You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Abia state News today: Ihe mere anyị ji asị ka a ghara ịmanye ịnọdụ n'ụlọ maka ikpe Kanu - Gọọmentị Abịa
Dịka ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) ekwuola na ha achọghị ka ndị mmadu pụta iro n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Ọgọstụ bụ Mọnde, gọọmentị Abịa sị na ha anataghị nke a, ọkachasị ya bụrụ na ọ bụ na mmanye.
N'akwụkwọ Kọmishọna mgbasaozi na steeti ahụ bụ John Okiyi-Kalu binyere aka, gọọmentị Abịa sị na ha anaghị egbochi onye ọbụla ikpebi ịnọdụ n'ụlọ n'ụbọchị ahụ kama ha na-ado aka na ntị na ọ gaghị amasị ndị na-aga akwụkwọ nakwa ndị na-azụ ahịa, ọkachasi ugbua ndị mmadụ ka na-eme ka ha si na mkpa mkpa covid 19 pụta.
Ha sị: "Anyị na-etinye anya n'okwu metụtara onyeisi Ipob bụ nwafọ Abịa Steeti bụ onye a na-ekpe ikpe n'nỤlọikpe Ukwu dị n'Abuja iji hụ na o nwetere ikike diri ya dịka iwu Naịjirịa siri kwuo."
Ha gakwara n'ihu kwuo na ha na-agwa ndi niile na-eluwere iwu obodo isi gawa mkpa ha n'ụbọchị ahụ Ipob tinyere mmachi ngagharị, dika ha sị na nchekwa zuru oke ga-adị na steeti ahụ.
Ọ zọkwa bụ na sị na ha ahụghị uru ịsi ka ụmụakwụkwọ nọdụ n'ụlọ ga-abara onye ọbụla.
Cheta na Chika Edoziem, bụ onye Ipob kpọrọ onyeisi ngalaba "Directorate of State" (DOS), binyere aka n'akwụkwọ ma kwuo na mgbasaozi na Facebook na Ọwụwa Anyanwụ ga-abụ ebe agaghi eme ngagharị ụbọchị Mọnde niile ma ya bụrụ na gọọmentị Naịjirịa atụhapụghị Nnamdị Kanu n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Ọgọstụ."