Ihe Ipob sit-at-home enforcement riri n'ala Igbo

N'ụbọchị 13 nke ọnwa Sepụtemba bụ Mọnde, ndi omekome wakporo ụlọakwụkwọ Comprehensive Secondary School dị n'obodo Nkume nke okpuru ọchịchị Njaba nke Imo Steeti.

Nke a mere dịka ndị a amaghị ndị ha bụ sị na ha na-amanye ndị mmadụ ịnọ n'ụlọ n'atụmatụ Bekee kpọrọ "Sit-At-Home".

Ndị omekome a amabeghi ndị ha bụ chụsasịrị umụakwụkwọ ahụ na-ele ule West African Examination Council (Waec) ma gbaa ọtụtụ ọgbatumtum ọkụ.

Ihitte-Ukwa, Ọrsụ 14-09-2021

Ka chi bọrọ n'ụbọchị 14 nke ọnwa Sepụtemba ndị omekome gakwara ụlọ ụka Anglican dị n'obodo Ihitte-Ukwa ebe ha gburu ụkọchukwu Emeka Merenu.

Ndị a gburu ukọchukwu a gbukasiri ozu ya ma gbaa ụgbọala ya ọkụ.

Amabeghị ndị kpara alụ a mana ndị mmadụ kwuru na ihe mere e jiri dowe ụkọchukwu a bu makana ọ gara kpọọ ndị agha ka ha chekwawa ụmụakwụkwọ na-ele ule.

Ụkọchukwu a bụ onye Amaorji dị na Nkwerre na Imo Steeti.

Enugwu, 14-09-2021

Ndi amaghị ndị ha bụ wakporo ma gbaa ụgbọala bu achịcha Bekee ọkụ n'Enugwu.

Ihe mere na mpaghara Emene.

Achịcha na ụgbọala a bụ nke ụlọ ọrụ Chimez a ma ama na mpaghara ahụ.

Ndị omekome a kpara ike a gbachiri ụgbọala a ụzọ, kpụpụ onye kwụọ ya ma zuru achịcha niile o bu tupu ha amụnye ya ọkụ.

Ndị ọrụ nchekwa mechara bịa chụpụsịa ndị a niile.

Ndi omekome a gbakwara ụgbọala ọzụ ọkụ.

Ọ bụ n'ebe a nakpọ Ibeagwa Juction ka ha no gbaa ụgbọla Sienna ọkụ.

Agbara otu keke ọkụ ma kụrịsịa ọzọ.

Orlu 15-09-2021

N'ime abalị Wenezde, n'Ọrlụ, ndị Omekome gakwara gbuo otu ọkaiwu aha ya bụ Darlington Odume.

Otu onye ezinaụlọ ọkaiwu a gwara BBC Igbo na ndị kpara arụ a gwara ha na ọ bụ maka ọkaiwu na ndi agha so bata obodo ahụ mere ha jiri gbuo ya.

Onye a gara n'ihu si na nke bụ eziokwu bụ na Ọkaiwu Odume sọ ndị agha bata makana ọ bịara ịhụ nwanye ya dị ime dika ụgbọala adịghị agba maka atụmatụ "sit-at-home" a.

Imo steeti, 09-09-2021

Kọmishọna mgbasa ozi n'Imo steeti bụ Deaclan Emelumba gwara BBC Igbo na ọ bụ maka na ndị ụlọakụ abịaghị ọrụ ụnyaahụ mere gọomentị ji mechie ha taa bụ Tuzde.

Ọ gbagwojuru ọtụtụ mmadụ anya ka ha pụtara n'ụtụtụ taa hụ na e ji eriri ndị Owerri Capital Development Authority machichaa ụlọakụ niile nọ n'Owerri.

Onye ntaakụkọ BBC hụrụ na-amachighị ụlọakụ nke Zenith Bank dị na Okporoụzọ Bank Road n'ime Owerri.

Cheta na ndị mmadụ agaghị ọrụ n'Imo steeti dị ka ọ dị na mpaghara Ala Igbo niile ụnyaahụ bụ Mọnde dịka ndị otu Ipob hiwere ọnọdụ onye apụla ezi kwa Mọnde.

Ipob sit-at-home order: Kedụ ndị ji aha 'sit-at-home' eme mpụ n'ala Igbo?

Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ abụrụla ebe a na-anụ akụkọ ọjọọ dị icheiche n'ụbọchị Mọnde ọbụla.

Nke a bụ maka na ọtụtụ ndị ekperima amaghị ndị ha bụ na-eji ụbọchị ahụ eyi ndị mmadụ egwu n'aha 'sit-at-home'.

Kwa Mọnde ọbụla, ala Igbo niile na-atọgbọ chakoo ka ebe a na-alụ agha, n'ihi na egwu anaghị ekwe ndị mmadụ apụta ezi.

Mana ebe ọ bụ na ndị isi IPOB ekwuola na ha ewepụla iwu 'sit-at-home' kwa Mọnde ọbụla, kedụzi ndị na-eyi ndị mmadụ egwu n'ala Igbo?

