Ethiopia's Tigray war: Mekelle - obodo agha kewapụrụ na mba ụwa ndị ọzọ

Ndị mmadụ na-akwụ n'ogologo ahịrị iji dọpụta ego ha n'igwe 'ATM'

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-akwụ n'ogologo ahịrị iji dọpụta ego ha n'igwe 'ATM'

N'izuụka gara aga ka ndị otu abụọ na-alụ agha na mba Ethiopia nwere nkwekọrịta ịkwụsịtụ ọgụ nwa mgbe nta ka e nwee ike ibubata ihe enyemaka na mpaghara Ugwu nke Tigray.

Mpaghara ahụ dịka ndị e kewapụrụ ekawapụ n'ụwa kamgbe afọ 17 nnukwu ọgụ dara ebe ahụ.

Agha a mere ka nde kwuru nde mmadụ nọrọ na-enweghị ihe oriri na ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka.

Otu onye bi na Mekelle, isi obodo Tigray akọorọla BBC etu ndụ dị na mpaghara ahụ.

Inweta ihe oriri kwa ụbọchị bụ nnukwu ihe obi mmapụ nye ọtụtụ ezinụlọ.

"Amụrụ m ụmụ abụọ, ọ na-agbawa m obi na anaghị m enwe ike ileta ezinụlọ m anya nke ọma," nwoke a kwuru.

"Ego m niile tọrọ n'ụlọakụ. ụlọakụ niile emechiela. Ọtụtụ n'ime anyị na-agabiga ihe isi ike a, ego kọrọ ụkọ."

"Kamgbe ọnwa June afọ gara aga, enwebeghị m ike iwepụta ego m dị n'ụlọakụ. Naanị mbibi ego ka m na-ebi."

Iji chekwaa ndụ ha, BBC achọghị ịkpọpụta aha ndị gwara anyị okwu n'akụkọ a.

Short presentational grey line

Ọtụtụ ndị nwere ụmụnne na mba ofesi enweghị ike ịnata enyemaka n'aka ha maka na ekwentị na ịntanetị anaghị agazi.

N'elu ihe ndị a, ọnụ ahịa ngwanri arịala elu nke ukwuu.

N'afọ gara aga ọnụ ahịa otu akpa ihe oriri a na-akpọ 'teff' bụ dọla 80, mana ugbua, a na-ere ya dọla 146.

Ndị ji ego na-azụrụ ya ntakịrị, gwakọọ ya na ntụ ọka iji mee achịcha rie.

Mana ọtụtụ anaghị ahụ ego ha ji azụ ọbụladị ntakịrị 'teff'.

Akị a na-ere ere
Nkọwa foto, N'oge mbụ, ndị mmadụ anaghị ata akị a, mana ugbua ọ bụzi nnukwu nri a na-ere n'ahịa niile

"Anyị amalitela ịkọ akwụkwọ nri ugbua, mana nsogbu anyị na-enwe bụ mmiri," nwoke ahụ gwara BBC.

"Anyị na-azụ mmiri lita narị abụọ kwa izuụka, mana ugbua, anyị enwezighị ego. Anyị na-ekutezi mmiri n'ụmị."

Ịzụ akwa maọbụ akpụkpọ ụkwụ, maọbụ ịzụta anụ tinye na nri bụzi okwu ndị ọgaranya.

Mmiri pọmpụ na ọkụ latrik bụ ụbọchị a hụrụ ya e were.

Ọtụtụ enweghị ọrụ, ụlọahịa niile emechiela maka na ahụzighị ego eji azụ ahịa.

Ndị na-ere mkpụrụ osisi n'ihu ụlọahịa kpọchiri akpọchi
Nkọwa foto, Ọtụtụ ụlọahịa emechiela n'obodo Mekelle, mana ndị mmadụ na-erezi mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri n'ihu ụlọahịa ndị a

N'ihi ihe isi ike ọtụtụ ereela ụgbọala, ọlaedo ha na ihe ndị ọzọ ha ji biri n'ụlọ.

N'oge mbụ, ọnụ ahịa ọlaedo karat iri abụọ na otu bụ dọla 64, mana ugbua, onye chọrọ ire ya ga-ere ya dọla iri na abụọ.

N'ụlọọgwụ, mkpụrụọgwụ na mmiri ọgwụ a na-enye ndị ọrịa adịghị.

Ndị nwere ọrịa siri ike na-anwụ n'ihi na ọgwụ adịghị.

Ndị na-arịa ọrịa HIV na-anata ọgwụ ha na ntụnye na ntụnye.

Emume dị icheiche dịka agbamakwụkwọ bụzị ihe onweghị onye ga-echeta oge ikpeazụ e mere ya.

"Etu m si anụ akụkọ ụwa bụ ma m pụọ n'okporoụzọ na-anụta ihe na-emenụ."

"N'oge ndị ọzọ, ana m agụ akwụkwọ maọbụ mụ na ndị agbatobi m na-akpa nkata."

Mmanụ ụgbọala anaghịkwa ekwe nzụta

"Nwa m nwoke amalitela akwụkwọ ọzọ, ụkwụ ka m ji eduga ya ụlọakwụkwọ kwa ụbọchi."

"Ana m eji ụkwụ aga ihe karịrị kilomita abụọ kwa ụbọchị. Nwunye m na-ejikwa ụkwụ aga edulata ya n'ehihie."

"Ana m ejibu ụgbọala m ebuga ya akwụkwọ, mana ugbua, ụgbọala m apụbeghị ezi kamgbe ọnwa iri na asatọ, maka na mmanụ ụgbọala adịghị."

"Otu lita mmanụ ụgbọala ugbua bụzi dọla iri. Tupu agha amalite, o rughị otu dọla."

Ndị mmadụ na-ejizi ịnyịnya igwe eme njem maka ọ ka dị ọnụ ala."

Ịnyịnya igwe
Nkọwa foto, Ịnyịnya igwe dị ka nke a ka ndị mmadụ na-eji emezi njem ugbua.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-ejizi igwe 'bicycle' eme njem ugbua, mana nke ahụ n'onwe ya agalakwaala ọnụ.

Ndị bi na mpaghara a chọrọ ka agha a kwụsị n'oge adịghị anya.

Obi aṅụrị ka ha ji nabata ozi pụtara n'izuụka gara aga nke kwuru ka a kwụsịtụ ịlụ ọgụ.

Ndị mmadụ ahụbeghị ihe ọbụla dị iche ugbua, mana akụkọ kwuru na ụgbọala bu ihe enyemaka nọ n'ụzọ na-abịa.

"Obi dị m mma na adị m ndụ were ọnụ m na-akọ akụkọ a, mana ama m na e nwere ndị ọnọdụ ha ka nke m njọ," nwoke ahụ kwuru.

Mana otu ihe ọma dị ebe a bụ na ndị mmadụ na-enyerịtara onwe ha aka.

Asụsụ Tigrinya nwere okwu a na-ekwu sị: "Onye rie naanị ya, ọ nwụọ naanị ya."

Ndị mmadụ na-agbaso ya bụ okwu nke ọma.

Map

(to reversion this map go to https://idt2.live.tools.bbc.co.uk/ and find Ethiopia map (WS Languages) - duplicate this, translate, and copy the include path when you publish)

We have not named the resident for safety reasons.

1px transparent line