Adeyinka Godson Jailed: Ihe Uche Mefor kwuru maka nwa amadị a Briten tụrụ mkpọrọ maka ikwu okwu asị megide ndị Igbo

Uche Mefor na Adeyinka Grandson

Ebe foto si, Uche Mefor/Adeyinka Grandson/Facebook

Nkọwa foto, Uche Mefor na Adeyinka Grandson
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Uche Mefor, bụbu osote onyeisi otu Indigenous People of Biafra (Ipob), ekwuola etu obi dị ya maka mkpọrọ ụlọikpe mba Briten tụrụ Adeyinka Godson maka okwu ịkpa oke agbụrụ megide ndị Igbo.

N'ụbọchị Eprel 1 ka a mara Adeyinka Shoyemi, e ji 'Adeyinka Grandson' mara, ikpe, ma tụọ ya nga afọ anọ na okara maka ozi ịkpa oke nke ha kwuru nwereike ikpalite ọghaghara na Naịjịrịa.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'ụbọchị Satọdee, Mefor kwuru na ọ bụ ụdị okwu ịkpọ asị a mere ya ji si na IPOB pụọ.

O kwuru na ya anaghị enwe aṅụrị na Adeyinka Grandson ga-ata ahụhụ n'ụlọikpe, "mana nke bụ eziokwu bụ na agaghị m akwado onye maọbụ otu ọbụla ịgbasa ozi nwereike ikpalite ọgbaghara nke nwereike ibute mmerụ ahụ, ọnwụ, nakwa mmebi akụnụba.

"Okwu nkiti anaghị egbu mmadụ mana ozi ịkpa oke nke na-ekwu ka egbuo mmadụ maọbụ merụọ mmadụ ahụ, agaghị m akwado ya," Mefor Kwuru.

"Mmadụ nwereike iji iwe kwuo okwu ọjọọ megide onye ọzọ, maọbụ saa onye na-ekwu okwu ọjọọ megidi ya, mana iji iwe ahụ tụọ aka ka akwafuo ọbara bụ nke m agaghị akwudoro"

"Ndị na-ezipụ ụdị ozi a na-etinyekarị ọtụtụ akụkọ ụgha n'okwu ha iji kpalite mmụọ ndị mmadụ, nke a bụ ihe ndị otu Ipob na-eme ugbua."

Mefor kwuru na ọ ma na mkpebị ọbụla ụlọikpe mba Briten mere n'isi Adeyinka Godson bụ nke ziri ezi ma bụrụkwa nke kwesịrị ekwesị maka ozi ịkpa oke agbụrụ ndị o zipuru n'oge gara aga.

Ihe mere mba Briten ji tụọ Adeyinka Grandson nga

Adeyinka Grandson

Ebe foto si, Adeyinka Grandson/Facebook

Ọ bụ ndị mmadụ kpesara Adeyinka Shoyemi, e ji "Adeyinka Grandson" mara, n'aka ndị uweojii na mba Briten.

Nke a bụ n'ihi na nwa amadị ahụ mere ihe onyonyo ebe ọ nọ kpọọ oku ka ndị Igbo niile bi n'obodo Yoruba kwara ihe ha laa.

N'ihe onyonyo ahụ nke o kesara n'akara Facebook ya, Adeyinka Grandson nyere ndị Igbo ụbọchị olemole ọ ga-abụ ọbụrụ na ha alaghị, a ga-ebuso ha agha.

Ndị uweojii Briten mwụchiri Adeyinka Grandson n'afọ 2019 wee malite nnyocha maka ebubo e boro ya.

Adeyinka kọwaara na ozi ya abụghị maka iyi ndụ egwu kama ọ bụ ozi ka Naịjirịa laghachi n'ọchịchị mpaghara mpaghara nke ga-ebute ọdịmma ndị Yoroba.

Ndị uweojii mechara tọhapụ ya nwa mgbe nta na 2020, mana ha nwụchịrị ya ọzọ n'ọnwa Ọktoba afọ ahụ maka ebubo n'ọ gara n'ihu na-agbasa ya bụ ozi ịkpa.

Onyeisi ngalaba uweojii 'Met's Counter Terrorism Command' bụ Richard Smith kwuru na ha agaghị agbachi nkịtị ka ozi ịkpa oke na-efesa n'ịntaneetị.

"Anyị na-agwa ndi be anyị ka ha wetara anyị mkpesa na-egbughị oge ma ha hụ ozi ịkpa oke ọbụla maọbụ ozi nwereike ikpalite ọgbaghara."

Onye bụ Adeyinka Grandson?

Adeyinka Shoyemi

Ebe foto si, Adeyinka Grandson/Facebook

  • O kpokọbara otu akpọrọ Young Yoruba for Freedom n'afọ 2012 iji kpalite mmụọ ndị ntorọbịa Yoroba ka ha chọọ mwereonwe agbụrụ ha.
  • A mụrụ ya n'ọnwa Eprelu afọ 1976 na Naịjirịa.
  • Ọ na-arụ ọrụ dịka 'Economist' na mba Briten.
  • O bi na mba Briten kemgbe afọ 2007.
  • Ọ lụrụ nwaanyị ma mụọ ụmụ abụọ. Ya na nwunye ya agbaala alụkwaghịm ugbua.
  • O dere ọtụtụ akwụkwọ maka atụmatụ ya nke gụnyere otu akpọrọ "Igbo: A clear and present danger".
  • Nne na nna Adeyinka pụtara kwuo na aka gọọmentị Naịjirịa adịghị na nwuchi nakwa ikpe a mara nwa ha nwoke na mba Briten.