Ebe olemole ndị ekperima yiri ndị mmadụ egwu n'aha 'sit at home

Eluagu Obukpa/Nsukka na Orlu/Imo Steeti - 06/09/2021

Taa bụ abalị isii nke ọnwa Sepụtemba ka akụkọ kwuru na ndị ekperima wakporo ụgbọala 'trailer' bu ngwaahịa ma gbaa ya ọkụ.

Akụkọ kwuru na ọ bụ n'obodo Eluagu Obukpa nke dị n'okpuru ọchịchị Nsukka n'Enugwu steeti ka ihe a mere.

Ngwaahịa ụgbọala ahụ bu bụ akụrụngwa ọgbatumtum, si Nnewi aga Enugwu-Ezike.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu bụ Daniel Ndukwe azaghị oku BBC kpọrọ ya maka akụkọ a, ọ saghịkwa ozi ekwentị anyị zigaara ya.

Ọzọkwa mere taa bụ n'Eke ụtụtụ dị n'Orlu ebe a gbara ụgbọala bu 'foam' ọkụ.

Akụkọ kwuru na ọ bụ Ọnịcha ka o si buru ngwaahịa ahụ na-aga Orlu tupu ndị e jichie ya.

Imerienwe - Imo State - 30/08/2021

Ndị agha Naịjirịa gbagburu ndị ntorobịa atọ sị na ha bụ ndị IPOB/ESN ndị na-akpagharị iji hụ na ndị mmadụ na-erube isi n'iwu 'sit-at-home'.

Ụmụ okorobịa atọ a jizi ohere ahụ na-ezu ohi ma na-anapụ ndị mmadụ ụgbọala ha.

Ọ bụ ndị obodo Imerienwe kpọrọ ndị agha dịka ụmụ okorobịa ahụ na-eyi ha egwu.

3-3 Onitsha - Anambra Steeti - 23/8/2021

Ndị ekperima kwụchiri ụzọ na mpaghara 3-3, Nkwelle Ezunaka, na Nsugbe nke dị nso n'Ọnịcha.

Ha na-achụghachi ndị mmadụ pụtara ezi, ọtụtụ ka a naara ekwentị ha na-ego ha, ndị ọzọ kwa ka a mebiri ụgbọala ha.

Otu onye nke a metụtara gwara onye ntaakụkọ BBC na ya na ezinụlọ ya si ebe ha gara ụka alọta n'ụzọ ụtụ Mọnde ahụ.

O kwuru sị na ndị nke mbụ ha zutere naara ha ego ma gwa ha ka ha si ụzọ ime ogbe iji zeere ndị otu ha nọ n'ihu.

Mana ọbụzị n'ime ogbe ahụ ha si ka ha zutere ndị ekperima nke zuuru ekwentị ha, ma kụwaa ọkụ ụgbọala ha.

Aboh Mbaise - Imo Steeti - 09/08/2021

Ndị ekperima a na-eche na ha bụ ndị IPOB/ESN wakporo ọtụtụ ụgbọala n'Aboh Mbaise dị n'Imo Steeti gbaa ha ọkụ.

Iwe ha bụ ndị ahụ dara iwu onye apụtala ezi.

Gịnị ka a ga-emezi?

Otu Ohaneze ndị Igbo akpọọla oku ka ndị ntorobịa kwụsị ịkpagbu ndị mmadụ n'aha 'sit-at-home'.

Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo ekwukwaala ka a kwụsị ya bụ ihe.

Ọbụladị ndị isi IPOB dịka Chika Edoziem, Emma Powerful, nakwa ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor ekwuola na ha akwụsịla iwu a.

Mana ọ bụ ọrụ dịịrị ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ịhụ na ha chọpụtara ma nwuchie ndị ekperima ji aha 'sit-at-home' eyi ndị mmadụ egwu.

Ọ bụkwa ọrụ ha ịhụ na ndị mmadụ na-akpagharị nke ọma n'ụbọchị Mọnde ọbụla n'ala Igbo.

Ihe ise mere ndị mmadụ ka ji na-anọ n'ụlọ taa bụ Mọnde n'ala Igbo

Ụbọchị isii nke ọnwa Sepụtemba, 2021 ga-eme ya Mọnde nke atọ ọtụtụ ndị bi n'ala Igbo ekweghị apụta n'ụlọ ha gawa mkpa ha n'ụtụtụ.

Ndị mmadụ na-ekwu na ebe niile tọgbọọ chakoo dịka ọtụtụ ndị ekweghị apụta gaa n'ụlọ ọrụ ha, ebe azụmahịa ha nakwa ụlọakwụkwọ.

Otu Indigenous People of Biafra kwuru ka akwụsị sit-at-home, ka ọ bụrụzia naanị ụbọchị ọ ga-apụta n'ụlọikpe ka ndị mmadụ nọ n'ala Igbo ga na-anọ n'ụlọ.

Mana lee ihe ise ụfọdụ ndị bi n'ala Igbo kwuru mere ha ji ka na-anọ n'ụlọ ụbọchị Mọnde ọbụla agbanyeghị na otu Indigenous People of Biafra ekwuola ka akwụsịtụ sit-at-home ha kanyere n'August 9, 2021.

