You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu ndị oji egbe si gbuo ọtụtụ ndị mmadụ n'akwamozu emere n'Anambra steeti
Ọsọ tara n'obodo Ebenebe nke Anambra steeti n'ụbọchị Satọdee dịka ndị oji egbe wakporo akwamozu ebe ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga gbara BBC Igbo ama na ọtụtụ nwụrụ dịka ha enyochapụtabeghi kpọmkwem mmadụ ole ha dị nwụrụ na mkpamkpa a kpara n'obodo Ebenebe, nke dị n'okpuruọchịchị Awka North, Anambra steeti n'ụbọchị Satọdee.
Ka akụkọ si kwuo, ndị oji egbe e kwuru a na-eche bụ ndị otu nzuzo wakporo akwamozu otu nwoke n'obodo ahụ.
E kwuru na ndị a pụtara gbawa egbe aghara aghara ebe ahụ.
Ụfọdụ na-ekwu na ihe ruru mmadụ 20 nwụrụ ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ.
Ka Ikenga si kwuo, "Anyị na-eche na ndị mere ihe a bụ ndị otu nzuzo bịara ibuso ndị iro ha agha"
O gara n'ihu kwuo:
"Nnyocha anyị na-egosi na onye a na-eme akwamozu ya ebe ahụ nwereike ịbụ onye otu nzuzo ọzọ nke bụ onye iro ndị a bịara wakpoo ya bụ akwamozu"
Ikenga kwuru na ha nụrụ ozi mwakpo a n'oge n'ụbọchị Satọdee.
Dịka nke a na-eme, ndị uweojii ekwubeghi mmadụ ole ha nyochapụtarala nwụrụ ebe ahụ ugbua.
Ikenga gwara BBC Igbo na kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Echeng Echeng nụrụ ozi ihe a mere ma zịga ọtụtụ ngalaba ndị uweojii ebe ahụ maka ichekwa udo obodo ahụ.
O kwuru na ọtụtụ ndị otu ha nọ ebe ahụ eme nnyocha ima ka ihe a mere si malite ma weghachite udo ebe ahụ.
O kwukwara na ha na-agba mbọ ịnwụchị ndị mere ihe a ugbua.
Ọtụtụ mwakpoo adapụtala n'Anambra steeti na nso nso a.
Ọnọdụ enweghị nchekwa na-eselite isi ya n'Anambra steeti dịka ọtụtụ steeti ndị ọzọ n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa na-ata ahụhụ n'aka ọtụtụ mwakpoo.
Ndị ọrụ nchekwa na-ebo ebubo na ọ bụ ndị otu nwereonwe nke Indigenous People of Biafra (Ipob) , nakwa ndị otu nchekwa ha bụ 'Eastern Security Network' (ESN) na-akpa ajọ ike a.
Mana ugboro ugboro ka ndị Ipob etiela mkpu na aka ha adịghị na ya.
Nke a bụ izizi na nso nso ndị uweojii na ebo ndị otu nzuzu ebubo maka mwakpo mere mpaghara ahụ.