Ipob Sit At Home: Etu Ebonyi, Umuahia, Owerri, Awka na ndị ọzọ dị taa

Dịka ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) tinyere iwu onye ọbụla ịnọ n'ụlọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, ụfọdụ rubere isi ebe ndị ọzọ na-agara mkpa ha.

Obodo dị iche iche gụnyere Ọka na Owere nwere ndị kwere na ndị ekweghi.

Ọka

N'Ọka, ụfọdụ ụlọahịa mepere, ụfọdụ ụgbọala nakwa keke na-ebu ndị mmadụ na-agba na-enweghi nsogbu ọbụla.

Cheta na ndị Ipob sị na ha tinyere iwu ịnọ n'ụlọ a iji mee ka gọọmentị nụ olu ha ma tọhapụ Nnamdi Kanu bụ onyendu ha gọọmentị nwụchiri n'ọnwa Juun, 2021.

Owere

Ụmụahịa

Ndị Ụmụahịa na-agara mkpa ha na-enweghị nsogbu ọbụla.

Ebonyi

N'agbanyeghi ihe gọvanọ Dave Umahi kwuru maka ịta ndị ahịa na ndị ọrụ na-agaraghị mkpa ha ahụhụ taa, ụfọdụ ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ.

Ihe Gọvanọ Umahi sị ọ ga-eme ndị gere ntị n'iwu 'sit at home'

Dịka ndị mmadụ ka na-erube isi n'iwu ịnọ n'ụlọ (sit at home) nke Ipob tinyere n'Ọwụwa Anyanwụ, gọvanọ Dave Umahi bụ onyeisi ndị gọvanọ mpaghara ahụ agbarụọla ihu maka ya bụ iwu.

Umahi nyere iwu sị ka ndị ọrụ gọọmentị niile nọ na steetị ya bụ Ebonyi gaa ọrụ dịịrị ha, na a ga-achụ onye ọbụla gbajọrọ ọrụ ya.

Ọ gara n'ihu sị ka ndị isi ụlọọrụ gọọmentị na-edekọ aha ndị bịara ọrụ na ndị na-abịaghị ọrụ.

Umahi nyekwara iwu sị ka ndị na-ere ahịa na ndị ọrụ ụlọakụ gaa ahịa ha, ma ọ bụghị ya gọọmentị ga-anapụ ha ụlọahịa ha.

Ọ sị ka ọhaneze gaa mkpaa dịịrị ha na ndị ọrụ nchekwa ekeela nkwụcha ichekwa onye ọbụla.