Osinachi Autopsy Report: Ihe ndị uweojii kwuru maka mpụtara nyocha ime ahụ ozu Osinachi Nwachukwu

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abuja bụ Josephine Adeh kwuru na mpụtara nyocha ime ahụ e mere ozu otiegwu Osinachi Nwachukwu a pụtala ugbua.

Adeh onye zipụtara ozi a n'ụbọchị Tuzde kwuru:

"Site n'usoro kacha mma nakwa ukpuru nnyocha so ya maka etu otiegwu a ma ama bụ Osinachi siri nwụọ, anyị mere nnyocha ime ahụ n'ozu ya."

"Mpụtara ya apụtala ugbua, anyị ezigarala ya onyeisi ndị na-ahụ maka ikpe ọha maka nnyocha nakwa ka o binye ya aka ma kwuo etu ikpe a ga-esi gaa n'ihu."

Cheta na otiegwu a nwụrụ n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Eprel, ọtụtụ nke gụnyere ezinụlọ ya ekwuola na ọ bụ ntigbu ka etigburu ya dịka a na-atụ di ya bụ Peter Nwachukwu aka n'okwu a.

Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ IGP Usman Alkali Baba kwuru n'ụbọchị itolu nke ọnwa Eprel na ha gakwụrụ ụlọọrụ National Hospital Abuja ka ha mee nyocha akpọrọ 'Post Mortem' na bekee iji chọpụta ihe kpatara ọnwụ Osinachi Nwachukwu bụ otiegwu ụka ama ama nwụrụ na nso nso a.

O kwuru na ha ga-akpụpụ di Osinachi ụlọikpe maọbụrụ na-achọpụta na aka ya dị n'ọnwụ nwunye ya.

Usman Baba kwuru nke a mgbe ọ na-anabata minista na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị bụ Dame Pauline Kedem Tallen na Naịjirịa taa bụ April 20, 2022 n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Abuja.

Ihe ndị ọzọ IGP na Tallen kpara maka ya gụnyere:

  • Imata etu okwu gbasara etu Osinachi Nwachukwu si aga
  • Ihe gbasara ụmunwaanyị nakwa nwoke na-agabiga mmekpa ahụ n'ezinụlọ ha
  • Tallen na ndị ezinụlọ Osinachi so gaa hụ IGP chọkwara ịma mbọ ndị uweojii na-agba ịhụ na e nwetere ikpe ziri ezi n'okwu ọnwa ya.
  • IGP Usman Baba kwuru na di Osinachi Nwachukwu bụ Peter Nwachukwu ka nọ n'aka ụlọ ndị uweojii dị na FCT dịka a ka na-eme nyocha.
  • O kwukwara na ndị uweojii nwuchiri Nwachukwu n'elekere ise nke ụbọchị April 10, 2022 na be ya dị na Lugbe, Abuja.

Nwuchi ahụ na-abịa dịka akụkọ ọnwụ Osinachi e ji "Ekwueme" mara pụtachara n'April 8, 2022 nke mere ka ndị mmadụ bido kwuputewe etu di ya si akpagbu ya mgbe ọ dị ndụ.

Dunamis on Osinachi Nwachukwu: Ihe m ma maka ọnwụ Osinachi Nwachukwu- Paul Enenche

Ụkọchukwu ụlọụka Dunamis International Gospel Centre bụ dọkịta Paul Eneche ekwuola na ọ maghị na di Osinachukwu Nwachukwu na-emekpa ya ahụ.

O kwuru nke a n'ozi o ziputere n'onyonyo o tinyere n'akara Facebook ya taa bụ Eprelu 13, 2022.

Osinachi Nwachukwu e ji "Ekwueme" wee mara nwụrụ n'ụbọchị Eprelu 8, 2022, kamgbe ahụ ndị uweojii anwụchiela di ya bụ Petere Nwachukwu maka ebubo imekpa ya ahụ mgbe ọ dị ndụ.

