Boko Haram Financiers: Etu gọọmentị si chọpụta ụlọọrụ 123 na-ebunye ha ikputu ego - Lai Mohammed

Gọọmentị Naịjirịa sị ha achọpụtala ụlọọrụ dị otu narị iri abụọ na atọ na mmadụ iri itoolu na isii na-ebunye ndị Boko Haram ikputu ego ha ji akpa ikena Naịjirịa.

Minista mgbasaozi bụ Lai Mohammed wepụtara ozi a na Tọzde mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja.

Mohammed sị na a nwụchiela mmadụ iri anọ na ise a na-enyo na ha na ji ego akwado iyi ndụ egwu, na a kpụpụla ha n'ụlọikpe.

Ọ sị na a chọpụtara ụlọọrụ na mmadụ ndị a site na nyocha ngalaba Nigerian Financial Intelligent Unit e mere malite n'afọ 2020 ruo 2021.

Ọ sị na ngalaba a nwere ihe akaebe banyere ndị Boko Haram, ISWAP, ndị ekperima, ndị ntọrị nakwa ndị ọzọ na-eyi ndụ egwu.

N'afọ gara aga, otu United Nation sị na ịkwado otu na-eyi egwu bụ ezigbote nsogbu nye nchekwa na Naịjirịa.

Dịka gọọmentị ji ndịagha na ndị nchekwa ebuso iyi ndụ egwu agha mana ugbua ọ malitela iji ngalaba na-ahụ maka nchịkọta ego iji nye aka n'agha a.

N'ọnwa gara aga ngalaba Nigerian Securities and Exchange Commission na-ahụ maka mgbanwe ego igwe nyere iwu ka e nyochaa ndị ahịa ha niile iji mara ndị na-akwado iyi ndụ egwu.