Etu m si hụ ozu di m ka ọ na-agba ọbara - Nwaanyị sị na e gburu di ya n'Imo steeti

Aha onyonyo, Etu m si hụ ozu di m ka ọ na-agba ọbara - Nwaanyị sị na e gburu di ya n'Imo steeti

Sabina Njokuji lụrụ di ya bụ Augustine Njokuji n'afọ iri abụọ gara aga, ha mụrụ ụmụ asaa.

Ha bụ ndị Amaraku, nke dị n'okpuruọchịchị Nwangele n'imo steeti.

N'ubochi Sọnde, abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Febrụwarị, njiji jiri n'ezinụlọ ha dịka di Sabina, bụ Augustine, lara mmụọ n'ike.

Sabina kwuru na o nyechara di ya nri abalị wee gaa na nke onye agbataobi ha iweta ihe, mana oge ọ na-alọta ka ọ hụrụ ebe ndị mmadụ bu di ya na-agbaga ụlọ ọgwụ.

Ndị obodo boro ebubo na ọ bụ nwanne di ya, aha ya bụ Ohaleta, ji mma gbuo di ya n'isi oge o dina n'ime ụlọ ya na-arahụ ụra.

Akụkọ kwuru na ụmụnne abụọ ahụ na-enwe nghọtahie n'ihi okwu gbasara ala.

Oge ndị mmadụ chọpụtara ihe a merenụ, ha jichiri Ohalete ma kpụga ya n'isi ụlọọrụ ndị uweojii n"Owere Imo State.

Ndị uweojii sị na ha amalite na nnyocha iji mata nke bụ eziokwu.

Mana Sabina Njokuji sị na ihe ọ chọrọ bụ ka onye a gburu di ya bịa lie ya ma zụwakwa ụmụ asaa ha mụrụ.