Ndị 'unknown gunmen' agbaala ogige uweojii Arondizuogu ọkụ, gbuo otu n'ime ha

Ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ awakpola isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Arondizuogu ma gbaa ya ọkụ.

Ọ bụ n'ime abalị fotere taa bụ Tuzde, ihe dịka n'elekere abụọ nke isi ụtụtụ ka ha mere mwakpo a.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Michael Abattam kwuru na ya bụ ihe mere n'eziokwu.

Mana o kwughị ma e nwere onye nwụrụ na ya bụ mwakpo.

Otu onye bi na mpaghara ahụ gwara onye ntaakụkọ anyị sị: "Ndị bu egbe wakporo ogige ndị Uweojii n'Arondinzuogu, gbaa ya ọkụ m ma gbuo otu onye uweojii."

"Ha ji gburu onyeisi ndị uweojii ogige ahụ mma n'isi, mebie ụgbọala jeep ya, ma gbakwaa ụgbọala Siena ndị uweojii dị n'ogige ahụ ọkụ."