You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Harrison Gwamnishu: Nwamadị a na 'Egbigwe' emeela udo n'etiti ha
Harrison Gwamnishu na Kingsley Orji e ji 'Egbeigwe' maara ekpeela udo n'esomokwu dị n'etiti ha.
Nke a dị n'ozi Gwamnishu wepụtara na Facebook ya ma sị na ọ gara Legọs ga zute Orji na ezinaụlọ ya bụ ebe ha nọ kpee udo.
Ọ sị na ọ dị mma iji nwaayọ hazie nghọtahie dị n'etiti mmadụ na ibe karịa ịga na soshal midia na-ekesa ya.
O kwuru na Egbeigwe ga-aga ụlọọgwụ dị n'India maka ịgwọ ọrịa ji ya dịka e si hiwe ya na mbụ.
Etu nde naịra ise si esere Harrison Gwamnishu na 'Egbeigwe' okwu
Akụkọ na-enwu ọkụ ugbua bụ esemokwu ego dị n'etiti onye na-eme ihe nkiri bụ Kingsley Orji e ji Egbeigwe na Harrison Gwamnishu bụ onye na-ahụ maka ikike dịịrị onye.
Egbeigwe boro Harrison ebubo na ọ kpachiri nde naịra ise, nke onye a kpọrọ Ibori Ubulu nyere sị ka o were gaa mba India gwọọ ihe mere ya n'ụkwụ.
Nke a malitere iwu na soshal midia dịka ọtụtụ mmadụ na-esi ka Harrison Gwamnishu nye Egbeigwe ego ahụ ebe ndị ọzọ sị ka Egbeigwe kwụsị ikwutọ aha Harrison.
Na nzaghachị, Harrison Gwamnishu pụtara n'akara Facebook ya ma kọwaa ka njem ya na Egbeigwe si gaa n'ihe banyere ego ahụ.
Ọ sị na ọ bụ eziokwu na Ubulu nyere ya nde naịra ise maka iji kpọga Egbeigwe n'ụlọọgwụ dị n'India maka ịgwọ ya.
Ọ sị na ha amalitela usoro ime ya nke gụnyere nyocha ahụ X-ray, akwụkwọ ahụike ya na-akwado ime akwụkwọ njem ya.
Harrison sị na ha chọpụtara na o nwere ego dị otu nde naịra na ụma ise e nyerela Egbeigwe bụ nke o ririla n'ime izuụka abụọ.
Na mgbe a sịrị Egbeigwe kọwaa etu ya na ego ahụ si gaa, na onweghi ike ime nke ahụ na ọ bụ ya mere o ji jụụ inye ego ọzọ n'ime nde naịra ise ahụ Ubulu sị ka e nye ya.