'Ndị agha Naijirịa wakporo ụfọdụ obodo na Borno steeti' - Amnesty International

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị ụlọọrụ Amnesty International si na nchọpụta ha gosiri na ọ bụ ndị agha Naịjirịa gbara ọtụtụ obodo ọkụ na Borno steeti.

Otu a na-akọwa kwa na ọ bụ kamgbe mwakpo ndị otu Boko Haram kawanyere njọ ka ndị agha Naijirịa bidoro ime otu a.

Onyeisi otu a na Naijirịa bụ Osai Ojigho kwuru sị " ka enyocha ndị agha Naijirịa maka ha ịda iwu na-achikwa ịlụ agha".

Ha kwuru na ihe onyonyo satilịtị gosiri ha na obodo Bukarti, Ngariri na Matiri sọ na obodo ndị agha Naijirịa gbara ọkụ.

Ha na-akọwa na ndị agha na-ebu ụzọ kpọrọ ndị obodo ndị a, kpọga ha n'ogige nchekwa tupu ha agbaa obodo ha ọkụ.

Enwebeghị ihe ndị agha Naijirịa kwuru maka ebubo a ndị otu a boro ha.

Otu Tanka bu mmanụ ụgbọala dara ma gbaa onye na-akwọ ya ọkụ marụọ osote ya ahụ n'ụzọ Ogbaku dị n'Owere Imo Steeti n'ụbọchị Tọzde.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Ikeokwu Godson Orlando sị na ụgbọala a sọbara isi n'etiti blọk e ji kewa ụzọ.

Nke a mere ọdọmmanụ ụgbọala ahụ jiri daa n'ala ma nwuru ọkụ gbagbuo onye na-akwọ ya.

Orlando gara n'ihu kwuo na ọkụ a metụtakwara otu ụgbọala ọzọ mana onweghi onye merụrụ ahụ n'ime ya.

Anya niile dị n'Ụmụaha taa

Obi mgbal elu ji ọtụtụ ndị bi n'Umuahia ugbua dịka a ga-eli Eze na Lọlọ Isreal Kanu bụ nne na nna onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu.

Ndị uweojii kwuru na ha achọghị ịhụ ihe njirimara Ipob ebe ahụ mana Ipob sị na ha ga-awụchi ebe ahụ n'uju.

N'ofesi

Ndị ahuike na Chaịna

Mba Chaịna ekwuola na mmadu otu puku, nari asaa na iri na isii bụ ndị ọrụ na-eleta ndị bu ọrịa Coronavirus a kpọrọ Covid-19 eburula ya bụ ọrịa, ebe madụ isii n'ime ha bụ ndị ya bụ ọrịa dulara mmụọ.

Dịka ọ dị ugbua, mmadụ puku iri isii na anọ na narị itoolu iri abụo na abụo (64,988) bu ya bụ ọrịa, ebe mmadụ puku asaa, otu nari na iri isii na isii (7,166) sị n'ọrịa a pụta.

Ulọọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation ekwuola na coronavirus anaghị amụbawanye na mba ndị ọzọ na-abụghị na Chaina.

Ha sị na ebe ọrịa a kachasị akpa ike bụ na mpaghara Hubei nke Chaịna.

N'egwuregwu

Onye nchịkọta Manchester City bụ Pep Guardiola ekwuola na e nwereike ịchụ ya n'ọrụ maọbụrụ na Real Madrid gbapụ ha n'asọmpi Champions League.

Otu egwu abụọ ndị a ga-adọbiri ya n'ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa Febụwarị a.

Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji:

Ihe nkiri a ga-amasị gị: