma ihe dị mkpa o mere iji bi agha Biafra n'afọ 1970?

Sir Louis Mbanefo, onyeisi ndị gara ikpeudo agha Biafra na London mba Briten le 15 juin 1968

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Jessica Nwankwo
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos

Ị nụ ebe akpọrọ aha Sir Louis Mbanefo, kedụ ihe ga-agbata gị n'uche?

Louis Nnamdi Mbanefo bụ ọkaiwu mbụ n'ala Igbo niile, nke a mụrụ n'ụbọchị 13 nke ọnwa Mee n'afọ 1911.

A mụrụ ya n'Ọnịcha, Anambra steeti bụ ebe ezinaụlọ ya si. Ọ gara ụlọakwụkwọ na 'Methodist Boys High School' nakwa 'Kings College' ndị dị na Legọs.

O si ebe ahụ gaa mahadum University College London dị na mba Briten ebe ọ gụrụ 'Law'. Ọ mechara gakwa Kings College dị na mahadum Cambridge ebe ọ gụrụ 'History'.

Mgbe ọ laghachitere Ọnịcha ịmalite ọrụ ya, ude ya bidoro dewe ebe niile maka etu o si ekpezi okwu n'etiti ndị na-ese okwu ala.

Nke a mere ka ndị ọgaranya dị icheiche n'ọwụwa anyanwụ nakwa mpaghara ugwu Naịjirịa malitere ịkpọ ya ọrụ.

Ọ mechara banye ihe ndọrọndọrọ n'afọ 1950 ma nweta ọkwa dịka onye omeiwu na nzụkọ 'Parliament' nke mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

Aha onyonyo, Gọọmentị gaara enye ndị na-achọ Biafra 'Plebiscite - Mbazulike Amechi

Kedụ ihe ndị ọzọ e ji mara ya?

N'afọ 1952, enyere ya ọkwa n'ụlọikpe kachasị na Naịjirịa mgbe ahụ akpọro 'Supereme Court' ma ziga ya Warri ebe ọrụrụ ọrụ dịka 'Resident Judge' ebe ahụ.

N'otu aka ahụ n'afọ 1961, Ezenwaanyị Elizabeth nke mba Britain chiri ya 'Knight' nke nyere ya echichi 'Sir', aha masiri ya nke ukwu.

Enyekwara ya ọkwa n'ụlọikpe nke mba ụwa niile bụ International Court of Justice ebe ọ nọgodere rue afọ 1966.

Mgbe agha Biafra suru n'afọ 1967, Mbanefo so na ndị mbụ malitere okwu ikpezi udo na Kampala bụ isi obodo mba Yuganda n'afọ 1968.

Cheta na-enyere ya ọkwa dịka 'Chief Justice' Biafra ebe ọ nọgidere rue ngwucha agha ahụ, ọ gbapụghị ọsọ dịka ndị ibe ya sị gba ọsọ ndụ.

A ma Sir Louis Mbanefo dịka ọkaiwu na ọkaikpe pụrụiche maka etu o si atapịa okwu nke Bekee kpọrọ "Orator".

Ọ gbagidere mbọ maka ọdịmma ndị Igbo nakwa ikpezi udo ebe ọbụla enwere esemokwu rue ọnwa ya n'afọ 1977 mgbe ọ dị afọ 65.

Aha onyonyo, Ọkaikpe Nkemdilim Izuako

Mbanefo na agha Biafra

Ebe Sir Louis Mbanefo na-edu Ojukwu n'iyi ọrụ na 30 Mee 1967.

Ebe foto si, Screenshot/Other

Nkọwa foto, Ebe Sir Louis Mbanefo na-edu Ojukwu n'iyi ọrụ na 30 Mee 1967.

Mgbe ndị agha weghara ọchịchị n'ike n'afọ 1966 ma gbuo ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ kpalitere ihe e mechara mara dịka agha 'Biafra' n'afọ 1967.

Ọ bụ Odumegwu Ojukwu bụ onye kewapụtara ọwụwa anyanwụ nakwa ebe ndị ọzọ gbara ya gburugburu kpọọ ya 'Biafra'.

N'ụbọchị 30 nke ọnwa Mee afọ 1967, Louis Mbanefo bụ ọka ikpe ahụ duru Ojukwu n'iyi ọrụ mere ka ọ ghọrọ onyeisi 'ala Biafra'.

Agha dị n'etiti 'Biafra' na Naijiria ruru afọ atọ ma taa isi ndị Igbo karịrị nde atọ, ọtụtụ bụ ndị nwụrụ site n'agụụ.