You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Muhammadu Buhari: Ndị ọrụ nchekwa akpụọla afọ n'ala n'ọrụ ha
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ataala ndị ọrụ nchekwa Naijiria ụta maka ndakpọ nchekwa ọkachasị dịka mwakpo na ntọrọ ndị ekperima a kpọrọ 'bandits' na Bekee na-eme ataala isi ọtụtụ ndị mmadụ.
Buhari kwuru na ndị ọrụ nchekwa akpụọla afọ n'ala n'ọrụ ha nke na ha dịka o kwuru na ha anaghị arụ ọrụ ha etu ha kwesịrị na-agbayeghị nkwado niile ọchịchị ya nyerela ha.
Babagana Munguno bụ onye ndụmọdụ onyeisiala Buhari n'ihe gbasara nchekwa obodo bụ onye gbaara ndị ntaakụkọ ama a ihe Buhari gwara ndị isi ọrụ nchekwa dị iche iche dịka ya na ha nwechara ọgbakọ 'National Security Council' n'ụbọchị Tọzde n'Abuja.
Ọ sịrị na ụta ọnọdụ nchekwa adịghịrị naanị Buhari dịka ọ na-eme ihe niile ọ kwesịrị ime na inye ntuziaka.
O kwuru na obi adịghị onyeisiala Buhari mma maka mwakpo niile a na-eme nke ndị ọrụ nchekwa akwụsilighị.
O kwukwara na obi gbawara ya maka mwakpo ụgbọoloko Abuja-Kaduna ma gwa ndị ọrụ nchekwa ka ha gbapụta ndị niile atọrọ na mwakpo ahụ
Buhari nyere iwu ka ụlọọrụ ndị ọrụ nchekwa dị iche iche zọpụta ndị niile nọ n'aka ndị ntọ ma wulite usoro ga-enye aka inweta ezi nchekwa.
Munguno kọwara na Buhari mma maka etu nchekwa si aga na Naịjirịa.
N'ọnụ ya, "nke kachasị njọ bụ mwakpo mere n'ụgbọ oloko si Abuja gawa Kaduna nke butere ntọrọ ụfọdụ ndị nọ n'ụgbọ oloko ahụ.
Munguno kwuru na etu ihe si kwụrụ ugbua na nchekwa kwesiri ka onye ọbụla jịkọọ aka buso enweghị ezi nchekwa zuru Naịjirịa ahụ.
O kwuru na nsogbu a na-enwe ugbua n'inweta ezi nchekwa na Naịjirịa gụnyere oke ọnụ ego teknụzụ e ji mee nchekwa si agala ọnụ.
Munguno kwuru na gọọmenti na-achọ iji ihe ha mepụtara na nchekwa osimmiri niile dị na Naịjirịa nwalee nchekwa oke ala Naịjirịa.
Ndị oyiegwu egbuola mmadụ iri n'ebe a na-aṅụ mmanya na Yobe Steeti
Ndị otu oyiegwu egbuola opekete mpe mmadụ iri ma merụọ ndị ọzọ ahụ n'ebe a na aṅụ mmanya dị n'obodo Geidam nọ na Yobe steeti.
Ndị bi ebe ya bụ ihe mere na-ekwu na ndị oyiegwu a zoro ezo were bata ya bụ obodo n'abali Wenezde.
Otu onye uweojii kwuru na ndị a bu ụzọ gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ ma gbuo otu nwoke n'ụlo akwụkwo tupu ha a gaa ebe a ana aṅụ mmanya.
Ndị aka ebe na-ekwu na agbagburu ụfọdụ ụmụ nwaanyị ebe ndị ọzọ bụ ndị eyiri mma n'olu.
Amabeghi ndị kpara arụ a kama otu Boko Haram na ISWAP na-enye nsogbu na mpaghara a.
Ndị agha elu egbuola ụmụaka isii na-amaghị ama.
Opekete mpe ụmụaka isii anwụọla dịka dịka ndị agha Naijirịa wakporo obodo Kurebe nke nọ na Naịja Steeti na amghịama.
Ụmụaka a dị afọ ise ruo afọ iri na abụọ gara ikute mmiri mgbe ụgbọelu agha na-aluso ndị omekome ọgụ na mpaghara ahụ gbara ha egbe.
Ndị bi ebe ahụ kwuru na ụfọdụ ụlo meniri na ya bụ mwakpo ndị agha elu mere.
Kurebe bụ obodo nọ n'oke Naịja Steeti na Kaduna.
Anyị agaghịzị anabata mwakpo ụlọorụ ndị uweojii n'ọwụwa anyanwụ - Onyeisi ndị uweojii Naijirịa
Onyeisi ndị uweojii Naijirịa bụ Usman Baba Alkali ekwuola na ha agaghịzị anabata mwakpo ụloọrụ ha ọzọ ọkachasị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naijirịa.
Ọ bụ n'akwụkwo ozi ọnụ na-ekwuchitere ndị uweoji bụ Olumuyiwa Adejobi depụtara ka ha kwuru nkea ma sị na ha enyela iwu nke ga-ewelite ọnụ ọgụgụ ndị uweojii n'ọrụ ha kpọrọ 'Operation Restore Peace' n'ọwụwa anyanwụ Naijirịa.
Ha kwuru sị, "Onyeisi ndị uweojii Naijirịa agaghịzị anabata mwakpo ụloorụ ndị uweojii maọbụ ogbugbu ndị uweojii na-arụ ọrụ n'ihi na ndụ ndị uweojii ọbụla dị anyị oke mkpa. Anyi ga-eji aka ike eso mwakpo ọbụla dịka iwu Naijirịa siri dị".