APC N100million form: Ị chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala Naijirịa n'otu APC, jide otu nde Naira

Otu Pati All Progressive Congress ekwuola na ọ bụ nde otu narị Naira ka ha na-ere akwụkwọ eji egosi mmasị ịnọchite anya otu patị ahụ n'ịzọ ọkwa onyeisiala Naijirịa.

Onye ode akwụkwọ mgbasa ozi pati a bụ Felix Morka kwuru nke a n'ụbọchị wenezde dịka ha mechara nzụkọ ha emere n'Abuja.

Akwụkwọ nhopụta bụ nde iri asaa ebe nke igosipụta mmasị ịzọ ọkwa bụ nde iri atọ.

Onyeisi ụmụ nwaanyị otu a bụ Betta Edu kwuru na ụmụ nwanyị ga-anata akwụkwọ nhọpụta n'efu ebe ha ga-akwụ ụgwọ ịnweta akwụkwọ igosipụta mmasị ha.

Gọọmenti etiti nye anyị N200 billion n'ime N4 trillion ha ji akwụ ụgwọ subsidy- ASUU

Ngalaba Academic Staff Union of Universities ebola gọọmenti etiti ebụbọ ikwe ka nwulite agụmaakwụkwọ na Naịjirịa dakpọọ.

Emmanuel Osodeke kwuputere nke a n'onyonyo Channels tv.

O kwurụ na gọọmenti etiti hapụrụ nwulite mahadum ndị dị na Naịjirịa ma were uche ha niile tinye ego a na-akwụ iji belata ọnụ ego mmanụ ụgbọala.

Osodeke kwuru na onyonyo ahụ na-efegharị n'intanet ugbua na kedụ ka gọọmenti agaghị ewepụtalị ego ruru nde narị naira abụọ (N200 billion) ka ha dozie mahadum nọ Naịjirịa ma mee ka ha bụrụ ọkaibe n'ụwa niile. Mana otu gọọmenti ahụ nwere ike ịkwụ ụgwọ "subsidy" ruru tarị naira anọ. "Fuel subsidy na agụmaakwụkwọ kedụ nke e kwesiri ịka wulite karịa ibe ya"? bụ ajụjụ Osodeke jụrụ.

Osodeke kwuru na o nwere ka ọ dị na ụmụakwụkwọ mahadum nọ n'ụlọ kamgbe izu ụka itoolu.

O kwukwara na ọ na-ewute ya nke ukwuu na agbanyeghị na ha na gọọmenti etiti enwela ọtụtụ nzukọ mana enwebeghị nkwekọrịta ọbụla tọrọ atọ.

Ihe ndị ọzọ ASUU chọrọ n'aka gọọmenti eiti

Onyeisioche ASUU depụtara ihe ngalaba ahụ na-achọ gụnyere nlebanya na nkwekọrịta ASUU na gọọmenti etiti nke 2009 , usoro e si akwụ ndị otu ha ụgwọ, nwulite mahadum dị na Naịjirịa nakwa ihe ndị ọzọ.

Etu anyị si gbochie mwakpo ndị oji egbe n'ụlọọrụ anyị dị n'Ayamelum

Ndị uweojii Anambra Steetị ekwuola na ha gbochiri ndị oji egbe bịara ịwakpo ụlọọrụ ha dị n'Ayamelum, Anaku.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra bụ Tochukwu Ikenga wepụtara ozi a ma sị ndị a bịara n'isi ụtụtụ Wenezde 20 Epreelụ, 2022.

Ọ sị na ndị a malitere gbawa egbe mana ndị uweojii jikwa egbe zaghachị ha oku nke mere ha jiri gbaa ọsọ.

"Dịka ndị oji egbe a na-agba ọsọ, ha mụnyere ọkụ n'ogige ndị uweojii nke metụtara ụgbọala anọ.

Ikenga sị na o nweghi onye uweojii merụrụ ahụ maọbụ onye e gburu dịka ndị ọrụ nchekwa ewerela ọnọdụ n'uju ugbua.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ozi ọbụla pụtara na a ga-eme ka ọha maara.

Awakpoghị m Amber Heard nwunye m - Johnny Depp

Onye na-eme ihe ejije mba Amerịka a ma ama bụ Jonny Depp agbaala akaebe n'ụlọikpe dịka ọ gbara Amber Heard onye bụbu nwunye ya akwụkwọ maka ebubo mmetọ aha ya nke ọ chọrọ nde dọla iri ise.

Ọ bụ dịka Heard boro ya ebubo na Depp na-eti ya ihe n'akukọ ọ dere nke ndị ulọọrụ ntaakụkọ Washington Post depụtara.

Kama Depp na-ekwu na ọ bụghị eziokwu na ọ naghị akpagbu nwunye ya.

Ikpe a abanyela izuụka nke abụọ ya.

Heard gbakwara Depp ikpe nke ya nke ọ sị na ọ chọrọ nde dọla otu narị nke ọ ji zahachi akwụkwọ Depp gbara ya.