Ihe Enenche kwuru kpọmkwem

Dọkịta Enenche kwuru n'ime onyonyo o wepụtara taa na ọ bụ mgbe Osinachi Nwachukwu nwụchara ka ọ malitere nụwa na di ya na-emekpa ya ahụ nke ukwuu.

O kwuru na o juru ya anya na ọtụtụ mmadụ ma mana ya amaghị maka ya.

N'ọnụ ya, "Osinachi bụ nnukwu uru baara ụka Christ nakwa agbụrụ a"

O kwuru na Osinachi na di ya gwara ya na ọ na-arịa ọrịa obi n'ọnwa abụọ gara nke mere ka o nyere ha aka nweta ụlọọgwụ ebe ọ ga-anata ọgwụgwọ zuruoke.

Ihe ise mere ndị mmadụ ji achọ ịnụ n'ọnụ ụkọchukwu Paul Enenche gbasara ọnwụ Osinachi Nwachukwu

Ọ ruola ụbọchị ise kamgbe a nụrụ akụkọ maka ọnwụ Osinachi Nwachukwu bụ ọgụ egwu e ji "Ekwueme " wee mara mgbe ọ dị ndụ.

Ọtụtụ mmadụ tụmadị ezinaụlọ Osinachi tinyere ọnụ gbasara akụkọ etu nwaanyị a si nwụọ.

Nke a mere ndị uweojii Naịjirịa ji gaa nwụchie di Osinachi bụ Peter Nwachukwu maka ebubo imekpa Osinachi ahụ.

Mana ugbua, ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ bụ "ihe mere na a nụbeghị pim n'ọnụ ụkọchukwu Dunamis International Gospel Centre bụ dọkịta Paul Enenche bụ ebe Osinachi na di ya na-ekpe tupu ọ nwụọ.

Ụfọdụ na-ekwu na ebe Osinachi bụ otu n'ime ndị ukwu na-agụrụ egwu n'ụlọụka Enenche, na o kwesiri ịpụta kwuo okwu gbasara ọnwụ nwada a.

Cheta na otu n'ime ụmụ Enenche a kpọrọ Deborah Enenche depụtara nwute ya maka ọnwụ Osinachi.

Nke a mere ndị mmadụ ji ajụ ma a ga-ewere okwu Deborah dịka ihe ụlọụka Dunamis nwere ikwu gbasara ọnwụ Nwachukwu.

BBC Igbo akpọọla akara ekwentị nọ n'ọbaozi websaịtị ụlọụka Dunamis ọtụtụ mgbe mana o nweghi onye zara.

Osinachi Nwachukwu na Pastor Paul Enenche gụrụ egwu akpọrọ "Nara Ekele" n'afọ 2018.

Ihe o dere n'akara Instagram ya.

Gọọmentị Naịjirịa aṅụọla iyi inwete ikpe ziri ezi maka ọnwụ ya

Gọọmentị Naịjirịa aṅụọla iyi inwete ikpe ziri ezi maka ọnwụ Osinachi Nwachukwu bụ oti egwu ụka a ma ama.

Minista na-ahụ maka ụmụnwaanyị na Naịjirịa bụ Dame Pauline Tallen ṅụrụ iyi a n'akwụkwọ ozi o wepụtara na Mọnde.

Ọ sị na akụkọ ọnwụ Osinachi kaara ịgafe etu ahụ ma ọ bụghị na kepu kepu banyere mmekpahụ site n'aka di ya bịara pụtara ihe.

Tallen sị na okwu mmekpa ahụ n'ime ezinaụlọ bụ ọrịa ọjọọ e kwesịrị iwepu na Naịjirịa n'ụzọ ọbụla.

Ọ sị na ministri ya ga-agba mbọ hụụ na ọnọdụ a agaghị emetụta ụmụ Osinachi ugbua ma ha too.

Nke a na ka a na-ebo di Osinachi bụ Peter Nwachukwu, nọ n'aka ndị uweojii ugbua ebubo na aka ya dị n'ọnwụ ya.

Etu ndị uweojii si nwụchie di Osinachi Nwachukwu

Ndị uweojii anwụchiela Peter Nwachukwu, di Osinachi Nwachukwu bụ oti egwu ụka ọnwụ ya kpọtụrụ na ngwụcha izuụka make ebubo na aka ya dị n'ọnwụ nwuye ya.

A nwuchiri Nwachukwu n'ụbọchị ụka dịka nwanne Osinachi nke nwoke wegara ndị uweojii mkpesa.

Osinachukwu, onye e jiri egwu ya ' A kpọrọ "Ekwueme" nwụrụ n'ụbọchị Fraide n'ụlọọgwụ a kpọghị aha ka ọ gbachara afọ iri anọ na abụọ (42yrs).

Akụkọ fegharịrị kwuburu na Osinachu nwụrụ site n' ọrịa kansa akpịrị mana nwanne Osinachi nwaanyị bụ Favour Made gwara ụlọorụntaakụkọ Vanguard na ọ bụ ọbara kpụkọrọ n'obi Osinachi site n'ihe di ya kụrụ ya n'obi mere o jiri nwụọ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweoji Abuja bụ Josephine Adeh gwara BBC na ndị ọrụ ha nwuchiri Peter Nwachukwu n'ezie ma sị na nnyocha na-aga n'ihu.

Kemgbe ọ nwụrụ, ọtụtụ maara ya gunyere FranK Edward pụtara na soshal midia were na-akọ etu di ya si akụ ya ihe ma na-emekpa ya nnukwu ahụ n'ụzọ di iche iche.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọnwụ Osinachi Nwachukwu

Kemgbe ọ nwụrụ, ọtụtụ ụmụ Naijiria atụọla arị®ị ọnwụ ya.

Nkechi Blessing, onye ihe ejije Yoroba a ma ma kwụrụ n'ihe onynyo o wepụtara „Ọ ka mma na ị dị ndụ karrịa ịnwụ n'ihi na-gaba ọsọ ihe ndị mmadụ ga-ekwu ma ị hapịgba al.ụkwaghịm."

Pastọ Funke Adejumo,bụ ụkọchukwu nwaanyị a ma ama. „ Kwuru na ọ bụ®ụ na ya matara ihe nwa ada ahụ na-agabi ga na ya kara inye ya ohere ị gbata ọsọ ndụ n'ụlọ ya ruo ọnwa isi ma kwenkwa na ọ ha ahụ isi ya ka nwoke ahụ bụ dị ya taa ahụ dịka ọ dị n'iwu."

Pastọ Sarah Omakwu , onye kwuru na egwu na-akpali akwa n'ọtụtụ ndị mmadụ tụrụ arịrị na e ji ajọ obi na-apụ alaeze Kraisti onynye olu nwaada ahụ.

" Osinachi Nwachukwu anwụghị anwụ, ogbugbu ka e gburu ya"

Ọ dụrụ ụmụnwoke ọdụ ka ha bụrụ gọọmentị ezinaụlọ ha. "Ọ bụrụ na ịchịghị ọfụma, ihe ị na-ekwu bụ na ọ bụ etu Chukwu si achị.:

Etu egwu m si zọpụta otu nwoke n'aka ndị ntọrị - Osinachi Nwachukwu

Dịka ụmụafọ Naịjirịa nakwa ndị ụwa na-ebe akwa maka ọnwụ oti egwu a ma ama bụ Osinachi Nwachukwu, ọ ga-adị mma ka anyị leba anya n'ụfọdụ ihe gbasara ya.

Na mkparịtaụka nwada a na otu ụlọọrụ mgbasaozi bụ Grevmovement nwere n'ọnwa Ọktoba afọ 2021, ọ kọwara etu egwu ya na-aba n'ụmị si zọpụta otu nwoke n'aka ndị ntọrị.

Nwachukwu sị na ọ bụ egwu ya nke ọ kpọrọ 'Ikem' bụ nke mmụọ Chineke tinyere n'ime mgbe ọ gara n'ukwu ekpere.

