Hepatitis: Ọrịa Hepatitis A, B, C, D na E ha enwere ngwọta?

    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Ọrịa Hepatitis na-egbu otu onye n'ime tịmkọm tịmkọm iri atọ (30 seconds) ọbụla, n'akụkụ ụwa niile.

Nke a bụ dịka ngalaba 'World Health Organisation' siri kwuo, n'akwụkwọ ozi ha wepụtara iji maa ọkwa maka ụbọchị ncheta ọrịa Hepatitis nke afọ 2021.

Ọ bụ n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Julaị ọbụla ka a na-eme ncheta a.

Isiokwu emume nke afọ a bụ "Hepatitis anaghị eche mmadụ", nke a bụ iji gosi na ọ dị mkpa mmadụ ichekwa onwe ya.

BBC Igbo edebuola akụkọ kọwara maka ọrịa Hepatitis nke ọma, pịa aka ebe a.

Mana akụkọ nke a bụ iji kọwaa ndịịche dị n'ụdị ọrịa Hepatitis dị icheiche e nwere nakwa etu ị ga-esi chekwaa onwe gị.

Hepatitis A, B, C, D na E - Kedụ etu ha siri yie?

Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ maka ụdị ọrịa Hepatitis ọbụla bụ na ha ncha na-emetụta umeji mmadụ (Liver).

Njirimara ha, nke bekee na-akpọ symptoms na-abụkarị otu ụdị ihe mana ọ bụ nnyocha ga-egosi kpọmkwem ụdị nke mmadụ nwere.

Njirimara ndị a gụnyere:

  • Anya na ahụ mmadụ ịcha uhie uhie (jaundice)
  • Mamịrị ịcha edo edo (yellowish urine)
  • Ahụ ọkụ
  • Oke ike ọgwụgwụ
  • Akwara igbu mgbu (muscle aches)

Ka anyị tulezie ndịiche dị na ụdị Hepatitis e nwere.

Hepatitis A (HAV)

  • Ebe e si ebutekarị nje HAV bụ nke na-akpata 'Hepatitis A' bụ site n'iri nri maọbụ ịṅụ mmiri na-adịghị ọcha, ịṅụfe mmanya na-aba n'anya oke, nakwa okirikiri na-adịgh ọcha.
  • Ọ bụrụ na onye nwere nje ahụ sie nri na-akwọchaghị aka ya nke ọma, o nwere ike ifere onye ọzọ riri nri ahụ.
  • Mmadụ nwekwara ike ibute ya site n'ịmetụ nsị onye nwere nje ahụ aka.
  • Mana 'Hepatitis A' anaghị akpacha ike dịka umunne ya ndị ọzọ.
  • Onweghị ọgwụ, kama ọ na-eji aka ya ala ma obere oge gachaa.

Iji chekwaa onwe gị:

Dịka WHO siri nye ntuziaka, ụzọ ị ga-esi gbochie Hepatitis A gụnyere:

  • Gbaa ọgwụ mgbochi HAV.
  • Sie nri gị ka o ghee eghee nke ọma tupu i rie.
  • Rie nri gị oge ọ dị ọkụ.
  • Ị gachaa mposi, maọbụ ịgbanwee akwa mposi nwatakịrị, sachaa aka gị nke ọma
  • Tupu ị rie akwụkwọ nri maọbụ taa mkpụrụosisi ọbụla, sachaa ya nke ọma
  • Kpachara anya ụdị mmiri ị na-aṅụ

Hepatitis B

Nke a so n'otu ụdị Hepatitis kacha anụ ndị mmadụ ịkpakwụ n'ụwa niile.

WHO na-ekwu na mmadụ puku narị asatọ na iri abụọ (820,000) nwụrụ n'ihi orịa a naanị n'afọ 2019.

Hepatitis B so n'ọrịa kacha akpata ọrịa akpụ umeji (liver cancer).

