Nnamdi Kanu Ipob 'sit-at-home order': Ihe ọhụrụ Ipob kwuru gbasara 'sit-at-home' Mọnde

Ndị gọvanọ na ndị ọrụ nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa akatọọla atụmatụ 'sit-at-home' Ipob tinyere n'ụbọchị Mọnde.

Nke a dị n'ozi dị iche iche ha zipụtara na steetị ha dị iche iche nke gụnere Abia, Ebonyi, Imo nakwa Anambra.

N'Abia Steetị

Gọọmentị Abia sị na ha anabataghị nke a, ọkachasị ya bụrụ na ọ bụ na mmanye ka a manyere ndị mmadụ ịnọ n'ụlọ.

N'ozi kọmishọna mgbasaozi ha bụ John Okiyi-Kalu wepụtara, ha sị na e gbochighi onye ọbụla ịnọ n'ụlọ n'ụbọchị ahụ.

Kama ha sị na ọ gaghị amasị ụmụakwụkwọ na ndị na-azụ ahịa, ọkachasi ugbua ndị mmadụ ka na-eme ka ha si na mkpa mkpa covid 19 pụta.

N'Anambra Steeti

Gọọmenti Anambra steeti enyala iwu ka ndị ọrụ niile bia ọrụ echị bụ August 9, 2021 Mọnde.

Onyeisi ndị ọrụ na steeti ahụ bụ ọkaiwu Harry Uduh depụtara nke a n'akwụkwọ ozi o zigara ndị ntaakụkọ.

O depụtara na ọnye ọrụ Anambra steeti ọbụla na-abịaghị ọrụ ga-anọ na nnukwute msogbu maọbụ gbajọọ ụgwọ ọnwa nke ọnwa August.

Ndị kọmịshọna na ndị odee akwụkwọ ha ga-elebanye mara ndị dara iwu a na ndị dowere ya.

N'Ebonyi Steetị

Dịka otu Ipob na-akwado abụbụ ọrụ onye apụla ezi echi bụ Mọnde, Gọvanọ Ebonyi steeti nakwa onyeisi ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ bụ Dave Umahị ekwuola na echi bụ ọrụ, onye aṅala ha ntị.

N'akwụkwọ ozi odeakwụkwọ mgbasa ozi ya bụ Francis Nweze dere, Ụmahị gwara onye ọbụla obi amapụla ha na ndị ọrụ nchekwa ga-anọ ịnye onye ọbụla ezi nchekwa n'ụbọchị ha.

N'Imo Steetị

Kọmịshọna ndị Uweojii n'Imo Steetị bụ Abutu Yaro gwara sị ka ndị mmadụ leghara okwu iwu ịnọ n'ụlọ ahụ anya.

Mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'isi ụlọọrụ ha dị n'Owere, ọ sị na ndị ọrụ nchekwa ewerela ọnọdụ ịhụ na-udo na-achisike.

Ọ sị na ndị nyere iwu a na-achọ imebi udo na ọganịhụ nke Imo Steetị dịka ọ ga-emetụta ọdimma ndị ahia, ụmụakwụwkọ nakwa ọrụ aka niile na steetị ahụ.

Yaro gwara ndị nne na nna ka ha dụọ ụmụ ha na ezinaụlọ ha ndụmọdụ ka ha hapụ itinye aka n'ikwasa udo dị n'obodo. Ihe ọhụrụ Ipob kwuru gbasara 'sit-at-home' Mọnde

Otu Indigenous People of Biafra na-ekwusi ike na atụmaatụ abụbụ ọrụ onye apụla ezi echi bụ Mọnde ka ga-aga n'ihu.

Ọnụ na-ekwuchitere otu ahụ bụ Emma Powerful depụtara nke a n'akwụkwọ ozi o zigara ndị ntaakụkọ.

Powerful depụtara ka ndị mmadụ bi n'ala Igbo nọrọ n'ụlọ site echi bụ Augụst 9,2021 nakwa Mọnde ọbụla ruo mgbe a tọghapụrụ onyeisi ha bụ Nnamdi kanu o kwuru na a tọrọ na mba Kenya ma kpọlata na Naịjirịa.

O kwuru na onye ọbụla bi na'ala Igbo ga-anọrọ n'ụlọ site n'elekere isii nke ụtụtụ ruo nke isii nke mgbede.

"Anyị na-adụ onye ọbụla ọdụ ka ha nọrọ n'ụlọ ka ha wee gbanahụ mwakpo ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa."

"Ahịa, ụlọakwụkwọ, ọdọ ụgbọala, ọdọ ụgbọelu, nakwa ebe niile bụ ebe ọha n'ala Igbo agaghị agbape bido n'ụtụtụ ruo mgbede n'ụbọchị Mọnde ọbụla."

"Anyị mara ihe mmachị ga-ewepụ ụmụ Igbo n'ahụ mana anyị na-eme ya makana anyị chọrọ ka ụwa mara na ọ bụghị naanị Nnamdi Kanu na-achọ nwereonwe Biafra."

"Anyị na-eme nke a n'udo ya mere o ji dị mma ka onye ọbụla nọrọ n'ụlọ."

"Otu Ipob chọrọ ka atọghapụ Nnamdi Kanu ozugbo."

"Ma ndị bi na Biafra nakwa ndị na-abịa abịa, dowe iwu a ma gbanahụ mmegbu ndị ọrụ nchekwa."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: