You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Fidelis Anosike: Onye ka di Rita Dominic a bụ?
Fidelis Anosike na Rita Dominic gbara akwụkwọ n'Imo steeti n'ụbọchị 19 nke ọnwa Epreelụ 2022, mere ka ndị mmadụ na-achọsi ike ịma onye ọ bụ.
Agbamakwụkwọ ha na-ewu ewu n'ihi na Dominic bụ ome ejije Nollywood a ma ama, ma bụrụkwa onye ndị mmadụ hụrụ n'anya nke ukwuu.
Ịhụnanya a mere ka ndị mmadụ na-agba tọọchị na-achọ ịma onye ọ bụzị nwunye ya si taa gawa n'ihu.
Ihe mere Rita Dominic ji wuwe nso nso a?
N'ọnwa Disemba ka Rita Dominic wepụtara foto onye na-akwado ịlụ ya.
Nke ahụ mere ka ndị mmadụ chọpụta na ọ bụ Fidelis Anosike ma mekwa ọtụtu nọrọ n'elu soshal midia na-eto ya.
Taa bụ Epreelụ 19 ka ya na Fidelis Anosike bụ onye Umueri dị n'Anambra steeti jịkọrọ aka dịka di na nwunye n'ụzọ omenala.
Ọtụtụ ndị na-eme ejije na Nollywood malitere tinyewe foto gosiri na ha awụchiela Imo steeti bụ obodo Rita Dominic ebe a ga-anọ gbaa nkwụ ya.
N'ọnwa Novemba nke afọ 2021 ka ndị mmadụ gụnyere ndị na-eme ejije dugara Dominic akwamozu nne di ya bụ Joy Anosike n'Umueri dị n'okpuruọchịọchị Anambra East.
E mechakwara ndị mmadụ malite kwuwe n'elu soshal midia na ọ dịka Dominic adịla ime maka etu afọ ya si tokopụta n'uwe o yi bia akwamozu nne di ya.
Onye ka Fidelis Anosike bụ?
- Anosike bụ onye Umueri dị n'okpuruọchịchị Anambra East
- Ọ bụ onye hibere otu a kpọrọ Folio Media Group, nke nwezị ụlọntaakụkọ Daily Times Nigeria nke ọ zụtara n'afọ 2005
- Anosike bụkwa onye ọrụ mgbasaozi site na ibipụta ozi n'akwụkwọ nakwa na ịntanetị
- Ọ bụ ya (ụlọọrụ ya) na-eme asọmpi Nwaanyị kacha mma na Naịjiria nke ndị mmadụ ma dịka 'Miss Nigeria'.
- Ọ gara mahadum na University of Benin, ebe ọ nọ nata ọzụzụ na ngalaba 'Creativea and Applied Fine Arts'
- O mekwara OPM Program na mahadum Harvard Business School
- Rita Dominic gbara ya n'anwụ dịka onye ọ na-ayị n'ọnwa Disemba afọ 2020
- Akụkọ na-ekwu na ọ lụbuola nwunye ugboro abụọ n'oge gara ama mana alụmdinanwunye ya na ndị a kụsara nke amaghị ihe kpatara nkụsa a
Onye bụ Rita Dominic?
- Rita Dominic bụ okaibe n'ọrụ ime ejije na ngalaba Nollywood
- Ọ na-arụ ọrụ dịka onye na-emepụta, onye na-ahazị, nakwa onye na-eme ejije
- O so na ndị turu ntụala ọrụ ejije nke ọghara ọhụrụ na Naịjirịa
- Dominic dị afọ 46 dịka a mụrụ ya n'ụbọchị 12 nke ọnwa Jụlaị 1975
- Ọ bụ onye Aboh Mbaise nke Imo steeti
- Ọ natara asambodo onye natazurula ọzụzụ dịka onye ejijie na ngalaba Theatre Arts na mahadum nke Port Harcourt n'afọ 1991
- Ọ mere ihe ejije nke mbụ ya na Nollywood n'afọ 1998 nke a kpọrọ 'A time to Kill'
- Dominic a natala ọtụtụ nturuugo nakwa ihe nrite n'ọrụ ime ejije
- Ọ pụtala n'ihe ejije karịrị 100 dịka ọ nọzị n'ọrụ imepụta ejije ugbua