Debunking Fake News: Onyeisiala Muhammadu Buhari emepere 'Pyramid' osikapa na-achịtaghị aja?

Ọgogo Osikapa

Foto akpa osikapa n'elu ibe ya e ji rụọ ugwu 'Pyramid' na-efeghari na soshal midia na-ekwu na Onyeisiala Muhammadu Buhari mepere ebe ugwu 'Pyramid' na-achitaghi aja.

Nnyocha ngalaba BBC na-ahụ maka isi imi n'ala sipụta akụkọ ugha na Naịjirịa bụ "BBC Disinformation Unit" gosiri na akụkọ a bụ akụkọ ugha.

Foto a na-efeghari nke gosiri akpa n'elu akpa osikapa edobere n'elụ nkụ osisi abụghị nke Onyeisiala Muhammadu Buhari mepere na nso nso n'Abuja a kama ọ bụ foto si na owuwe ihe ubi e mere na Ogun Steeti n'afọ 2018.

Nnyocha gosiri na ya bụ foto pụtara n'oge mbụ na websait Nairaland n'ọnwa Jenụwarị 2018, kamgbe ahụ, ndị mmadụ ekesala ya kwa mgbe kwa mgbe.

Ogogo Osikapa

Nfegharị ọhụrụ dị ka ọ bụ atụmatụ ụfọdụ ndị mmadụ ịmetọ akụkọ ugwu 'Pyramid' osikapa si na owuwe ihe ubi Onyeisiala Buhari mepere n'Abuja.

Cheta na owuwe ihe ubi a bụ nke so atụmatụ gọọmentị etiti na ụlọakụ etiti akpọrọ "Anchor Borrower Programme of the Central Bank of Nigeria".

Ka o si dị, ọ bụ mgbe onye enyemaka Onyeisiala Buhari bụ Lauretta Onochie zipụtara ozi iti aka n'obi maka ya bụ na owuwe ihe ubi Onyeisiala Buhari mepere n'Abuja nye Onyeisiala mgbe ahụ ka ụfọdụ ndị mmadụ malitere kesawa akụkọ ugha a.

Ogogo Osikapa

Kedụ ihe bụ eziokwu ugbua? •Nnyocha ngalaba "BBC Disinformation Unit" gosiri na ugwu akpa osikapa a si owuwe ihe ubi emepere n'Abuja anọghị n'elu nkụ osisi mana edobere ya n'elu ihe Bekee kpọrọ "waterproof material".

•Ị lezịe anya nke ọma, ị ga ahụ na foto abụọ ahụ si Abuja na nke si Ogun steeti abụghị otu abanyeghi na ha yiri onwe ha.

•Ugwu 'Pyramid' si owuwe ihe ubi nke Ogun Steeti pekarịrị nke Abuja na mpe dịka foto nke Abuja si gosi.

•I ji gba ama ihe bụ eziokwu, onye enyemaka Onyeisiala Buhari bụ Lauretta Anochie zipụtara n'akara Facebook ya, foto na ihe onyonyo gosiri mgbe amalitere ọrụ na nke Abuja na etu o si gaa.

•Nnyocha e mere n'ebe nke Abuja gosiri na ihe nọ n'ime akpa osikapa ndị ahụ abụghị aja nakwa akpụkpọ azụ osikapa dịka akụkọ na-efeghari si kwuo kama ọ bụ osikapa agbachabeghi agbacha.

•Onyeisi Rice Farmers Association (RIFAN) bụ otu ndị ọrụ ugbo na-akọ osikapa na Naịjirịa, aha ya bụ Aminu Goronyo gwara BBC na e ji ọnwa atọ rụọ ya bụ ugwu 'Pyramid' nke Abuja .

•Atụmatụ "Anchor Borrowers Programme" si n'aka gọọmentị etiti na ụlọakụ gọọmentị bụ CBN n'ịchafụ i ji nyere ndị na-akọ ugbo nta aka ma belata mbubata nri ma wulite ọkụkọ ugbo .

•Gọọmentị na-ekwu na ugwu 'Pyramid' a bụ nke kacha ibu na Naịjirịa niile ma kwukwa na ọkụkọ ugbo osikapa amụbawanyela ugbua na Naịjirịa ọ kachasi kamgbe Onyeisiala Buhari banyere ọchịchị n'afọ 2015.

Ogogo Osikapa