Taxing the dead: Akwamozu nwunye m riri m ihe karịrị nde naịra abụọ (N2,000,000)

Aha onyonyo, Taxing the dead: Akwamozu n'ala Igbo ọ bụ ịda ndị nwụrụ anwụ nha?

Akwamozu n'Ọwụwa Anyanwụ nke Naịjirịa bụ nnukwu mmemme metụtara omenala.

Ọ na-abụ mmadụ nwụọ, a na-akwadosi ike etu a ga-esi lie ya.

Ọtụtụ ndị ntoroọbịa n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa na-eti mkpu maka etu e si ada ozu ndi metụtara ha nha ma na-asị ha kwuo nke a, kwụọ nke ọzọ.

Mathew gwara BBC Igbo etu ụlọ ụka jiri gbochie ya ili nwunye ya makana ọ kwụghị otu narị naira a sị ya kwụọ n'isi ya.

Akụkọ jụrụ ndị isi ụka nakwa ndị ọchịchị omenala maka atụmatu a.

Ọ bu ihe ha kwuru dị n'ime akụkọ a.