IPOB Sit at home today: Etu ndị ojiegbe si chụsasịa ndị mmadụ na-agara onwe ha n'Owerri taa

Ndị ojiegbe achụsasịala ndị mmadụ n'Owere n'ụtụtụ taa bụ Mọnde n'ụzọ iji manye ndị mmadụ ka ha nọdụ n'ụlọ.

Nke a na-abịa dịka BBC Igbo chọpụtara na ọtụtụ ụlọahịa mepere taa, ụmụakwụkwọ gara akwụkwọ, ụlọakụ mepere n'Owere, isi obodo Imo steeti.

Dịka ụdaegbe malitere ịda aghara aghara n'ihe dịka elekere iri nke ụtụtụ, onye ọbụla riri mbọmbọ ọsọ iji zọọ ndụ ha.

Ọtụtụ ụlọakwụkwọ mechiri ma gwa ụmụakwụkwọ ha ka ha laa.

Ụlọakụ ndị mepeburu emepe mechiri n'otu ntabi anya, ebe ọtụtụ ụlọahịa nakwa ụlọọrụ mechikwara.

Ka ọ dị ugbua, onyentaakụkọ anyị chọpụtara na ndị uweojii na ndị agha ewerela ọnọdụ n'okporoụzọ niile dị n'ime Owere.

Chetakwa na ndị ekperima na-akpagharị na mpaghara ọwụwa Anyanwụ n'ụbọchị mọnde ọbụla, na-eyi ndị mmadụ egwu.

Ha na-eme nke a iji mee ka ndị mmaọ̄ụ debe iwu mmachi mkpagharị bụ nke ndị otu IPOB tinyere iji gosi iwe ha maka nnwuchi gọọmentị etiti nwuchiri onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu.

Lee etu ndị mmadụ si gbajọọ 'sit at home' nke taa

Ike ịnọ n'ụlọ agwụwala ọtụtụ mmadụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ dịka ọtụtụ gbajọrọ atụmatụ 'sit at home' n'ụtụtụ Mọnde a.

BBC Igbo kpagharịrị na mpaghara dị icheiche n'ala Igbo ma hụta n'ezie na ndị mmaọ̄ụ naa-agagharị.

Anambra Steeti - Ọka

Ndị ntaakụkọ BBC Igbo kpagharịrị na mpaghara dị icheiche n'Awka, nke bụ isi obodo Anambra steeti.

Anyị chọpụtara na ndị mmadụ na-agagharịrị onwe ha na-enweghị mgbochi ọbụla.

Mana ụfọdụ ụlọahịa emepeghịkwa emepe, dịka ụfọdụ na-ekwu na egwu ka dị n'obodo.

Malite na 'Zik's Avenue, pụọ ahịa Eke Awka, rukwaa ahịa Nkwọ Amaenyi, ahịa na-azụ etu o kwesịrị.

Onye ntaakụkọ anyị kwuru sị: "Ọ bụ eziokwu na ọbụghị otu a ka ahịa na-esi azụ n'ụbọchị ndị ọzọ, mana taa ka mma karịa etu ọ dị na Mọnde ndị ọzọ gara aga."

Ọnịcha

Mana BBC chọpụtara na ahịa niile dị n'Ọnịcha azụghị taa.

Otu onye ntaakụkọ anyị bu ụgbọala ya si Asaba, Delta steeti banye Ọnịcha, wee hụ na okporoụzọ tọgbọ chakoo.

Kama ọ hụkwara ka ndị uweojii kwụcha n'ụzọ iji gbochie onye ọbụla nwereike ibute ọgbaaghara.

Ụfọdụ ndị BBC Igbo gbakwara ajụjụọnụ n'ekwentị, mana ha achọghị ka a kpọọ aha ha, kwuru na ahịa azụghị n'Ọnịcha taa.

Ebonyi Steeti

Onye ntaakụkọ anyị nke nọ Abakiliki, isi obodo Ebonyi steeti, kwukwara na azụmahịa nakwa ọrụ ndị ọzọ amalitela n'uju n'ụbọchị Mọnde.

"Ụlọahịa, ụlọọrụ, ụlọakụ dị icheiche nakwa ụlọakwụkwọ dị icheiche mepechara emepe," onye ntaakụkọ anyị kwuru.

Chetakwa na gọọmentị Ebonyi tiri iwu ma kwuo na ya ga-achụ onye ọrụ ọbụla a chọrọ achọ n'ihu ọrụ ya n'ụbọchị Mọnde.

Abia steeti - Umuahia

Ihe kacha ewu ewu n'Umuahia, isi obodo Abia steeti bụ ngagharịiwe nke ụmụakwụkọ mahadum Michael Okpara, a na-akpọ MOUAU n'ịchafụ.

Ụmụakwụkwọ ahụ na-eme ngagharịiwe n'ihi ọnwụ otu n'ime ha aha ya bụ Queen, bụ onye ụgbọala kugburu n'okporoụzọ dị n'ihu ụlọakwụkwọ ahụ.

Ha na-ekwu na okporoụzọ ahụ ataala isi ọtụtụ ụmụakwụkwọ n'ihi na ya bụ ụzọ jọgburu onwe ya.

Otu n'ime ụmụakwụkwọ ahụ kwuru sị: "O teela anyị ji arịọ gọọmentị ka ha dozie ụzọ n'ihi na ọtụtụ mmadụ anwụọla na ya."

"Mana ebe ọ bụ na ha achọghị ige anyị nti, anyị ga-akwụchi ya bụ ụzọ, onweghị ụgbọala ga-eje eje maọbụ laa ala."

Ewepụ nke a, ọnọdụ 'sit at home' derela jụụ n'Umuahia.

Aba

N'aka nke ọzọ, anyị chọpụtara na ahịa anaghị azụ n'Aba.

Onye ntaakụkọ anyị gara ahịa dị na 'Ngwa Road', Arịarịa, nakwa 'Faulks Road', hụrụ na ụlọahịa niile kpọchiri akpọchi.