Etu ọkụ si gbagbuo nwaanyị na ụmụ ya atọ n'Ebonyi steeti

Aha onyonyo, Etu ọkụ si gbagbuo nwaanyị na ụmụ ya atọ n'Ebonyi steeti

Ndị obodo Aguabata Echara, dị n'okpuruọchịchị Ikwo n'Ebonyi steeti, gwara BBC Igbo etu ọkụ si gbagbuo otu nwaanyị na ụmụ ya atọ.

Otu onye obodo ahụ gwara BBC Igbo na nwaanyị ahụ anaghị ekwu okwu, ọ naghị anụ ntị.

O kwukwara na nwaanyị ahụ abụghị onye obodo ahụ, mana ya na ezinaụlọ ya bi ebe ahụ.

Ndị obodo ahụ kwuru na ụmụ atọ ahụ ọkụ gbagburu ka bụ ụmụaka na-erubeghi afọ isii.

Mazi Onuobu bụ di nwaanyị a nakwa nna ụmụ atọ ahụ ọkụ gbagburu, kwuru na ọ nọ ebe ọ gara akwamozu mgbe e ziteere ya ozi na ụlọ ya agbaala ọkụ.

O kwuru na ọ bụ ozu ezinaụlọ ya ka ọ zutere mgbe ọ lọtara.

Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ọ bụ di nwaanyị a bịara mee mkpesa ka ọ lọtakwuru ozu ezinaụlọ ya.

O kwukwara na ndị uweojii anwụchiela mmadụ abụọ ha na-enyo maka ịmụnye ọkụ a, ma kwuo na ha ka na-eme nnyocha ịma etu ihe mere si mee.