Tribalism in Nigeria: Kedụ ihe iwu kwuru banyere ịkpa oke agbụrụ?

Ebe foto si, Getty Images
N'ọnwa Febụwarị 2022, akụkọ pụtara na soshal midia na otu onye uweojii n'Adamawa steeti kpasara otu onye Igbo agwa gosiri ịkpa oke agbụrụ.
Ka akụkọ ebubo a si kwuo, onye uweojii ahụ gwara onye Igbo ahụ chọrọ ịrụ ụlọ n'akụkụ be ya sị: "Achọghị m ka ị bụrụ onye agbataobi m, a chọghị m ka onye si Ọwụwa Anyanwụ biri m nso."
Akụkọ kwuru na kọmịshọna uweojii n'Adamawa steeti bụ Mohammed Ahmed Barde ehiwela otu nnyocha ịmata ma ihe a o mere n'ezie.
Okwu ebubo ịkpa oke agbụrụ bụ ihe ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ na nso nso nke mere na ọtụtụ ndị nakwa otu na Naịjirịa ekwuola na a na-emegbu ha ebe ụfọdụ kwuru na Naịjirịa na-akpagbu ha.
N'ihi ya, ọtụtụ apụtala kwuo na ha chọrọ nnwereonwe n'aka Naịjirịa ma sị na a na-emegbu ha.
Ụfọdụ otu ndị a gụnyere Indigenous People of Biafra (Ipob) chọrọ nwereonwe ndị Igbo, nakwa otu "Yoruba Nation" chọrọ nwereonwe ndị Yoruba.
Ọtụtụ n'ime ha na-eti mkpu mmegbu na Naịjirịa ma sị na a na-akpasị ha oke agbụrụ n'ụzọ dị iche iche.

Ebe foto si, Getty Images
Kedụ ihe iwu Naịjirịa kwuru maka ịkpọoke agbụrụ?
Otu onye ọkaiwu bụ Jake Effoduh gwara BBC Igbo na iwu Naịjirịa megidere mmadụ ịkpasị ibe ya oke agbụrụ n'ụzọ ọbụla gụnyere ụdịdị ya, akwa ya, ebe a mụrụ ya, okpukperechi dgz
Ọ sị na akwụkwọ iwu Naịjirịa akara "Section 42" depụtara ihe ndị megidere ikike dịịrị onye nke metụtara ịkpa oke.
Ọkaiwu ọzọ bụ Uchechi Ezenyirioha sị na ihe siri ike n'okwu a bụ na ọ naghị adị mfe ịkpụpụ mmadụ ụlọikpe maka ebubo ịkpa oke agbụrụ bụ nke a kpọrọ "non justiciable rights" n'akwụkwọ iwu.
Ọ gara n'ihu kwuo na naanị ma onye akpasịrị agwaa gosi ihe akaebe gbara ọkpụrụkpụ ga-enye aka iji nwuchie onye kpasịrị ya oke agbụrụ.
Ezenyirioha sị na ihe akaebe ahụ nwereike ịbụ ihe onyonyo, akwụkwọ ozi, olu okwu e tinyere n'ekwentị dgz.
Ọ sị na agbanyeghi na iwu akwadochaghị ịkpụpụ mmadụ ụlọikpe maka ya mana ụlọikpe pụrụiche bụ 'industrial court' na-eleba anya n'ebubo ịkpa oke agbụrụ.

Ebe foto si, Getty Images
Ọmụmaatụ ndị e borola ebubo ịkpa oke agbụrụ
E nweela ọtụtụ mgbe a boro ndị nọ n'ọchịchị ma ndị nkịtị ebubo maka ịkpa oke agbụrụ, ụfọdụ ha gụnyere;
- Cheta na Twitter wepụrụ ozi Onyeisiala Buhari nke o zipụtara n'akara Twitter ya n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Juun, 2021. Otutu boro ebubo na ozi ahụ gosiri ịkpa oke nye ndị Igbo.Ya bụ ozi dere "Ndị na-ebute ọgbaghara bụ ndị ntorobịa na-amaghi ihe anyị gabigara n'oge agha Bịafra..."Anyị ga-egosị ha ihe ha na-achọ ọkachasị n'asụsụ ha ga-aghọta."Twitter kwuru na ozi ahụ megidere iwu ụlọọrụ ha nke mere ha ji wepụ ya.
- Ndị mmadụ boro ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami ebubo ịkpa oke agbụrụ maka ihe o kwuru na mkparịtaụka ya na Channels TV n'ọnwa Mee 2021.Malami kwuru sị: "Mmach ịchị ehi na ndịda Naịjirịa dị ka ndị gọvanọ mpagha Ugwu ịjịkọ aka ọnụ machịe ịzụ ahịa akụrụngwa ụgbọla bụ "spare parts"..Ndị mmadụ kwuru na ọ bụ ndị Igbo ka Malami na-atụfere okwu, n'ihi na ọ bụ ndị Igbo ka e ji azụmahịa "Spare Parts" mara n'Ugwu.
- N'afọ 2015, Eze odinala nke Legos bụ Oba Babatunde Akiolu, kwuru okwu gbasara ntuliaka ọkwa gọvanọ nke afọ ahụ.O kwuru sị: "Aṅụọ m iyi n'aha Chukwu, onye ọbụla n'ime ụnụ na-atụnyeghiri Ambode vootu ka ọ bụrụ Gọvanọ Legos steeti ga-ala n'ime osimiri a; mmiri ga-eri ya".Akiolu kwuru nke a dịka ụfọdụ ndị ndu Igbo gara leta ya n'obi ya, nke a mere ka ọtụtụ mmadụ katọọ ya.

Ebe foto si, Getty Images
Ịkpa oke agbụrụ na Naịjirịa
Agbụrụ nọ na Naịjirịa ruru narị atọ ebe enwere asụsụ ruru narị ise na Naịjirịa, dịka ụfọdụ nnyocha si gosi.
Iji belata ịkpa oke agbụrụ, gọọmentị Naịjirịa tinyere iwu a na-akpọ 'Federal Character'.
Dịka iwu a si dị, ụlọọrụ niile dị mkpa na gọọmentị Naịjirịa ga-enwerịrị ndịọrụ si na mpaghara nakwa agbụrụ dị icheiche na Naịjirịa.
Ọkwa dị elu na gọọmentị ga-enwekwa ndị si mpaghara dị icheiche ga-anọ na ha.
Ngalaba e hibere iji hazie nke a ka a na-akpọ 'Federal Character Commission".
Mana ọtụtụ na-ekwu na ịkpa oke agbụrụ ka na-arịkwa elu na Naịjirịa n'agbanyeghị atụmatụ ndị a e tinyere iji gbochie maọbụ belata ya.