Etu e si ebute ya bụ:

  • Nne na-ebufe ya nwa oge a na-amụ nwa
  • Mmekọ nwoke na nwaanyị
  • Itinyere mmadụ ọbara nwere ya bụ nje
  • Asụ mmiri, ọbara nsọ nwaanyị, ughe nwoke (sperm)
  • Ntụtụ maọbụ ihe ndị ọzọ dị nkọ nke nje ahụ metụrụla

Ọ bụrụ na mmadụ bute nje a n'okenye, ọ na-aka njọ karịa onye butere ya na nwata.

Iji chekwaa onwe gị:

  • Gbaa ọgwụ mgbochi HBV. Ụmụaka a mụrụ ọhụrụ kwesịrị ịgba ya n'ime otu ụbọchị a mụchara ha
  • Zeere anwụrụ ike, ọ kachasị ndị ndị e ji ntụtụ agbanye n'ahụ
  • Kpachara anya onye gị na ya na-eme aramara. Zeere gị na ọtụtụ ndị mmadụ ime aramara
  • Zeere ise ihe osise n'ahụ (tatoo), maka na ihe e ji ese ya na-aghọ nkọ

Hepatitis C

Ọ bụ n'afọ 1972 ka ndị nnyocha sayensị atọ: Michael Houghton, Harvey Alter na Charles Rice chọpụtara nje a.

Nchọpụta a ka e ji nye ha nturuugo 'Nobel Prize in Medicine' n'afọ 2020.

  • Ọ bụ n'ọbara ka e sikarị ebute ụdị Hepatitis nke a.
  • Nke a gụnyere ịnata ọbara bu ya bụ nje, maọbụ iji ntụtụ metụrụla onye nwere ya bụ nje gbaa
  • Mmekọ ọbụla nke ọbara nwere ike ịdị na ya, dịka nwoke na nwoke inwe mmekọ
  • A naghị aṅụta ya na mmiri ara, maobụ nri maọbụ mmiri maọbụ mmekọarịta ahụ dịka ibi ọma maọbụ ịmị ọnụ.

Iji chekwaa onwe gị:

  • Ọ bụrụ onye ahụ siri ike, ahụ ya ga-ebusonwu nje a agha n'egbughị oge ọ laa.
  • Ya mere o jiri dị mkpa ka mmadụ na-eri nri na-ewulite ihe na-ebuso nje agha n'ime ahụ, nke bekee na-akpọ 'immune system'
  • Tupu ọrịa aka njọ, gbaga ụlọọgwụ gaa nata ọgwụgwọ.
  • Nje HCV na-akpata Hepatitis C enwebeghị ọgwụ mgbochi

Hepatitis D

Hepatitis D na-emekarị naanị ndị nwere maọbụ ndị rịabugoro ọrịa Hepatitis B.

Mgbe ọ dị otu a, a na-akpọ ya 'coinfection'.

Ụzọ kacha mfe esi egbochi ya bụ ịgba ọgwụ mgbochi nke Hepatitis B.

WHO kwuru na ọnụọgụgụ ndị na-ebute nje a na-agbada agbada n'ihi na ọgwụmgbochi Hepatitis B dị ebe niile.

Hepatitis E

A na-ebutekwa ụdị nje nke a site n'ịṅụ mmiri adịghị ọcha, ọ kachasị nke nsị banyere n'ime ya.

Ọ bụ mba na-emepechaghị emepe ka ụdị Hepatitis nke a kacha enye nsogbu, dịka WHO siri kwuo.

Hepatitis E nwere ọgwụ mgbochi nke ndị mba Chaịna rụrụ. Naanị na mba ahụ ka ị ga-enweta ya bụ ọgwụ.

Mana ọrịa a na-eji aka ya ala n'ime abalị isii maọbụ asatọ nje ya jiri banye n'ahụ mmadụ

Iji zeere ya:

  • Hiee aka abụọ n'anya maka mmiri ịmaghị ebe o si.
  • Zekwaara ọkpụrụkpụ mmiri (ice block) ị na-amaghị mmiri e ji mee ya