Moses Ebere, onye mmepụta ejije Nollywood a ma ama alaala mụọ

Otu onye katara ahụ n'imepụta ejije na Nollywood bụ Moses Ebere, anwụọla.

Dịka ogbo ya bụ Sunny Mac Don, si gwa BBC Igbo n'ekwentị, Ebere, onye nwe ụlọọrụ mmepụta ihe ejije a kpọrọ, 'Aim and See Entertainment', nwụrụ abalị abụọ gara aga nke bụ ụbọchị Tuzde.

Macdon gara n'ihu kwuo, " Ọ yaghị ahụ, ọ nabara ụra mana o teteghị."

Ihe ndị i kwesịrị ị ma maka Moses Ebere

  • Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum 'University of Benin'
  • Ihe ejiji ọ hazierela gụnyere 'Spanner Goes to Jail'
  • Ebere bụ onye Abia steeti

Akụkọ ka na-abịa.