1." Mmegbu gọọmenti na-eme Nnamdi Kanu adịghị ndị mmadụ mma n'obi"

Onye ọrụ oyibo na-achọghị ka akpọpụta aha ya kwuru na ọ bụchaghị ụjọ mere ka ndị mmadụ jụ ịpụta n'ụbọchị Mọnde ọbụla gawa mkpa ha

N'ọkwu ya, " Enweghị ihe ọbụla gbara ọkpụrụkpụ gosiri na Ipob akwụsịtụla ya bụ sit-at-home ."

"Ndị Igbo kwetere na ihe gọọmneti etiti na-eme Nnamdi Kanu adịghị mma, ya mere ha ji na-akwado ya ugbua ọ na mkpọrọ DSS."

" E nwere ọtụtụ ndị ekperima nọ n'obi gọọmenti na-eme mpụ a hapụrụ ka ha na-agara onwe. o nweghị onye jichiri ya."

" E kwetere m na ọ bụ makana Kanu bụ onye Igbo kpatara gọọmenti ji emegbu ya mana ọ bụ mana ọ bụrụ nnọrọ n'ụlọ a ụbọchị Mọnde ga-egbo ga-eziga ozi gbata gbata nye gọọmenti etiti, ọ dị mma."

O kwuru na ndị ụlọọrụ ya kwuru ha nyocha ma hụ na ebe niile enweghị nsogbu tupu ha biawa ọrụ.

3. "Ụjọ ji ndị mmadụ" - Ohaneze ndị Igbo

Odee akwụkwọ otu Ohaneze ndịgbo bụ Alex Chiedozie Ogbonnia kwuru na ọnụọgụgụ ndị uweojii nọ n'ala Igbo adịghị nhatanha nye ndị bi na mpaghara ọwụwa anyanwụ.

N'okwu ya. " Nke a mere ka ọtụtụ mmadụ na-eze isi ha makana ha maghị ma ndị uweojii a ga-anọ chekwa ma onwe ihe mere ha ma ha pụta gawa mkpa ha ụbọchị Mọnde ehiweburu maka 'sit-at-home'

"Ọ bụ eziokwu na ndị mmadụ akwadochaghị etu Nnamdi Kanu si achụ Biafra, mana ha kwadoro ihe kpatara ọ ji achụ ya."

"Ọnọdụ ndị Igbo na Naịjirịa ugbua na-ewute mmadụ niile."

O kwuru na o nweghị onye obi dị mma n'ala Igbo ya mere ụfọdụ ndị jịkwa anọ n'ụlọ.

3. "Ndị Igbo na-eme ihe ọbụla Ipob kwuru ga-eme ka ha nwere onwe ha"- Duruagwu

Onye Nze nyere aha ya dịka Duruagwu ekwuola na onweghị ọrụ ọ gara taa makana o na-eze ndụ ya agbanyeghị na Ipob ekwuola ka akwụsị atụmaatụ onye nọrọ n'ụlọ.

O kwukwara na ọ na-anaghị ewute ya na ọ naghị aga ọrụ makana ọ bụ nkwekọrịta o chere na ndị Igbo mere iji kwado onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu.

Duruagwu kwuru na ndị mmadụ bi n'ala Igbo enweghị ntụkwasị obi n'ebe ndị gọvanọ ọwụwa anayanwụ nọ mere na ha anaghị ege ha ntị ma ha kwuo ka ndị mmadụ kwụsị ime sit-at-home Ipob hiwere.

4. Ụlọakwụkwọ praimarị na Sekọndiri emepebeghị

Kọmịshọna na-ahụ maka mgbasaozi n'ala Igbo bụ Declan Emelumba kwuru na ọtụtụ ahịa dị n'Imo steeti mepere emepe.

Mana onye ntaakụkọ BBC hụrụ na ọtụtụ ebe na-ekwo ekwo adịghị ka ha si adịbụ na mbụ.

Emelumba na ihe o ji dịka ndị mmadụ apụtaghị bụ na ọtụtụ ụlọakwụkwọ emepebeghị n'ala Imo.

O kwuru na ndị uweojii nọ n'Imo steeti anaghị ejizi ike egosi onwe ha belụsọ mgbe ndị omekome kpawara mkpa mkpa.

5."O nweghị onye na-eti iwu ka anọrọ n'ụlọ n'ụbọchị Mọnde n'Osisiọma dị n'Aba"

Nwagbaghọ gwara BBC Igbo okwu, kwuru na ndị mmadụ pụtara na-aga mkpa ha n'Osisioma dị n'Aba na-enweghị ụjọ ọbụla.

O kwuru na onweghị onye na-akwụsị ndị mmadụ iga ahia maọbụ ọrụ n'ebe ahụ.

N'okwu ya, a nọ m n'ahịa ugbua, na-azụ ahịa makana onweghị onye ọbụla na-enye anyị nsogbu."

AKụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: