Boko Haram Financiers: Etu gọọmentị si chọpụta ụlọọrụ 123 na-ebunye ha ikputu ego - Lai Mohammed

Minista mgbasaozi Lai Mohammed

Ebe foto si, Lai Mohammed

Gọọmentị Naịjirịa sị ha achọpụtala ụlọọrụ dị otu narị iri abụọ na atọ na mmadụ iri itoolu na isii na-ebunye ndị Boko Haram ikputu ego ha ji akpa ikena Naịjirịa.

Minista mgbasaozi bụ Lai Mohammed wepụtara ozi a na Tọzde mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja.

Mohammed sị na a nwụchiela mmadụ iri anọ na ise a na-enyo na ha na ji ego akwado iyi ndụ egwu, na a kpụpụla ha n'ụlọikpe.

Ọ sị na a chọpụtara ụlọọrụ na mmadụ ndị a site na nyocha ngalaba Nigerian Financial Intelligent Unit e mere malite n'afọ 2020 ruo 2021.

Ọ sị na ngalaba a nwere ihe akaebe banyere ndị Boko Haram, ISWAP, ndị ekperima, ndị ntọrị nakwa ndị ọzọ na-eyi ndụ egwu.

N'afọ gara aga, otu United Nation sị na ịkwado otu na-eyi egwu bụ ezigbote nsogbu nye nchekwa na Naịjirịa.

Dịka gọọmentị ji ndịagha na ndị nchekwa ebuso iyi ndụ egwu agha mana ugbua ọ malitela iji ngalaba na-ahụ maka nchịkọta ego iji nye aka n'agha a.

N'ọnwa gara aga ngalaba Nigerian Securities and Exchange Commission na-ahụ maka mgbanwe ego igwe nyere iwu ka e nyochaa ndị ahịa ha niile iji mara ndị na-akwado iyi ndụ egwu.