Etu m si hụ ozu di m ka ọ na-agba ọbara - Nwaanyị sị na e gburu di ya n'Imo steeti
Sabina Njokuji lụrụ di ya bụ Augustine Njokuji n'afọ iri abụọ gara aga, ha mụrụ ụmụ asaa.
Ha bụ ndị Amaraku, nke dị n'okpuruọchịchị Nwangele n'imo steeti.
N'ubochi Sọnde, abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Febrụwarị, njiji jiri n'ezinụlọ ha dịka di Sabina, bụ Augustine, lara mmụọ n'ike.
- A chọtala ngwongwo ọrụ Ijeoma Neke n'aka ụmụnne abụọ a na-enyo maka ogbugbu ya
- Drug abuse: 'A kụgbụrụ nwa m maka ebubo mkpụrụmmiri' - Onye e gburu nwa ya
- Nwoke a na-ebo ebubo igbu ma gbaa nwanne ya ọkụ maka esemokwu ala
- Etu nwa m si gbanahụ ọnwụ n'aka 'onye chọrọ iji ya agwọ ọgwụ ego' - Ken Ekwus
- Lee nwoke ndị uweojii na-enyo maka igbu ụmụ ya atọ n'Enugu steeti
Sabina kwuru na o nyechara di ya nri abalị wee gaa na nke onye agbataobi ha iweta ihe, mana oge ọ na-alọta ka ọ hụrụ ebe ndị mmadụ bu di ya na-agbaga ụlọ ọgwụ.
Ndị obodo boro ebubo na ọ bụ nwanne di ya, aha ya bụ Ohaleta, ji mma gbuo di ya n'isi oge o dina n'ime ụlọ ya na-arahụ ụra.
Akụkọ kwuru na ụmụnne abụọ ahụ na-enwe nghọtahie n'ihi okwu gbasara ala.
Oge ndị mmadụ chọpụtara ihe a merenụ, ha jichiri Ohalete ma kpụga ya n'isi ụlọọrụ ndị uweojii n"Owere Imo State.
Ndị uweojii sị na ha amalite na nnyocha iji mata nke bụ eziokwu.
Mana Sabina Njokuji sị na ihe ọ chọrọ bụ ka onye a gburu di ya bịa lie ya ma zụwakwa ụmụ asaa ha mụrụ.