You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Military occupation: Ụmụnwaanyị Ọhafịa emeela ngagharịiwe maka mwuju ndịagha n'obodo ha
Ụmụnwaanyị Amangwu Ohafia dị n'Abia steeti apụtala n'igwe mee ngagharịiwe sị na mmekpa ahụ ndị agha na-emekpa ha akarịala.
Dịka otu onye n'ime ndị ndu ụmụnwaanyị ahụ bụ Christaina Mecha sị na ọnụnọ ndịagha Naijiria nọ n'ogige ụlọakwụkwọ Community Secondary School, Amangwu etinyela egwu na obi mmapụ n'ime ụmụafọ obodo ha.
Oriakụ Mecha gwara onye ntaakụkọ anyị na egwu na ụmụ ha bụ ndị kwụsirila akwụkwọ n'ihi egwu nnwuchi maọbụ mmekpa ahụ nwereike ime ha agaghị enwe ohere lee ule akwụkwọ ịba klass ọzọ.
Ụmụnwaanyị pụtara n'igwe mee ngagharịiwe iji gosi na obi adịghị ha mma etu ndị uweojii siri wujuo obodo Amangwu Ohafia.
Na ngagharịiwe ahụ nke ha mere n'enweghị tigbuo-zogbuo ọbụla, ụmụnwaanyị ndị ahụ zọrọ ije, gụrụ egwu gharịa n'Amangwu, Amuma, Ndi Ibe, Asaga, Ebem na Elu Ohafia tupu ha gaa n'obieze Udumezenke nke Ohafia, bụ Eze E U.L Imaga bụ eze ndị eze Ọhafia nọ nzukọ.
Ha kporo oku ka a kwụsị mwakpo ahụ ma kpopụ ndị agha n'obodo ha."Ndị ndu ha gụnyere Oriakụ Mecha, Ọrịakụ Sunday Onwuka na Oriakụ Mrs. Ngozi Obasi, bekuru ndị igwe Ọhafia ka ha mee ihe ha kwesịrị ime ka obimmapụ na egwu pụọ n'obodo ha."
N'ọsịsa ya n'aha ndị eze ndị ọzọ,onye nnọchite anya Eze Imaga bụ Uma Agbai Olugu toro ụmụnwaanyị ahụ maka iji nwayoo ma chọọ ihe dara mmiri ma kwee nkwa na ndị eze Ohafia ga-elebanye mkpesa ha anya.Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha kuziere ụmụ ha iji udo aga ka ha na ndịagha ghara iwe okwu ọbụla.
Onye ntaakụkọ bụ onye Ọhafia aha ya bụ Ifeanyi Okali gwara BBC Igbo na ndị agha sị 14 Brigade dị n'Ebem Ohafia na ndị ntorobịa Ohafia adịghị na mma.
Dịka o siri kọwaa, ndịagha iwuju obodo malitere na mbido afọ 2021 oke e mere mgbachi obodo, nakwa oge ndị omekome a kpọrọ 'unknown gunmen' malitere kpawa mkpamkpa n'Ọwụwa Anyanwụ.