Road Accident: Etu ihe mberede si gbuo ndị ‘sister' Katọlik abụọ na ndị ọzọ n’Anambra

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ihe mberede okporoụzọ ataala isi ndị 'sister' ụka katọlik abụọ na mmadụ atọ ndị ọzọ n'Anambra Steetị.

Nke a mere n'obodo Nawfia dị n'okporoụzọ awara awa si Onitsha gawa Enugwu n'abalị ụbọchị Tuzde.

Ndị 'sister' a gụnyere onyeisi na onye njikọ ego (bursar) nke ụlọakwụkwọ Sekọndịrị Handmaid's dị na'Amansea, Okpuruọchịchị Awka North.

Ụgbọala bus bu ndị 'sister' a na ụgbọala ọkwụ ọtọ ekene Eze bụ otu nwoke na nwunye ya sọkatara isi ma nwuru ọkụ ozugbo.

Ọkụ ahụ gbaburu ndị 'sister' ahụ, ọkwọ ụgbọala ha nakwa di na nwunye ahụ nke mere ya mmadụ ise nwụrụ otu ugboro.

Akụkọ sị na nwoke nọ n'ụgbọala ọzọ ahụ bụ onye ọrụ gọọmentị Anambra Steeti na nwunye ya.

Anya hụrụ ka o si mee sị na o rutere ebe ahụ n'abalị mgbe obere mmiri na-ezo mana ụgbọala ndị ahụ ka na-enwu ọkụ.

BBC Igbo kpọrọ ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ n'Anambra Steetị mana ha azaghị ekwentị ha.

Idemmiri n'ihe oke mmiri ozuzo egbuola mmadụ ruru 40

Idemmiri nke oke mmiri ozuzo butere egbuola ihe ruru mmadụ iri anọ na ise na mpaghara KwaZulu-Natal dị na mba Saụt Afrịka.

Ndị ọrụ gbata gbata sị na a ka na-achọ ọtụtụ mmadụ achọ ebe ha na-agba mbọ ịma ma o nwere ndị fọrọ ndụ.

Ụfọdụ ndị mmadụ nọzi n'elu ụlọ ndị mmiri mebiri na-eche ndị mgbapụta mana naanị otu ụgbọelu helikọpta dị iji buru ndị mmadụ.

Onyeisi obodo eThekwini bụ Mayor Mxolisi Kaunda arịọla ndị bi gburu gburu ebe ahụ mgbaghara maka ọdachi a nakwa ndị gbata gbata na-azaghị oku ha ọsịsọ.

A gwara ndị mmadụ ka ha nọrọ n'ime ụlọ ghara ịpụta ezi ebe a gwara ndị bi na ndagwuru ukwu ka rigote n'ebe ugwu dị.

Ndị ekprima atọrọla ụmụakwụkọ College of Health Science and Technology

Ndị ekperima awakpoola ụlọ ebe obibi ụmụakwụkwọ College of Health Science and Technology dị n'okpuruọchịchị Tsafe nke Zamfara Steetị ma tọrọ ụmụakwụkwọ anọ

Otu onye bi n'obodo ahụ gwara BBC na o mere n'isi ụtụtụ Wenezde mgbe ndị a wakporo ebe ụmụakwụkwọ a ma tọọrọ ụmụnwaanyị atọ dịka ha na ndị nchekwa gbachara egbe.

Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Yusuf Idris Maradun, sị na ọ bụ mmadụ ise ka a tọọrọ mana emechara hapụ otu onye maka mmerụ ahụ o nwere n'ụkwụ.

Ndị uweojii sị na ha na-agbasi mbọ ike ịzọpụta ụmụakwụkwọ ahụ a tọọrọ.

Anya hụrụ ka o si mee sị na ndị abanyenwughi n'ime ụlọakwụkwọ n'ihi ndị ọrụ nchekwa nọ n'ebe ahụ.

Onyeisiala Buhari akatọọla ogbugbu mmadụ 150 na Plateau Steetị

Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari akatọọla mwakpo na ogbugbu ihe karịrị mmadụ otu narị na iri ise n'obodo anọ dị na Plateau Steetị n'ụbọchị Sọnde.

Buhari n'ọzi o wepụtara na Tuzde sị na o kwesighi ka a gbaghara ndị kpara arụ ma kọwaa ha dịka ndị na-eyi ndụ egwu.

Ọ gara n'ihu tie ezinaụlọ ndị e gburu aka n'obi ma nye iwu ka a chọpụta nsị mere nke a.

Ndị oji egbe bucha ọgbatumtum wakporo obodo anọ gụnyere Gyambau, Kukawa, Kyaram na Dungur na Sọnde ma malite ịgba egbe aghara aghara.

Ọtụtụ n'ime ndị a ka a gbara egbe dịka ha na-achọ ịgba ọsọ gbaba n'ime ọhịa.

E liela ọtụtụ n'ime ndị nwụrụ anwụ n'ili e gwuru ọha a kpọrọ mass grave ebe ndị merụrụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ ugbua.

Nke a so n'otu n'ime mwakpo kachasị njọ mere na mpaghara Ukwu na nso nso a kamgbe ndị ekperima na-egbu ma na-atọrọ ndị mmadụ.

Akatọọla gọọmentị Naịjirịa ọtụtụ mgbe maka emeghi ike ha kwesịrị ime iji kwụsị ogbugbu niile ndị ekperima na-eme na mpaghara ahụ.