Ndị ọkaiwu Heard na-egosipụta Depp dịka onye na-emekpa nwunye ya ahụ ebe ndị ọkaiwu nke Depp na-ekwu na ebubo ya niile bụ asị ma sị na ọ bụ atụmatụ Heard chọrọ iji metọọ aha Depp.

Tinubu na Osinbajo hapụrụ nụ ndị Igbo ọkwa Onyeisiala - Ayo Adebanjo

Onyeisi otu ndi Yoruba a kpọrọ Afenifere bụ Ayo Adebanjo akpọkuola aka chịburu Legọs steeti bụ Bola Tinubu, nakwa osote Onyeisiala bụ Yemi Osinbajo ka ha chefuo maka ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na 2023.

Adebanjo kwuru na o doro ewu na ọkụkọ anya na ọ bụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ka ọkwa onyeisiala ruturu ugbua.

O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ụlọọrụ ntaakụkọ Punch nwere n'ụbọchị Tuzde 19 April, 2022.

Ọ sị na ọ bụ mmegbu ma Olusegun Obasanjo chịchaa afọ asatọ, Osinbajo chịa dịka osote Buhari afọ asatọ, Goodluck Jonathan achịa n'aha ndị mpaghara South South ebe ndị Igbo achịbeghi kpamkpam.

Adebanjo sị kama ihe dị mkpa ugbua bụ ka e buru ụzọ chekwaa Naịjirịa tupu ekwuwe okwu ntuliaka 2023.

Mana ọnụ na-ekwuru otu Afenifere bụ Jare Ajayi gwara BBC na Adebanjo nwere ikike ikwu ihe ọ chọrọ banyere ebe ọkwa onyeisiala ga-ala.

Kama na mkpebi ha na ndịisi mpaghara ọzọ gụnyere Ohanaeze Ndigbo, Pandef na ndị ọzọ nwere bụ ka pati ndị dịka APC na PDP hụ na ha nyere onyei si Ndịda Naịjirịa ọkọlọtọ.

Ọ sị na ha ekwughi kpọmkwem mpaghara Ndịda onye ahụ ga-esi, na o nwereike ịbụ Ọwụwa Anyanwụ maọbụ Ndịda Anyanwụ.

Cheta ndị Ohanaeze Ndigbo nakwa ọtụtụ ndị Igbo na-ekwusi ike na ọ bụ ha ka o ruru ịchị Naịjirịa malite n'afọ 2023.

Ndị uweojii mba Kenya na-esi imi n'ala maka ogbugbu onye ọgba ọsọ ha bụ Damaris Muthee Mutua

Egbuola bụ onye ọgba ọsọ nwaanyị dị afọ 28 nke si mba Kenya n'obodo Iten.

Obodo Iten bụkwa ebe e gburu ogbo ya bụ Agnes Tirop n'ọnwa Ọktọba, 2021

Mutua bụkwa nwaafọ mba Bahrain nke dị na ndịda anyanwụ Asia.

Ndị uweojii mba Kenya na-ekwu na ha na-achọ enyi ya nwoke onye mba Ethiopia achọ ugbua dịka a na-enyo na aka dị n n'ọnwụ nwaada a asụgburu asụgbu.

Ndị uweojii mba Kenya kwuru na ahụrụ ozu nwaada na ndagwurugwu nọ n'obodo Iten ebe ọ nọ na-erekasị.

Di Tirop onye e gburu n'afọ gara aga ka nọ n'aka ndị uweojii dịka a na-enyokwa ya dịka onye aka nọ n'ọnwụ ya bụ nwaada.

Obodo Iten bụ obodo ọdọ egwuregwu ọsọ dịka a na-eme ọtụtụ ọzụzụ banyere nke a ebe ahụ.

Nigerian Airforce Helicopter: Etu ụgbọelu ndịagha Naịjirịa si kpọkasịa na Kaduna

Ụgbọelu Helikọpta ndịagha Naịjirịa akpọkasịala n'ogige ebe a na-azụ ndịagha dị Kaduna Steetị na mgbede ụbọchị Tuzde 19 Epreelụ 2022.

A na-eche na ndị ọkwọ ụgbọelu abụọ nọ n'ime ya nwụrụ anwụ mana o dobeghi anya kpọmkwem mmadụ ole nwụrụ maọbụ ihe kpatara ihe mberede a.

Akụkọ sị na ụgbọelu Helikọpta ahụ bụ nke ndị agha ngalaba '401 flying training school' dị na Kaduna.

Nke a abụghị mbụ ụdịrị ihe na-eme, na nso nso a ụgbọelu ndịagha Naịjirịa akpọkasịala ihe ruru ugboro anọ n'ime otu afọ.

Ha gụnyere nke kpọkasịrị ma gbuo onye bụ onyeisi ndịagha na Naịjirịa n'oge ahụ nakwa ndịagha ndị ọzọ.

Ndịisi ndịagha ewepụtabeghi ozi nyocha ha mere banyere ya.