Gastroenteritis: Gịnị bụ ọrịa a na-ata n'afọ na-egbusisi ndị mmadụ n'Ebonyi

Ọrịa otoro a na-enyo nwere i bụ ihe Bekee kpọrọ "gastroenteritis" egbuola mmadụ itolu n'obodo Ndiegu Amagu dị n'okpuru ọchịchị Ikwo n'Ebonyi steeti, dịka otu onye ọrụ gọọmentị siri kwuo.

Nke a na-abịa dịka kepụ kepụ pụtara na ndị mmadụ na-anwụ aghara aghara n'okpuru ọchịchị Ikwo.

Ụfọdụ akụko a na-ekwu na ndị nwụrụ site n'ọdachị a eruola 65.

Mana, otu n'ime ndị enyemeka onyeisi okpuruọchịchị Ikwo bụ Ugonna Utulor depụtara n'akwụkwọ ozi n'ụbọchị Tọọzde were kọwa na ọnụ ọgụgụ ndị a abụghị eziokwu.

Maazị Utulor kwuru na akụkọ ndị na-efeghari na soshal midia na mmadụ iri isii na ise nwụrụ n'ọrịa bụ akụkọ ụgha.

Mana, o kwukwara na o bu eziokwu na ọrịa afọ gburu ndi mmadụ n'obodo Ndiegu Amagu na mbido ọnwa Nọvemba.

Maazị Utulor sị na dịka ọdachi a mere, ha ezigarala ngalaba ahụike steeti, nke okpuruọchịchị, otu ahụike mba ụwa bụ WHO n'ịchafụ na ndị isi okpuruọchịchị Ikwo ozi banyere ọrịa a.

N'okwu ya, ọ sị "Ngalaba ndị a zitere anyị ndị ọrụ ahụike, ha nnyochara ime ahụ ọtụtụ ndị obodo anyị mana e kwuru na ọ bụghị otoro kpọmkwem."

Akwụkwọ ozi ya kwukwara na ndị ndu okpuruọchịọchị ahụ agbaala mbọ zụta ọgwụ, bute ihe eji echekwa mmiri ọṅụnụ, nakwa ihe ndị ọzọ e ji enyere ndị afọ na-asa aka.

Ọ gara n'ihu kwuo na mgbe ha mere ọnụ ọgụgụ n'ụbọchị Tọọzde bụ ụbọchị 25 nke ọnwa Nọvemba, 2021 na ndị nwụrụla n'ọrịa bụ mmadụ itolu.

Ọ sịkwa na mmadụ iri na asatọ (18) butere ya bụ ọrịa ahụ anatala ọgwụgwọ, ebe mmadu iri n'ime ha agbakeela.

Gịnị bụ rịa "gastroenteritis" a na-enyo n'okwu ọnwụ ndị a?

Ọrịa a na-akpọ "gastroenteritis" na-eme ka afọ na-ata mmadụ nke ukwuu.

Dọkịnta Udodi Kachikwuru Okoli gwara BBC Igbo na ọrịa a na-akacha e si na mmiri a nesighi esi nwee ṅṅọọ maọbụ a na-etinyeghi ọgwụ e ji eme ka mmiri di ọcha.

Ọ kwuru na mmadụ iri nrị aghara aghara ọ na-amaghi ebe maọbụ etu e si sịe ya bụkwa ụzọ ọzọ esi ebute ọrịa.

N'okwu ya, Dkt Okoli kwuru na ụmụaka ndị okenya bụ ndị kacha e bute ọrịa maka ime ahụ ha esighị ike ka nke ndị ntorobia.

Mgbe ụfọdụ ndị butere ọrịa na-enwe afọ mgbu.

Dọkịnta Okoli kwuru n'ebe a na-akacha ebute ọrịa a bụ ebe ọtụtụ ndị mmadụ bịkọ ọnụ maọbụ na-anọkọ ọnụ dịka ụlọezụmịke ụmụakwụkwọ, ebe ndị agha na-ebịkọ, ụlọ nga, ụlọọgwụ, ndị bịtere aka n'ime ụgbọ mmiri nakwa ndị nwere ọrịa n'ime ahụ ha.

Dkt. Okoli kwukwara na "Oria a nwereike ikpalite ahụọkụ, ịgbọ agbọ, otoro ịgba mmadụ maọbụ mmadụ ịnyụ nsi ị bụ ihe na-adịghị mfe"

Ọrịa a na-efe efe

Ọrịa a na-efe efe site na onye ahụ dị mma na onye bu ọrịa a ịnọkọ, ịrịkọ nrị ọnụ, dịka nje ọrịa a na-esi na nsị maọbụ agbọ onye bu ọrịa efesa onye ọzọ.

Ya mere na-etu e si ezere ọrịa a bụ site na ihichasi na nzacha ụlọ ọbịbị nakwa ebe a na-esi nrị, ịkwọ aka kwa mgbe, kwa mgbe, ezere ndị bu ọrịa a, ịsacha nrị maọbụ mkpụrụ osisi tupu ataa ya, isi nrị na mmiri n'ọkụ tupu erie ya.

Etu e si agwọ ya

Dọkịnta Okoli gwara BBC Igbo na ọrịa bụ ihe a na-agwọ agwọ site na ịṅụ ọgwụ pụrụịche Beekee na-akpọ 'antibiotics'.

O kwukwara na ịṅụ mmiri kwa mgbe kwa mgbe ga-enyere onye bu ọrịa a aka igbake dịka ya bụ ọrịa na-eme ka mmadụ nyụọ oke nsi nke bụ na ọtụtụ mmiri ga-apụ ya n'ahụ.

Na nchịkọta o kwuru na mmiri ọgwụ Beekee na-akpọ 'Oral Rehydration Solution' bụ ọ pụrụịche na inyere ndị bu ọrịa a aka.

'Oral Rehydration Solution' bụ mmiri, Sụga na nri.