Women representation in governance: Anambara state ji ụmụnwaanyị aga mba

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Kemgbe akụkọ pụtara na Anambara steeti enweela ọkaikpe ukwu nwaanyị nke mbụ ha, okwu a kpụ n'ọnụ bụ steeti nke kachasị akwado ụmụnwaanyị ịpụta ihe n'ọchịchị obodo nakwa ọkwa dị mkpa n'ala Naijiria?

N'afọ 2000, Naijiria wepụtara atụmatụ ịmapụta oke dị pasent 35 n'ọchịchị obodo maka ụmụnwaanyị nke a kpọrọ 'Affirmative Action' na bekee iji mejupụta nkwupụta ọgbakọ ụmụnwaanyị na Benjing n'afọ 1995.

Ndị Anambara na-ekwu sị na ọ bụ ha bụ ọkaibe n'Alaigbo n'okwu ụmụnwaanyị inwe ohere ịchake n'okwu ọchịchị obodo.

Ihe ha kwuru ọ bụ eziokwu?

Lee ihe nchọpụta BBC Igbo mere gosiri:

Lee ka steeti dị iche iche si ahụta ụmụnwaanyị site n'ọnụọgụgụ ohere ịnọ n'ọkwa dị elu ha nyere ụmụnwaanyị:

Anambara steeti

1. Ndị imeobi ọchịchị Gọọmenti dịka ọ dị na mgbaso iwu: Iri na otu(11) n'ime 47

2. Ụlọomeiwu nke steeti: Ise(5) n'ime 30

3. Ụlọ nnọchiteanya: otu (1) n'ime 11

4. Sineti: Otu nwaanyị

5. Okaikpe: Isii(6) n'ime 30

Imo steeti

Na nkọwa Kọmịshọna mgbasaozi na steeti ahụ bụ Patrick Nze, ndị Imo na-akwado ụmụnwaanyị n'ụzọ pụrụiche. nke na ha nwere ụmụnwaanyị ole n'ọkwa:

1. Ndị imeobi gọọmentị nke steeti: 10 n'ime kọmịshọna 27

2. Ụlọomeiwu nke steeti: 5 n'ime 27 dị na steeti ahụ.

3. Ụlọ nnọchiteanya: O nweghị

4. Sineti: O nweghị

5. Ọkpaikpe:

Abia steeti

1. Ndị imeobi gọọmentị nke steeti: 5

2. Ụlọomeiwu nke steeti: Atọ (3) n'ime mmadụ 13

3. Ụlọ nnọchiteanya: Otu (1)

4. Sineti: Onweghi

Ebonyi steeti

Odeakwụkwọ mgbasaozi Ebonyi bụ Emmanuel Uzọr kwuru na gọọmenti Ebonyi nwere nnukwu ịhụnanya n'ebe ndị iyom nọ nke na ha nwere ụmụnwaanyị.

Mana ọ bụghị ka akụ ilu na-ada n'ọnụ ka ọ na-atọ.

E wezuga dịka o kwuru na ndị isioche okpuru ọchịchị atọ na osote onyeisioche okpuru ọchịchị dị 13 dị na steeti ahụ.

Leekwa ka ọnọdụ ụmụnwaanyị siri kwụrụ n'ebe ndị ọzọ na steeti ahụ:

1. Ndị imeobi gọọmentị nke steeti: Anọ (4)

2. Ụlọomeiwu nke steeti: Atọ (3)

3. Ụlọ nnọchiteanya: Onweghi

4. Sineti: Onweghi

5. Ọkpaikpe: Asaa (7)

Enugwu steeti

1. Ndị imeobi gọọmentị nke steeti: Atọ (3)

2. Ụlọomeiwu nke steeti:

3. Ụlọnnọchiteanya: Otu(10) n'ime asaa(7)

4. Sineti:

Akụkọ ga-amasị gị: