Chief of Army Staff: Attahiru Ibrahim bụ onyeisi agha Naịjirịa anwụọla na ihe mberede ụgbọelu

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onyeisi ndị agha Naijiria bụ Ibrahim Attahiru anwụola dịka ụgbọelu ndị agha kpọkasịrị na nso ọdọ ụgbọelu Kaduna na mgbede Fraide.

Ọnụ na-ekwuru ndịagha Naijiria bụ Yerima Mohammed gwara BBC na ya bụ akụkọ bụ eziokwu.

Attahiru na mmadụ asatọ ndị ọzọ nwụrụ na ya bụ ihe mberede.

A mabeghị ihe mere mana ndị Agha ugbọelu kwupụtara n'akara Twitter ha na ụgboleu ha nwere ihe mmerede, mana ha ha ekwughị ndị o metụtara.

Ihe i kwesịrị ịma maka Attahiru

Attahiru bụ onye Kaduna Steetị dị na mpaghara ugwu nke Naịjirịa.

Tupu o were ọchịchị ndịagha, ọ bụ onye ndu ndịagha "82nd Infantry Division."

Ọ rụburu ọrụ dịka onyeisi ndịagha na-ebuso ndị Boko Haram agha na Borno State, a kpọrọ 'Operation Lafiya Dole' ruo 2017.

Ụgbọelu ndịagha Naịjirịa kpọkasịrị n'akụkụ ọdọụgbọelu Kaduna Steetị dịka ndịagha ụgbọelu si kwuo.

Ọnụ na-ekwuru ndịagha ụgbọelu bụ Edward Gabkwet kwuru nke na Twitter.

A mabeghi ihe butere ihe mberede a ma ọ bụ mmadụ ole nwụrụ na ya.

Akụkọ ka na-abịa