You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nnamdi Kanu Update: "Ana m ahụta MNK dịka nwa m, ọ bụghị dịka onyeisi IPOB" - Okezie Ikpeazu
Gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abia Steeti ekwuola na ọdịmma Mazi Nnamdi Kanu na-emetụ ya n'obi.
Ikpeazu kwuru nke na mkparịtaụka ya ndị ntaakụkọ 'Vanguard' nwere, nke e bipụtara n'ụbọchị Mọnde.
O kwuru sị: "Ana m ahụta Nnamdi Kanu dịka onye si na steeti m na-achị, ọ bụghị dịka onyeisi ndị IPOB."
"Adị m njikere itinye ọnụ iji weta nsogbu a n'isi njedebe."
"Ọdịmma ya na-emetụta m n'obi, achọrọ m ka e kpee ya ikpe n'ụzọ kwụ ọtọ nke doro onye ọbụla anya."
"Kama agaghị m achọ ka a na-akpaso ya agwa dịka onye amarala ikpe."
"Ọ bụ orụ dịịrị anyị ịhụ na anyị ga-akpachapụrụ ya anya, maka na ọbụladị nwa lara akụ nna ya n'iyi nwekwara nna."
Okwu IPOB bụ ihe e kwesịrị ịkpa akpa
Gọvanọ Ikpeazu kọwara na ọ dị mkpa ka gọọmentị na ndị isi IPOB nọdụ ala nwee mkparịtaụka iji weta udo.
"Anyị na IPOB kwesịrị ịkparịta ụka," Ikpeazu kwuru. "Ha abụghị ndị ọjọọ dịka ndị ekperima na-eyi ndụ egwu na mpaghara Ugwu."
"Ekwenyere m na o nwere ihe dị mkpa ndị a (bụ IPOB) na-ekwu okwu ya."
"Ọ dị mkpa ka e gee ha ntị, n'agbanyeghị na o megidere iwu mmadụ iburu egbe megide ọchịchị obodo."
"O nwere ozi ha chọrọ ịgbasa. Ọ dị mkpa ka anyị wulite ntụkwasị obi n'ebe anyị nọ dịka ndị ọchịchị, ọ bụghị ikwu okwu na-ekwesịghị ekwesị."
Ndị Gọvanọ enweghị ikike ịkwụsị ọnọdụ 'sit-at-home'
Gbasara iwu onye apụna iro bụ nke ndị IPOB tinyere n'ala Igbo, Gọvanọ Ikpeazu kwuru na ndị gọvanọ enweghị ikike ịkwụsị ya.
O kwuru na ike nchekwa obodo adịghị kpọmkwem n'aka ndị gọvanọ, n'ihi na ọ bụ gọọmentị etiti na-agwa ndị ọrụ nchekwa niile ihe ha ga-eme.
Ikpeazu kọwakwara na ndị ọrụ nchekwa ebughị ibu, ha enweghịkwanụ akụrụngwa zuru oke iji rụọ ọrụ ha nke ọma.
O kwuru sị: "Ọ bụrụ na ndị gọvanọ bụ ndị isi nchekwa steeti ha n'eziokwu, gịnị kpatara na ha enweghị ike ikpebi ndị ọrụ nchekwa ole ha ga-ezipu nakwa akụrụngwa ha ga-eji rụọ ọrụ ha?"
"Ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ enweghị ihe ha ga-emenwu banyere nke a, mana anyị na-agbalị ike anyị."