Ọ sị na ọ bịara tipụta egwu ahụ na o bidoro wuwe nke ọma nke mere otu nwoke ji were ya mere ụda ekwentị ya (ringtone).

N'okwu ya "otu nwoke kpọrọ m n'ekwentị sị m na egwu ahụ bụ 'Ikem' zọpụtara ya n'aka ndị ntọrị na Portharcourt".

"mgbe ndị ntọrị jidere ya, ekwentị ya kụrụ ya bụrụ egwu ahụ na-agụ, ndị ntọrị ahụ jụrụ ya onye nwe olu a? Ọ sị ha na ọ bụ nne ya ukwu n'ime Chineke, ha wee nyaghachị ya ekwentị ya ma sị ya si n'ụgbọala ha rituo".

Nwachukwu gakwara n'ihu kọwaa etu egwu ya si gwọọ onye na-arịa ọrịa ngwa ngwa ọ na-agụ egwu n'otu ọgbakọ ọ gara.

Nwachukwu sị na ọ malitere iti egwu mgbe ọ dị n'obere, n'ụlọụka Christ Apostolic, mecha sonye n'otu egwu a kpọrọ 'Glorious singers'.

Ọ sị na mgbe ọ lụrụ di ya bụ Peter Nwachukwu, ha kwagara Abuja bụ ebe ha malitere ife ofufe n'ụlọụka Dunamis bụ ebe akaraka ya nọ chakee.

Ihe mere aha Osinachi Nwachukwu ji ewu ewu

Aha nwada Osinachi Nwachukwu onye gụrụ 'Ekwueme' na-akpọtụ ebe nIile na soshal midia kemgbe ụbọchị Satọde 9 Eprel, 2022 mgbe akụkọ pụtara na ọ nwụọla.

Hyacinth Ogbu bụ onye nchịkọta egwu otu 'Glorious singers' bụ ebe Osinachi na ejima ya bụ Amarachi Eze malitere iti egwu gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu.

Ogbu sị na ọ bụ ihe mwute nye ndị otu ha nakwa ezinaụlọ Nwachukwu maka akụkọ banyere ọnwụ ya.

Nwachukwu, onye gụrụ egwu ọtụtụ ndị ụka kraịst ma bụ "Ekwueme" bụ onye egwu ya na-amasị ma na-akpalite mmụọ ndị mmadụ n'ụzọ dị iche iche.

Ndị mmadụ na-agba akaebe etu egwu ya si eme ka ha na-echee echiche maka ndụ ha na mmekọrịta ha na Chukwu kere ha.

Ndị maara Nwachukwu kọwara ya ka dịka ezigbo mmadụ nakwa onye ihe gbasara Chineke na-anọ ọkụ n'obi.

Ihe ndị ọzọ i kwesịrị ịma maaka Osinachi Nwachukwu

  • Egwu bụpụtara ya ka ụwa mara ya bụ 'Ekwueme' nke ya na Prospa Ochimana gbakọrọ aka gụọ n'afọ 2019, ọdọ egwu Youtube gosiri na ndị mmadụ e kịrela egwu ahụ ugboro nde iri asaa na otu.
  • Ya na ụkọchukwu Abuja a ma ama bụ Paul Enenche gụkọkwara "Nara Ekele" bụ egwu na-ewu ewu n'ụka
  • Nwaada a na-ejikarị asụsụ Igbo agụ egwu ya dịka ọgụọla ọtụtụ egwu ndị ọzọ gụnyere nke o wepụtara ihe onyonyo ya nsonso a ọ kpọrọ 'Ike mo'
  • Nwachukwu bụ ejima, ejima ya bụ Amarachi Eze na-agụkwa egwu
  • Ọ bụ onye Isuochi dị n'Abia Steetị ma lụọ Peter Osinachi bụ onye Nnewi South dị n'Anambra Steetị.
  • Ha mụtara ụmụ anọ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: