State Pardon of Dariye and Nyame: Mgbaghara Buhari nyere ha bụ mkparị nye ndị ọkaikpe na Naịjirịa - Wike

Buhari na Wike

Ebe foto si, Femi Adesina na Nyesom Wike

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Gọvernor Nyesom Wike nke Rivers Steetị ekwuola na mgbaghara Onyeisiala Buhari gbara Joshua Dariye na Jolly Nyame ndị bụbu gọvanọ Plateau nakwa Taraba Steetị maka nga a tụrụ ha n'ihi mpụ bụ ime ndị ọkaikpe akaja.

Wike kwuru nke a mgbe ọ gara njem na Minna bụ isiobodo Niger Steetị ka ọ na-akwado ịzọ ọkwa Onyeisiala n'afọ 2023.

Ọ sị na etu ọchịchị Buhari si ebuagha megide mpụ na-emechu Naịjirịa ihu n'anya mbaụwa.

Ọ sị na ọ ghọtaghị etu ọchịchị ya ga-eji họpụta ndị ọ si mere nrụrụaka ego, kpee ha ikpe, tụọ ha nga ma lọghachị bịa tọhapụ ha n'aha mgbaghara.

Wike sị na o chetere nkwa Buhari kwere ndị Naịjirịa na ha ga-ebuagha megide na-eleghi mmadụ ọbụla anya, mpụ mana ugbua ọ le anya n'ihu n'ibuagha megide mpụ.

"Ọ bụ n'ihi ndọrọndọrọ ọchịchị mere e ji tọhapụ ndị a, ha chọrọ ka Dariye na Nyame nyere APC aka na Plateau nakwa Taraba Steetị.

Cheta na a tụrụ Nyame nga afọ iri na abụọ maka izu ego dị otu ijeri naịra na ụma isii (N1.64bn), ebe Dariye bụ nga afọ iri maka ego otu ijeri naịra na ụma abụọ (1.26bn).

Gịnị ka ụlọorụ Onyeisiala kwuru?

Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammdu Buhari

Ebe foto si, Femi Adesina

Na nzgaghachị, Garba Shehu bụ onye enyemaka Buhari sị Wike enweghi ugwu ịkatọ mgbaghara gọọmentị nyere Dariye na Nyame.

N'ozi o wepụtara na Twitter, Shehu sị na a kpọrọ Wike oku maka ọgbakọ ndịisi ọchịchị gọọment bụ ebe e mere mkpebi ahụ mana ọ bịaghị.

"Onye osote bụ Ipalibo Banigo bịara abịa kpanyụrụ igwe okwu na ihe onyonyo, o nweghi onye maara ma ọ nụrụ ihe e kwuru n'ọgbakọ ahụ.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ihe mere gọọmentị etiti ji gbaghara Dariye na Nyame

Joshua Dariye, Muhammadu Buhari na Joshua Facebook

Ebe foto si, Joshua Dariye,Buhari /Joshua Facebook

Akụkọ si n'ụlọọrụ Onyeisiala Buhari kwuru na ihe gọọmentị ji gbaghara mmadụ abụọ a bụ maka na ha agbagotela n'afọ, nakwa maka ahụike ha.

Jolly Nyame dị afọ iri isii na isii ebe Joshua Dariye dị afọ iri isii na anọ.

BBC Igbo enweghị ike ikwu etu ọnọdụ ahụike ha dị.

Kedụ ndị nọ n'otu 'Council of State'?

Otu 'Council of State' bụ otu iwu Naịjirịa hibere maka ịdụ Onyeisiala ọdụ gbasara ọrụ dị mkpa dị icheiche.

Ndị nọ n'otu a gụnyere: Onyeisiala, Osote ya, ndị niile chịburu Naịjirịa (ma ndị agha ma ndị nkịtị), ndị niile bụbu ndị isi ọkaikpe Naịjirịa, ndị isi ụlọ omeiwu ukwu na nke nta, ndị Gọvanọ niile, nakwa ọkaiwu gọọmentị etiti.