Bandits Drone Video: Onyonyo 'drone' gosiri ndị bu egbe nọrọ n'ime ọhịa, ọ bụ na Naịjirịa?

Drone

Ebe foto si, Screenshot

Nnyocha BBC egosila na onyonyo fesara na soshal midia Naịjirịa nke gosiri ndị bucha egbe nọrọ n'ime ọhịa abụghị na Naịjirịa ka ya bụ onyonyo si.

Onyonyo ahụ e si n'elu see gosiri ihe dịka ndị ntorobịa ruru ise n'ọnụ ọgụgụ, jicha akwa uhie uhie kee n'isi ha, buruchaa egbe dịka AK47, na-esi ihe n'ọkụ ha kwanyere n'otu akụkụ.

A hụkwara anụmanụ dịka ehi maọbụ atụrụ ka ha nọ na-akpa nri n'akụkụ ebe ndị ntorobịa ahụ nọ.

Enweghị olu a nụrụ n'onyonyo ahụ nke pụtara na e nweghị ike ịmata asụsụ ndị oji egbe ahụ na-asụ.

Ndị ntoroọbịa ahụ hụkwara 'drone' na-ese onyonyo a, otu n'ime ha mere ka ọ chọrọ iji egbe ya gbatuo 'drone' ahụ.

Ebee ka onyonyo a si?

Oge anyị tulere onyonyo a nke ọma, anyị hụrụ na akwa ụfọdụ ndị oji egbe ahụ yi yitere akwa a na-eyi na mpaghara West Pokot, Samburu, Baringo na Turkana nke mba Kenya.

Mpaghara ndị a bụ ebe ndị oji egbe na-enye nsogbu nke ukwuu ma na-ezukwa ehi ndị mmadụ.

Ndị 'bandit' nke Naịjirịa na-eyikarị uwe yitere nke ndị agha bịakwa were akwa ojii kechie isi na ihu ha.

Ụfọdụ ndị oji egbe a hụrụ n'onyonyo a na-efesa eyighi akwa, ndị ọzọ yikwa akwa ọcha nwere okpu, ụdị nke a na-akpọ 'hoodie' na bekee.

Ọzọkwa, anyị chọpụtara na ndị mbụ tinyere onyonyo a na Facebook bụ ụlọọrụ nchekwa aha ha bụ 'Victory Security Africa Group, n'abalị atọ nke ọnwa Eprel, 2022.

Ha dere na onyonyo ahụ bụ "Ndị ekperima bandit na mpaghara Laikipia".

Laikipia bụ mpaghara dị na mba Kenya.

Ọtụtụ ndị ọzọ kesakwara onyonyo ahụ na soshal midia na mba Kenya.

Kedụ etu onyonyo a si malite ifesa na Naịjirịa?

Onyonyo drone

Ebe foto si, Screenshot

Nkọwa foto, Jackson Ude ewepụla onyonyo a n'akara Twitter ya ma rịọ mgbaghara maka ikesa akụkọ ụgha

Onye mbụ tinyere onyonyo a na soshal midia Naịjirịa bụ nwa amadị a na-akpọ Jackson Ude.

Ndị mmadụ kiriri onyonyo ihe karịrị ugboro puku iri n'akara Twitter Jackson Ude.

Mana Udo mechara wetuo ya bụ onyonyo na Twitter ya, ma rịọ mgbaghara maka ikesa akụkọ ụgha.

Onye ọzọkwa kesara onyonyo ahụ bụ Joe Igbokwe, onye ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama.

Igbokwe kwuru na ọ bụ n'ime ọhịa dị na Naịjirịa ka e sere onyonyo ahụ, ma kwukwaa na ọ bụ ndị ekperima na-atọrọ ndị mmadụ na Naịjirịa.

E kiriela onyonyo ahụ ihe karịrị ugboro puku atọ n'akara Facebook Igbokwe.

Etu ndị oji egbe si akpa ike na mpaghara Ugwu Naịjirịa

Enweghị nchekwa na-akawanye njọ na mpaghara Ugwu Naịjirịa, dịka ndị ekperima na-egbu ma na-atọrọkwa ndị mmadụ kwa ụbọchị.

N'ọdị nso a, Gọvanọ Kaduna Steeti bụ Nasir El-Rufai kwuru na gọọmentị Naịjirịa macha ebe niile ndị ekperima ahụ zoro, mana ndị agha enweghị ike iwakpo ha, iji gbochie igbu ndị nkịtị bụ ndị e ji eji n'ogige ndị ntọ ahụ.

Kaduna so na steeti ebe ndị ekperima 'bandits' kacha akpa ike.

N'izuaka gara aga, ndi ekperima wakporo ụgbọ oloko bu ihe karịrị mmadụ narị atọ si Abuja na-aga Kaduna.

Mmadụ asatọ nwụrụ na mwakpo a ebe ọtụtụ ndị ọzọ ka ndị ekperima ahụ tọọrọ.