Chukwuemeka na Chinyere Odunukwe: Etu di na nwunye ji otu nwa na-erubeghi otu afọ si laa mmụọ

Aha onyonyo, Etu di na nwunye ji otu nwa na-erubeghi otu afọ si laa mmụọ

Akụkọ Chukwuemeka Odunukwe na nwunye ya bụ Chinenye Odunukwe ji nwa na-erubeghi otu afọ ma nwụọ n'afọ 2021 wuru ewu na nso nso a.

Nna Chukwuemeka bụ Mary Odunukwu kwuru na ahụ malitere ime nwa ya ka afọ isii gachara mgbe o mechara agbamakwụkwọ ya.

O kwuru na ebughariri nwa ya Chukwuemeka onye dị afọ 27 gaa ọtụtụ ụlọọgwụ ebe a na-achọ ọgwụgwụ ọrịa ji ya mana enweghi nke chịtara aja nke mere na o mechara laa mmụọ m'ọnwa Febụwarị 2021.

Nna Chukwuemeka kwukwara na mgbe ihe a mechara, ha chọpụtara na nwunye ya dị ime.

O kwuru na ha abụọ bịkọ n'Ọnịcha ebe ọ nọ mmụọ nwa ya n'udo.

N'okwu ya, ọ sị: "Ka ọnwa atọ gachara mgbe ọ mụrụ nwa ya o bịara daa ahụ ọkụ"

O gara bee nna ya ka eledo ya anya, ebe ahụ ka ọ nọ laa mmụọ ma hapụ nwa ya na-erubeghi otu afọ n'ụwa a,

Nne Chukwuemeka bụ Mary Odunukwu gwara BBC na e liri nwa ya nwoke ngwa ngwa maka etu o si nwụọ mana emeghi akwamuozu ya dịka ọ kwesiri.

A emere akwamuozu ha abụọ n'ụbọchị Satọdee bụ ụbọchị 19 Febụwarị, 2022.

Akụko ọnwụ ha gbawara ọtụtụ obi n'ihi ha ka malitere alụmdinanwuye ma bụrụkwa ndị ntorobịa tupu ọnwụ egbuchịe ha n'afọ 2021.

Ihe a mere n'obodo Nnobi, dị na okpuruọchịchị Idemili South nke Anambra steeti.

Nne Chukwuemeka ji obi mgbawa gwaa BBC na ha ebugaghi ozu ha abụọ gaa ụlọọgwụ maka nnyocha ime ahụ n'ihi ha ahapụrụla Chukwu ikpe ọnwụ ha.

Ihe mere akwamuozu ji dị mkpa n'ala Igbo

Igbo kwenyere na ikwanyere mmadụ ugwu dịka onye ahụ na-agafee ala mmụọ.

Akwamuozu bụ ụzọ ndị mmadụ, ọkachasi ndị ezinaụlọ, agbataobi nakwa ndị enyi onye nwụrụ ji egosi ya nwanye ugwu ruru ya.

Ọtụtụ ebe n'ala Igbo na-akwa ozu n'ụzọ dị ịcheịche mana ala Igbo niile na-akwanyere ozu ndị nke ha ugwu.

Agbanyeghi na eliela mmadụ, maọbụ mgbe ahụghi ozu onye nwụrụ, emume akwamuozu bụ omenala a na-emere onye ọbụla larala mmụọ iji dokwa mmkpụrụobi ya ma hụ na onye ahụ gafere ala mmụọ n'udo.

Emume akwamuozu na-enyekwa ezinụlọ, agbataobi nakwa ndị enyi onye nwụrụ ohere ifere ya aka nke ikpeazụ nakwa inye ya nkwanye ugwu maọbụ mkpesa nke ikpeazụ tupu onye ahụ agafee ala mmụọ.